Ozu Alex Ekwueme anatala Naịjirịa

Ebe foto si, Ndị uweojii,
Akụkọ na-apụta kwuru na ebụnatara ozu ya n'ụtụtụ ụnyaahụ n'Abuja.
E bidoro mmemme a ga eji kwa ozu ya n'ụbọchị orie bụ abalị 19 Jenụwarị.
A ga akwanyere Ekwụeme ugwu n'ebe a na-akpọ Ọkpara Square n'Enugu ebe elekere anọ ehihie taa tupu ebula ya n'obodo ya bụ Oko na Anambara steeti.
Ekwueme nwụrụ n'ụlọọgwụ na London n'ụbọchị eke 19 Novemba 2017 afọ gara-aga.





