Mbazuluike Amechi bụbu Minista njem ụgbọelụ Naịjirịa alaala mmụọ

Mbazulike Amechi bụbu Minista njem ụgbọlelụ n'ọchịchị onye kwuo uche ya mba Naịjirịa, bụkwa onye a na-etu 'The Boy is good' anwụọla n'ụtụtụ Tuzde 01 Nọvemba 2022.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ezinaụlọ ya nke nwa ya bụ Ezeana Tagbo Amechi wepụtara sị ka ndị mmadụ tinye ha n'ekpere n'oge a.
Amechi, so na ọnụ na-ekwuru ndị Igbo, malitere ịrịa nwa obere ọrịa Kamgbe Tọzde 27 Ọktoba 2022 dịka otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo.
Onye ahụ sị na a wara Amechi ahụ maka ya bụ ọrịa mana ọ nwụrụ dịka ọ na-achọ ịgbake n'ute ọrịa.
Peter Obi, Soludo akwaala arịrị maka ọnwụ Mbazulike Amechi

Ọtụtụ ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akwaala arịrị maka ọnwụ odogwu Igbo bụ Mbazulike Amechi, onye lara mmụọ taa bụ Tuzde, ụbọchị mbụ nke ọnwa Nọvemba 2022.
Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo kwuru na ọnwụ Mbazulike Amechi emetụtaghị naanị obodo ya bụ Ukpor, "kama ọ bụ nnukwu ihe funahụrụ ndị Igbo niile nakwa obodo Naijiria.
"Ọ bụ onye nwere nnukwu mmasị maka ọdịmma obodo ya, bụrụkwa olu na-adasị ụda ike n'otu 'Zikist Movement'," Soludo depụtara n'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ya bụ Christian Aburime.
N'aka nke ọzọ, Peter Obi, bụ aka chịburu Anambra steeti, kọwara Ichie Amaechi dịka mmadụ nwere nkwuwa okwu, na-anaghị ele mmadụ anya n'ihu n'ikjwu eziokwu.
"Mbọ ọ gbara maka mwulite obodo Naịjirịa abụghị ihe a ga-echefu echefu," Peter Obi depụtara n'akara Twitter ya.
"Ọ bụ onye jiri ndụ ya lụọ ọgụ maka ịdịnotu na ọganihu nke obodo Naịjiria. Ka mkpuruobi ya zuo ike n'udo."
Onye bụ Mbazulike Amaechi?
Mbazulike Amechi bụ otu onye so gbaa mbọ maka nnwereonwe Naịjirịa n'afọ 1960.
Ọ bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa ma bụrụ ọnye mbụ jiri ọkwa ahụ n'ọchịchị nke 'first republic'.
O na-ekwukaarị na otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nwereonwe Biafra, selitere isi ugbua n'ihi iwe maka etu ha si hụ ihe na-eme n'obodo Naịjirịa.
Mgbe ikpeazụ mere njem gbasara okwu Nnamdi Kanu n'ọnwa Nọvemba 2021, mgbe ọ gara rịọ onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ hapụrụ ya Nnamdị Kanu.
Mana Onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ya bụ arịrịọ sị na ọ chọrọ ịhapụ ya bụ okwu ka ụlọikpe kpezie ya.
Mbazuluike bụ onye Ukpor Nnewi.
































