State CID Umuahia attack: Ndị omekome amụnyela ya ọkụ

Ebe ọkụ na-agba

Ebe foto si, Other

Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na ndị omekome mụnyere ụlọọrụ ndị uweojii a ma dịka 'State CID' nke dị n'Umuagu, Umuahia, Abia steeti, ọkụ.

Ndị hụrụ ka ihe mere kwuru na ndị omekome ahụ nọ na-achọ ụzọ ha ga-esi banye n'ụlọ ebe ndị uweojii na-edebe ngwaọgụ nke Bekee kpọrọ 'armoury', mana ndị uweojii gbochiri ha.

Ha kwukwara na ndị omekome a ji egbe nọ na-agbali egbe elu nke mere ka ndị mmadụ nọcha ma n'ebe a ma dịka 'isi gate' rie mbombo ọsọ maka ndụ ha.

Otu onye ọzọ hụrụ ka ihe mere kwuru na mgbọ egbe tụgburu otu nwaokorobịa na-anya keke.

Ka ọ dị ugbua, a na-achọ ịmenyụ ya bụ ọkụ, dịka ndị na-ere ahịa gbachichara ọdọahịa ha ma gbara na-ala n'ụlọ ha.

Akụkọ ka na-abịa.