Nigerian elections: Tigbuo-zọgbuo na mkpagbu ndị na-atụ vootu chị ọgbọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ na steeti ụfọdụ

- Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Disinformation Unit
- Ebeg o si, Lagos, Nigeria
Tigbuo-zogbuo, iyi egwu na mkpagbu bụ ihe so ntuliaka ọkwa Gọvanọ na ụlọomeiwu steeti n'ọtụtụ steeti e mere ntuliaka na Satọdee a.
Steeti 28 n'ime steeti 36 e nwere na Naijiria n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023 bụ steeti ndị mere ya bụ ntuliaka.
E hibeburu ntuliaka ahụ n'abalị 11 nke ọnwa Maachị afọ 2023 mana e yigharịrị ya dịka ndị pati anọghị nọ ọchịchị gbaghara mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala nke e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023.
Ntuliaka nke a malitere n'oge n'ọtụtụ ebe, ọ dịghị ka ntuliaka onyeisiala nke na-amaliteghị n'oge n'ebe ụfọdụ rue oge o kwesịrị ka ntuliaka bie.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Mkposa atụmvootu na mkpagbu ndị pụtara ịtụ vootu

Na Kano dị n'etiti Ugwu Naijiria, onye ntaakụkọ BBC hụrụ ka ndị agboro ndọrọndọrọ ọchịchị wakporo ọgbọ atụmvootu.
N'otu steeti ahụ, ndị uweojii nwụchiri onyeisi ụlọrọụ ụgbọala nke steeti ahụ maka ebubo na o du ndị agboro wakporo otu ọgbọ atụmvootu bịa kụsaa ntuliaka.
Ndị uweojii nwụchikwara ọtụtụ ndị ọzọ a sị chọrọ ikposa atụmvootu.
Na Pọtakọt, isiobodo Rivas steeti, onye ntaakụkọ BBC ọzọ setara ihe onyonyo ebe a wakpochara ọdọ atụmvootu ma gbaa ụfọdụ akwụkwọ vootu ọkụ.
Ndị nọ ebe ihe a mere gwara onye ntaakụkọ BBC ahụ na ọ bụ ndị agboro na-akwado pati nọ n'ọchịchị na steeti ahụ bụ Peoples Democratic Party (PDP), sunyere ọkụ ahụ.
Otu onye so na ndị enweghị ohere tuo vootu kwuru sị “Aṅụọla m iyi na m agaghị atụ vootu ọzọ."
Onye ọzọ sịrị, “Anyị gburu oge anyị ịpụta tụọ vootu."
Onye ọzọ sịkwa na ndị agboro ahụ họọrọ vootu ndị a tụrụ PDP tupu ha esunye ndị ọzọ ọkụ mana BBC enweghị ike ịmata kpọmkwem ma nke a abụ eziokwu.
Ozọkwa na Rivas steeti, e gburu otu nwoke a sị bụ onye APC na-achịkọta achụmtavootu pati ha n'okpuru Ọchịchị Ahoada-West n'ụbọchị ntuliaka.

Dịka pati ha si kwuo, e gburu nwoke ahụ dịka ọ na-agbalị igbochi ndị ji ngwaọgụ bịa iburu akọrọngwa e ji eme ntuliaka.
Ụlọọrụ na-agba mbọ maka ikike dịrị onye ndị mmadụ bụ 'Centre for Democracy and Development' so lee ka ntuliaka si gaa na mpaghara dị iche iche na Naijiria kwuru na e nwere mkpachi ndị chọrọ itụ vootu na Bayelsa, Enugwu, Jigawa, Sokoto na Legọs steeti.

Ndị ntaakụkọ BBC n'Enugwu na Abia steeti hụkwara ka ndị agboro wakporo ọgbọ atụmvootu ụfọdụ.
N'Abia Steeti, ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) kwuru na ndị agboro wakporo ebe nchịkọta vootu n'Ụmuahia.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
'Ha chọrọ iweghara ala anyị'

