Liberia election: George Weah na onye na-ama ya aka na-agba nhatanha dịka a na-agụkọ vootu

George Weah na Joseph Boakai

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, George Weah na-azọ ọkwa onyeisiala nke ugboro abụọ, ebe Joseph Boakai bụbu osote onyeisiala n'oge ọchịchị Ellen Johnson Sirleaf

Onyeisiala Liberia bụ George Weah na onye na-ama ya aka na ntuliaka onyeisiala nke e mere n'ụbọchị 10 nke ọnwa Ọktoba, bụ Joseph Boakai, na-agba nhatanha ugbua dịka ọ fọrọ obere ka a gụkọchaa vootu niile a tụrụ na ntuliaka ahụ.

N'ụbọchị Sọnde, ngalaba nhazi ntuliaka nke mba ahụ kwuru na ha agụọla pasentị 73 nke vootu niile a tụrụ, mana Weah nọ n'ihu ntakịrị dịka o nwetara pasentị vootu 43.8, ebe Boakai nwetara pasentị vootu 43.5.

Onyeisiala Weah na-azọ ọchịchị nke ugboro abụọ. Boakai, n'aka nke ọzọ, bụbu osote onyeisiala oge Ellen Johnson Sirleaf bụ onyeisiala. Ọ bụkwa ya gbara onye nke abụọ na ntuliaka gara aga.

Agụọla vootu si na 'polling unit' 4,295 n'ime 5,980 nke e nwere na mba ahụ. Mmadụ ga-enwetarịrị pasentị vootu 50 tupu a kpọpụta aha ya dịka onye meriri.

Otu Ecowas, bụ otu jikọrọ mba dị icheiche na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka, adọọla aka na ntị ka ndị so azọ ntuliaka a ghara iji aka ha kpọpụta onwe ha dịka ndị meriri ntuliaka ahụ, iji zeere ọgbaaghara.

Ha kpọrọ oku ka onye ọbụla n'ime ndị so azọ ọchịchị a jide ndị nkwado ha ka ha ghara ịkpa aghara, maka na onye ọbụla ndị nkwado ya kpara aghara ma mebie ihe, onye ahụ ka a ga-ejide maka ya.

Ihe ruru mmadụ nde 2.4 na Liberia pụrụ gaa ịtụ vootu n'ụbọchị 10 nke ọnwa Ọktoba, maka ọkwa onyeisiala na ndị ụlọ omeiwu, nakwa ọkara ụlọ Sineti.

Mmadụ 19 so wee zọọ ọkwa onyeisiala, tinyere George Weah. Naanị otu n'ime ndị a bụ nwaanyị.

Weah banyere n'ọkwa dịka Ellen Johnson Sirleaf, bụ nwaanyị mbụ meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala na Naịjirịa, chịchara mba ahụ ugboro abụọ n'afọ 2018.