Alex Ekwueme: Ezinaụlọ na ndị Oko kwanyere ya ugwu taa

Ụlọụka St. John the Divine nke ndị Anglican n'Oko, Anambara steeti juputara n'ọnụ dịka ndị mmadụ pụtara ịkwanyere Alex Ekwueme ugwu otu afọ ọ lara mmụọ.
Alex Ifeanyichukwu Ekwueme onye a na-etu ide Anambra bụ onye jibu ọkwa osote onyeisiala na Naijiria.

Arch Bishop Emmanuel Olisa Chukwuma bụ onye nọ n'isi ụka ncheta ya bụ.
Nnukwu mmadụ Bishop Chukwuma dụrụ ụmụ Alex Ekwueme na ndị nwunye ya ndụmọdụ ka ha hapụ esemokwu na ịkpa one n'etiti ha ma họrọ ụdo na ihụnanya dịka nna ha Alex bụ onye udo tupu ọ laa mmụọ.
Onye ọzọ kwuru okwuchuwu na ya bụ ụka ncheta bụ Prof Israel Okoye bụ Bishop Ihiala dayọsis dụrụ ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha ṅomie ụdị ndụ Ekwueme biri.

Ọ kọwara Ekwueme dịka onye obi ume ala nke na anaghị akpa oke ma ọlị.

Ka ụka gbasara ndị mmadụ gara n'ili ekwueme ebe a nọ were kpere ya ekpere maka ezumike mkpụrụobi ya.

Nwanne Alex Ekwueme bụkwazị Igwe ndị Oko prof Laz Ekwueme kelere igwe na ụmụ gbakọrọ Ka ha si kwanyere nwanne ya ugwu.

Di ọkpara Ekwueme bụ Pastor Goodheart Ekwueme kpere ekpere ka chukwu duo ndị mmadụ bịara ya bụ mmemme ncheta otu afọ n'udo.
Ndị ezu na ụlọ Ekwueme gunyere. Ụmụ ya ndị nwoke bụ Kenechukwu Afamefuna Ekwueme na Akaolisa Ekwueme kwuru na ha mụtara ndidi, ihụnanya na ịgụsi akwụkwọ ike na-aka Nna ha.

Obi nke Onitsha bụ igwe Nnaemeka Achebe bịara ya bụ mmemme ebe onye ji ọkwa SSG n'Anambra Steeti bụ Mazi Solo.......nọchitere anya Gọvanọ Anambra Steeti.









