Biafra Remembrance: Gọọmentị gaara enye ndị na-achọ Biafra 'Plebiscite - Mbazulike Amechi

Aha onyonyo, Gọọmentị gaara enye ndị na-achọ Biafra 'Plebiscite - Mbazulike Amechi

Mbazulike Amechi bụ otu onye n'ime ndị so zọo nnwereonwe Naịjirịa n'afọ 1960, etinyela ọnụ n'ihe gbasara agha Biafra.

Mbazulike kwuru na ọ bụ naanị otu onye ka a na-anụ n'Ipob ugbua, mana ọ dị iche n'oge nke ha bụ mgbe ọ bụ ọtụtụ olu ka a na-anụ.

Mbazulike kwuru na ndị nke ugbua anaghị ege ndụmọdụ, mana ọ bụrụ na ndị Igbo nọ na mba kwuo ka e nye ndị Igbo 'Plebiscite' (ịtụ vootu ma a ga-apụ maọbụ agaghị apụ), na a ga-ama ma ụfọdụ a ga-atụ maọbụ agaghị atụ.