Nnamdi Kanu: A tọghapụ , ọgbaghara na-ada n'ọwụwa anyanwụ ga-ebi- Mbazuliike Amaechi

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: A tọghapụ , ọgbaghara na-ada n'ọwụwa anyanwụ ga-ebi- Mbazuliike Amaechi

"Nnamdi Kanu ịpụta, ga-enye aka ikwụsị ọgbaghara ma weta udo n'ala Igbo."

Okwu a si n'ọnụ Mbazulike Amaechi bụbụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu ma bụrụkwa onye nke so wee lụọ ọgu Biafra.

N'ọnụ ya, Nnamdi kanu pụtarana, kwuo okwu ọ ga-adị ka agbasara mmiri n'ọkụ na-enwu ugbua."

Ihe Mbazulike sara maka ntọghapụ Nnamdi Kanu

O kwuru na ndị nta akụkọ jụrụ ya ihe ọ na-eme maka Nnamdi kanu nke ọ sara na ya na ndị otu ya na-ahazi ihe gbasara ntọghapụ Kanu bụ onye ndu Indigenous People of Biafra.

O kwuru na ha na ndị otu gọọmenti etiti na-enwe nzụkọ kwụrụ nzụkọ.

Amaechi gwara BBC Igbo na mparịtaụka ekwenti na ihe ọ chọrọ bụ ka udo wee chia n'ala Igbo.

Onye bụ Mbazulike Amaechi?

Mbazulike Amechi bụ otu onye so gbaa mbọ maka nnwereonwe Naịjirịa ebe afọ 1960.

Ọ bụbụ minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa.

O na-ekwukarị na otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ ndị na-achọ nwereonwe Biafra, selitere isi ugbua n'ihi iwe maka etu ha si hụ ihe na-eme n'obodo Naịjirịa.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Akụkọ Igbo

Nwannekaenyi "Nnamdi" Kanu chọpụtara otu na-alụ ọgụ nnwereonwe ndị Igbo bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2014.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kewara ma hibe mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra steeti mana ka alụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde , atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere redio Biafra n'afọ 2009 nke e hibere na London ma na-ezipu ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

Ọ gara mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) tupu ọ gawa London.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.

Gịnị bụ Ipob?

Ndị na-achọ nnwereonwe Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Ipob pụtara 'Indigenous People of Biafra'.

Ọ bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ obodo nke aka ya.

Mana gọọmentị Naịjirịa akpọọla ha otu na-eyi ndụ egwu, ma kwuo na o megidere iwu mmadụ isonye n'otu ahụ.

Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob.