Custody battle: Ihe iwu Naijiria na nke omenala Igbo kwuru maka onye nwe nwa maọbụrụ na a kwụghị ụgwọ isi nwaanyị

Prophet Theophilus Obayan,Prophet Chibuzorna Prohet Abua

Ebe foto si, Chibuzor Abua/Facebook

Ndị ọkachamara n'Iwu Naijiria na nke omenala Igbo ekwuola na nwoke akwụghị ụgwọ isi nwaanyị abụghị ya nwe nwa ha abụọ mụrụ.

Nkwụpụta nke a na-abịa dịka ụlọikpe Majie dị n'Ondo steeti kagburu ihe jikọrọ otu ụkọchukwu bụ Prophet Theophilus Obayan na Prophetess Chibuzor Lilian Abua , onye Abia steeti, ma katọọ ụdị omenala na-anapụ nwoke mụrụ nwa ikike n'isi ụmụ ọ mụrụ.

Otu nwoke a kpọrọ Prophet Theophilus Obayan kpụpụrụ nwaanyị ya bụ Prophet Chibuzor Abua ụlọikpe maka ịlụgharị di ọzọ, gbanwee aha ụmụ ha abụọ mụrụ ka ha zawa aha dị ọhụrụ ya.

Kedụ ihe iwu Omenala Igbo kwuru?

Mana onye okenye Igbo mabụrụkwa ọkachamara n'ihe omenala bụ Nze Duruagwụ Ukaejuoha gwara BBC Igbo sị, "Enyi anaghị ekute nwa.

" Ndị Igbo sị na Onwe nwe akụ nwe nwa".

"Ọzụzụ zụchaa, onye nwe nwa akpọrọ. Onye nwe nwa bụ onye kwụrụ ụgwọ isi ya. "

"Ọ bụrụ na gị na nwaanyị biri n'ụlọ,iị meghị ihe na isi ya,ụmụ ịnụ mụrụ abụghị nke gị, ọ bụ onye kwụrụ ụgwọ isi ya."

Ukaejuoha gara n'ihu kọwaa na ọ bụrụ na nwoke a gaala hụ ndị ọgọọ ya mana o mebeghị ego, na onye ọzọ bịa ịlụ nwa ha, ndị ezinaụlọ nwaanyị ga-enye ya ohere ịkwụ ngọ kpọrọ ụmụ ya.

Ihe iwu Naijiria kwuru

Lady Justice

N'otu aka ahụ, Ọkaiwu Chukwuemeka Ezeh kwuru dịka iwu Naijiria sịrị dị na ọmasi ya buru na nwoke na nwaanyị bie rue afọ 30 na ọ bụrụ na ha mụta nwa na-alụghị alu, na ọbụghị nwoke ahụ nwe nwa maọbụrụ na ọlụlụ ha bụ nanị n'ụzọmelanala.

Mana ọ bụrụ na ha lụrụ n'ụzọ iwu Bekee, na ọ bụ nwoke nwee nwa, ọbụladi maọbụrụ na ha emeghị ihe ọbụla n'isi nke nwaanyị.

"Enwere ụdị alụmdinanwunye abụọ na Ndịda Naijiria; alumdinanwunye n'okpuru omenala na alumdi n'okpuru iwu Bekee(court marriage)."

"Ya buru ndigbo, n'ala Igbo ọ bụ®u na ịkwụghị ego isi nwaanyị ihe ndị igbo na-akpo ya 'ibiko(co-habitation, nwaa ịnụ amụrụ abụghị nke gị."

"Mana ọ bụrụ ọlụlụ gbadoro ụkwụ n'iwu Bekee, ọ ga-esi ike n'ihu=i na nwaanyị alụọla di, ọsọkwa ya bụrụ na emeghị ego n'iyi ya."

Gịnị na-ese?

Prophet Theophilus Obayan na Prophetess Chibuzor

Ebe foto si, Prophet Theophilus Obayan /Prophetess Chibuzor/Facebook

Nkọwa foto, Prophet Theophilus Obayan na Prophetess Chibuzor ebiela afọ 23 tupu ha nwee nghọtahie

Dịka Obayan si boo n'ebubo, ya na nwaanyị ya bidoro ụka 'Divine Prophectic Solution Prayer Ministry'.

Ha lụrụ onwe ha afọ 23 ma mụta ụmụ anọ,mMana nwanyị ya gbahapụrụ ya gaa lụọ onye na-arụrụ ha ọrụ n'ụlọụka ha .

Ọ gara n'ihu boo ebubo na nwaanyị ya napụrụ ya ụlọụka ha gbakọrọ aka malite, gụgharịa ya bụ ụlọụka aha(Peace of Jerusalem Ministry" ma gbanwee aha ụmụ anọ ha mụtara ka ha zawa aha di ọhụrụ ya.

Obayan, kpụpụrụ nwaanyị ụlọikpe sị ka ụlọikpe kewaa ha, ma ya ya ikike ịkpọrọ ụmụ ha.

Oge Majie jụrụ nwaanyị ihe mere o jiri gbanwee aha ụmụ ọ mụrụ nwoke kpụrụ ya ụlọikpe, o kwuru na nwoke ahụ emeghị ego n'isi ya, na dịka omenala Igbo dị na nwoke akwụghị ụgwọ n'isi nwaanyị abụghị ya nwe nwa.

Onye nwe akụ nwaanyị kpara?

Prophetess Chibuzor Abua

Ebe foto si, Prophetess Chibuzor Abua/Facebook

Nkọwa foto, Prophetess Chibuzor Abua bụ onye ndu Peace of Jerusalem Ministry, Lagos

Ukaejuoha kọwaa na ọ bụ®ụ na nwoke akwụọla ụgwọ isi nwaanyị, nwaanyị ya gbaso nwoke ọzọ ma kpaa akụ ebe ọzọ ọ gara, na ihe nile nwaanyị ahụ nwere bụ nke nwoke kwụrụ akụ n'iisi ya'.