Ebe foto si, Musiliu Akinsanya/Facebook
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mmaja, iyi egwu na mkpagbu ndị chọrọ itu vootu bụ okwu a kpụ n'ọnụ na Legọs tupu e mee ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu steeti ahụ dịka e nwere ya bụ nsogbu oge e mere ntuliaka ọkwa onyeisiala.
Ihe onyonyo ebe onye ndu otu ọrụ njem na-arụrụ pati nọ n'ọchịchị bụ APC na-agwa ndị achọghị ịtụrụ pati ahụ vootu ka ha 'nọrọ n'ụlọ' fegharịrị na soshal midia nke ukwu.
Nwoke ahụ bụ Musiliu Akinsanya, a ma ama dịka 'Mc Oluomo' mechara pụta kwuo na ihe ahụ o kwuru n'ozi o zipụrụ n'ọbaozi 'Instagram' bụ "njakịrị".
Ndị mmadụ kpọrọ oku ka a nwụchie Akinsanya, mana Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Idowu Owohunwa, gwara ụlọ ntaakụkọ 'Channels TV', ka e were okwu Akinsanya dịka "njakịrị" ma sị na ha na-enyocha ya.
Akụkọ iyi egwu na mkpagbu ndị chọrọ itu vootu si dị nnukwu pụtara ihe n'ụbọchị ntuliaka nke Satọdee dịka ọtụtụ ihe onyonyo gbara na soshal midia gosiri ndị a na-eche bụ ndị na-akwado otu APC ka ha nọ na-agwa ndị mmadụ ndị achọghị ịtụrụ pati ha vootu ka ha 'lawa be ha'.
BBC nyochara ụfọdụ ihe onyonyo ndị ahụ, were chọpụta na otu n'ime ha mere n'akụkụ Mafoluku, dị na mpaghara Oshodi, Legọs.

N'ihe onyonyo ahụ nke nchọpụta BBC gosiri na e sere n'abalị 18 nke ọnwa Maachị afọ 2023 a, gosiri ka ụmụnwoke na-ekwu, 'onye achọghị ịtụrụ APC vootu lawa n'ụlọ ya'. E nwekwara ọtụtụ ihe onyonyo yiri nke a ndị bi na mpaghara Legọs dị iche iche setere ma kesaa.
BBC nyochakwara ihe onyonyo gosiri ebe ọgbaghara dapụtara ka ndị chọrọ itụ vootu na ndị agboro bịara ikposa atụmvootu na Star Times Estate dị na Legọs zụkọrọ. Ihe onyonyo ahụ gosiri ndị bi na mpaghara ahụ ka ha ji nkịta achụ ndị agboro wakporo ndị mmadụ nọ n'ọgbọ atụmvootu na mpaghara ahụ ọsọ.
Na Legọs, ndị ntaakụkọ BBC hụkwara ka ndị agboro wakporo ụfọdụ ọgbọ atụmvootu, buru igwe vootu, kposaa atụmvootu n'ebe ụfọdụ na mpaghara Lekki, Legọs.
Ihe onyonyo dị na soshal midia nke BBC nyochakwara na ọ bụ ụbọchi ntuliaka ka e zipụrụ ha gosiri na ọ bụghị ihe ndanye.
Onye ntaakụkọ BBC gara ọrụ iweeta akụkọ na mpaghara 'Victoria Garden City' (VGC) dị na Legọs, bụ ebe e higharịrị ntuliaka gaa 19 Maachi n'ihi nghọtahie banyere ebe ọgbọ atụmbvootu kwuru na ndị ọrụ nchekwa gbochiri ọgbaghara chọrọ ịdapụta n'etiti ndị na-akwado otu Lapour Party na ogbo ha nke ndị APC ebe ahụ.
Bayo Onanuga, bụbu onyeisi ụlọọrụ jịkọrọ ndị ntaakụkọ 'News Agency of Nigeria' ma buru onyeisi mgbasaozi nke otu achụmntavootu Tinubu/Shettima kwuru n'ozi o wepụtara n'akara Twitter n'abalị 18 nke ọnwa Maachị, 2023 "Nke a ga-abụ ikpeazụ ndị Igbo ga-etinye ọnụ na ndọrọndọọ ọchịchị Legọs", ozi kpasuru ọtụtụ nke mere ọtụtụ jiri kpọọ oku ka ụlọọrụ Twitter wepụ ozi ahụ.
O tinyekwara foto Peter Obi zọọrọ Labour Party ọkwa onyeisiala n'ozi ahụ o wepụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ozi ya ahụ na-egosi n'ụzọ pụrụiche ihe ọtụtụ ndị na-ekwu okwu na soshal midia kwuburu nke bụ na ọ bụ nkwado ndị nwere agba bụ ihe gbara ndị agboro ume n'atụmatụ ịkpachị ndị chọrọ itụ vootu n'ebe e nwere nnukwu ọnụọgụgụ ndị Igbo.
Cheta na Peter Obi zọọrọ otu 'Labour Party' (LP) ọkwa onyeisiala na ntuliaka ọkwa onyeisiala a gara aga bụ onye Igbo.
Labour Party meriri pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) na Legọs na ntuliaka onyeisiala, onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha pati ahụ bụ Gbadebo Rhodes-Vivour bụ onye a na-eche na o nweburu ike imeri na steeti ahụ mechara bụrụ onye gọvanọ nọ n'oche bụ Babajide Sanwo-Olu meriri.








