Disability Law: Mmadụ atọ nwere ọrụsị iwu a ga-amasị

Ebe foto si, Getty Images
Ka Onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka hibe iwu ga-emegide onye ọbụla kpasara ndọọrụsị agwa ezighi ezi, anyị chọro ka unu mata uru iwu bara.
Buahri binyere aka n'iwu "2018 Discrimination Against Persons With Disabilities Bill" n'ubọchi Wenesde 23 nke ọnwa 2019.
Anyị ga-agwa unu ihe ụfọdụ dị mkpa na ya bu iwu, ma gakwa n'ihu gosi ụfọdụ ndị ometụtara.

Ihe ị kwesiri ịma maka iwu a

Ebe foto si, Getty Images
- Ụlọ ọrụ ọbụla kpasara mmadụ oke maka ọrụsị ga-akwụ nde naịra
- Onye nkiti mere megidere onye ọrụsị ga-akwụ puku narị naira, maọbụ ga mkpọrọ ọnwa isii
- Ọlọ ọrụ ọha ga-edebe ohere pacentị ise maka inye ndị ọrụsị ọrụ
- Ụlọ ọha bụ 'Public Building' na Bekee, ụgbọala, ụgbọelu, ụgbọmmiri nwere ohere afọ ise ịrụagharị ka ndị ọrụsị nwee ohere ibata
- Iwu a kwukwara na onye ọbula chọrọ ihibe ụlọ kwesiri ịhazị ụzọ ndị ọrụsị ga-esi banye tupu ha amalite
- Onye ọrụ gọọmentị binyere aka ka arụọ ụlọ enweghị ohere ndị ọrụsị ga-esi gaa ga akwụ nde naira, maọbu ga mkpọrọ afọ ise.
- Iwu adila n'ụlọ omeiwu ruo afọ iri asatọ. Ọ bu n'afọ 1999. mgbe Olusegun Obasanjo na-achị.
- Tupu Onyeisiala Buhari ebinye aka na ya, ọ gala ụlọ omeiwu ugboro anọ.

Lee ụfọdụ ndị ọrụsị BBC Igbo ma iwu a ga-amasị:
1) Obinna Anyaele
Anyaele bu onyeisi ọgbako ndị ọrụsị na Naịjirịa.
Ya na BBC Igbo mere mkparịtaụka maka ọnọdụ ya dịka onye ọrụsị na Naijirịa.
2) Doris Akonanya
Nwaada Akonanya bụ nwata akwukwọ na mahadum. Ọ naghi ekwe enweghi otu ụkwụ kwụsị ya ime ihe o kwesịrị.
3) Okwudili na Loveth Egbo
Okwudili na Loveth Egbo ekweghị ka ọrụsị ha kwụsị ha ibi ndụ ha etu o kwesiri.














