Biafra Remembrance Countdown: Onye ọbụla gara mkpa ya, egela 'sit-at-home' ọbụla ntị

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT
Dịka ndị na-achọ nnwereonwe Biafra kwuru ka onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ghara ịpụta ezi n'ụbọchị Mee 30 na 31 maka emume Ncheta Biafra, ndị gọvanọ etinyela ọnụ.
Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) higharịrị ụbọchị nke ha gaa ụbọchị Monde bụ Mee 31, mana ndị ọzọ kwechiri na ọ bụ Mee 30 ka ha ga-eme emume nke ha.
N'ihi nke a, ndị gọvanọ Ebonyi steeti nakwa nke Imo steeti bụ Dave Umahi na Hope Uzodimma, ekwuola sị ndị mmadụ egela iwu 'sit-at-home' a ntị.
Ebonyi steeti:
'Ahịa niile na ebe ọgbakọ ndị ọzọ mepee, ụjọ atụla unu' - Gọọmentị Ebonyi steeti
Gọvanọ Dave Umahi kwuru sị ndị mmadụ garawa mkpa ha n'ihi na ndị nchekwa nọ na steeti ahụ ga-ahụ na udo ga-achị na steeti ahụ.
Ọ gakwara n'ihu kwuo ka ndị ahịa na ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-agbakọ mepee dịka ha si emebu n'ụbọchị Sọnde na Mọnde, n'ihi na enweghi ihe na-eme.
O kwuru na oge a gbara ohu agafeela, na enweghi onye Ebonyi ga-ekwe abụ ohu nke ugboro abụọ.
Ọ gara n'ihu kwuo "Biafra anyị chọrọ bụ inwe ego ka anyị jiri ya kpochapụ ohu ụmụnne anyị dubanyere anyị n'ime ya."
N'Imo steeti:
'Gaanụ ụka ụbọchị ụka, unu egekwala 'sit-at-home' ọbụla ntị - Gọọmentị Imo steeti'

Ebe foto si, Hope Uzodimma
Gọọmentị Imo steeti akpọkuola ndị steeti ahụ ọkachasị ndị ụka Kraịst ka ha gaa ụka ma gbachi iwu 'sit-at-home' ndị na-achọ nnwereonwe Biafra tinyere nkịtị.
Declan Emelumba bụ Kọmishọna Mgbasaozi steeti ahụ kwuru na enweghi onye nwere ikike ịkwụsị ndị mmadụ ife Chukwu maọbụ napụ ha ikike ha nwere ime okpukperechi ha nakwa nke ngagharị ha.
Emelumba kwuru na ndị mmadụ atụla egwu dịka ha na-aga mkpa ha, na ha ga-enwe ezi nchekwa.
O kwukwara na ọ bụ ihe ọjọọ na otu ọbụla ga-egbochi ndị mmadụ ife Chukwu nakwa ịchọrọ ihe ha ga-eri n'ihi 'nọrọ n'ụlọ'.
O kwuru na gọọmentị etinyela usoro nchekwa dị iche iche iji gbochie ndị ga-achọ imekpa ndị mmadụ na-agara mkpa ha ahụ, ma kwuo na gọọmentị enyela ndị nchekwa ikike igosi onye ọbụla chọrọ inye nsogbu dịka ịnagide ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ, ihe ọkụ ji ntị oke eme.
Emelumba kwuru na gọọmentị enyela ndị ji egbe na ngwaọgụ ndị ọzọ nke iwu akwadoghi ụbọchị ise iji wega ha n'ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla dị ha nso.
O kwuru na gọọmentị ga-agbaghara ndị ọbụla tụhapụrụ ngwaọgụ ha n'ime ụbọchị ise ahụ, ebe ndị na--ekweghi eme ya ga-ata ahụhụ dị n'elu ya.
N'Enugwu steeti:
'Unu egela iwu 'sit-at-home' ọbụla ntị, anyị ga-echekwa unu ọfụma - Ndị uweojii Enugwu steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwuola ka ndị mmadụ gara mkpa ha na-atụghị ụjọ ọbụla, n'ihi na ha etinyela usoro dị iche iche iji chekwa ndị mmadụ,
Ha kwuru sị ndị mmadụ egela iwu nọrọ n'ụlọ ọbụla ntị, ma dọọ onye ọbụla maọbụ otu ọbụla chọrọ ịkpalite ọgbaghara na steeti ahụ aka na ntị ka ha chefuo maka ya n'ihi na ha ga-egbochi atụmatụ ahụ.
Mohammed Ndatsu bụ kọmishọna uweojii steeti ahụ, gwara ndị nne na nna ka ha dụọ ụmụ ha na ndị ha na-elekọta anya ọdụ ka ha ghara isonye na ndị ga-akpalite ọgbaghara na steeti ahụ.










