Mc Oluomo outburst: Njakịrị ka ọ na-ama - Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria

Muyiwa Adejobi na Musiliu Akinsanya

Ebe foto si, BBC/Musiliu Akinsanya

Ndị uweojii Naijiria ekwuola na ha hụrụ ihe onyonyo nke onyeisioche ngalaba 'Lagos state Parks Management' bụ Musiliu Akinsanya a ma ama dịka MC Oluomo na-eyija ndị Igbo bi na Legọs dịka ‘njakịrị”.

Muyiwa Adejobi,onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọntakụkọ 'Channels TV', sịrị, “MC Oluomo apụtala kwụọ na ọ bụ njakịrị. Ka anyị wee ya na ọ bụ njakịrị.”

“Ya bụ ọ bụghị eziokwu, njakịrị ka ọ na-ama.”

“Ọzọ, ndị uweojii nke Legọs steeti ekwuola na ha na-enyocha ya bụ ihe onyonyo ndị ọzọ pụtarala.”

Ọ gara n'ihu rụtụ aka na egwu adịghị dịka Naijiria na-agbaso usoro atumvootu nzuzo(secret ballot).

Atiku: Ọ jọgburu onwe ya na ndị isi ọchịchị na ndị ọrụ nchekwa gbara nkịtị

Atiku Abubakar, MC Oluomo

Ebe foto si, Atiku Abubakar, MC Oluomo/Facebook

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n’aha otu PDP bụ Atiku Abubakar akatọọla,ihe ọ kpọrọ nyija ndị si agbụrụ ọzọ ịpụta tụọrọ vootu na Legọs.

Nkatọ a na-eso ihe onyonyo ebe onyeisioche ngalaba 'Lagos state Parks Management' bụ Musiliu Akinsanya a ma ama dịka MC Oluom na-eyija ndị Igbo sị onye Igbo agaghị atụnyere APC vootu nọrọ be ya.

Atiku, onye kwuru na ya bụ ihe onyonyo "na-asọ oyi" sịrị, "Ahụrụ m ya dịka ihe jọgburu onwe ya na ndị ndọrọndọo ọchịchị ga ji ehihie mụ anya ekwu okwu megidere otu agbụrụ iji yigaa ha ka ha ghara ịpụta tuo vootu."

" Ọ jọgburu onwe ya na ndị isi ọchịchị na ndị nchekea gbara nkịtị."

MC Oluomo: 'I mara na ị gaghị atụrụ APC, nọrọ be gị'

Mc Olomo bụ onye a ma ama na Legọs steeti dịka ọ rụbụrụ ọrụ dịka onye nlekọta ndị ọrụ njem ụgbọala na steeti ahụ.

Ebe foto si, Mc Olomo/Facebook

Nkọwa foto, Mc Olomo bụ onye a ma ama na Legọs steeti dịka ọ rụbụrụ ọrụ dịka onye nlekọta ndị ọrụ njem ụgbọala na steeti ahụ.

Otu ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ebe onye ọrụ gọọmentị Legọs steeti aha ya bụ Musiliu Akinsanya maọbụ MC Oluomo na-amaja ndị Igbo.

Akinsanya bụ onyeisioche ngalaba 'Lagos state Parks Management' kwuru hoo haa n'ime onyonyo ahụ sị "Ọ bụrụ na ha atụghịri anyị, ọ bụghị ọgụ, ọ bụghị mgba, gaa gwa Mama Chukwudi ya nọrọkwa n'ụlọ".

MC Oluomo gara n'ihu kwukwa na "ọ bụrụ na ịhụ na egwu adagharịala, ịkụgharịa ya ka ọ daba

Musiliu Akinsanya a ma dịka MC Oluomo

Ebe foto si, Musiliu Akinsanya/Facebook

Nkọwa foto, Musiliu Akinsanya a ma dịka MC Oluomo bụ onyeisioche 'Lagos state Parks Management'

Ndị mmadụ malitere ịkatọ ya bụ ihe onyonyo na soshal midia na-ebo gọọmentị Legọs steeti ebubo ịkwado ọgbaghara na agwa ọjọọ a na-emegide ndị Igbo.

BBC Igbo gbara mbọ kemgbe ụtụtụ ụbọchị Fraịde ịnụ olu gọọmentị Legọs steeti gbasara agwa a onye ọrụ ha kpara mana o nwebeghi ihe ha kwuru.

Anyị lekwara akara soshal midia ha niile ịhụ ma ha ezipụtala ozi gbasara okwu a mana o nweghi ozi ọhụrụ ha tinyere metụtara okwu a kpụ ọkụ.

N'otu okwu ahụ kwa, mbọ niile onye BBC gbara ịnụ olu ndị uweojii ma na Legọs steeti ma n'isiụlọorụ ha dị n'Abuja, o nweghi nke mịtara mkpụrụ dịka ha azaghị ekwentị ha.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Skip X post, 3

End of X post, 3

Anyị bụ ndị Igbo na-asọpụrụ mmadụ mana anyị adịghị atụ ụjọ- Ohaneze Ndigbo

Alex Ogbonna

Ebe foto si, Alex Ogbonna

Ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia kwuru na okwu a MC Oluomo kwuru bụ ihe jọgburu onwe ya.

Ọ gwara BBC Igbo nke a na mkparịtaụka e nwere n'ekwentị ma jiri ohere ahụ kpọọ oku ka ndị mmadụ pụta tuo vootu.

Ogbonna sị "anyị bụ ndị Igbo na-asọpụrụ mmadụ mana anyị adịghị atụ ụjọ"

"A na m agwa ụmụ Igbo, onye ọbụla pụta gaa tụọ vootu, o nweghi ihe ga-eme" ka o kwukwara.

N'akụkọ yiri ya, ndị amaghị ama wakporo ndị otu Labour Party n'ụbọchị Tọzde na Legọs dịka ha na-akwado ịga achụmnta vootu.

Ndị gabigara ihe ahụ kwuru na ndị omekome napụrụ ha ekwentị ma sụọ otu onye mma na ya bụ mwakpo.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 4

Dịka ọ dị ugbua. Desmond Elliot na-azọ ọkwa ịnochị anya Surulere n'ụlọomeiwu Legọs steeti apụtala katọọ ya bụ mwakpo awakporo ndị otu LP.

Ọ gwakwara ndị steeti Legọs ha nọrọ n'udo dịka a na-akwado ịbanye oge ntuliaka ọkwa Gọvanọ na ụlọomeiwu steeti na-abịa.

Ndị uweojii Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ndị uweojii kwuru

Ndị uweojii Legọs mechara zipụta ozi n'ụbọchị 17 nke ọnwa Maachị, dọọ ọha aka na ntị banyere ikesa ozi ịkpaoke agbụrụ. Ha kwukwara na ha amalitela iyocha ihe onyonyo ndị na-apụta bụ nke ndị na-amaja ndị chọrọ ịpụta tụọ vootu.

Ozi ha kwukwara na ha adịịla njikere izute ndị ọbụla maọbụ onye ọbụla ga-amaja ndị pụtara ịtụ vootu maọbụ nwere atụmatụ iwakpo ha.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 5