Etu ndị nchekwa na-eso El Rufai siri gbuo ndị otu anyị mmadụ isii - Ndị Shiites

Ebe foto si, Islamic Movement of Nigeria
Otu ndị Alakụba eji 'Shiites' mara ekwuola na ndị nchekwa na-eso gọvanọ Kaduna Steeti bụ El Rufai egbuola ndị otu ha mmadụ isii na enweghị ihe ha mere ha.
Ndị uweojii steeti ahụ gwara BBC na ọdachi ahụ mere n'ezie.
Mana ọnụ na-ekwuru ha ekweghị enye nkọwa ọbụla dịka ọ sịrị anyị chere oge ha ga-ewepụta akwụkwọ mgbasaozi ha n'okwu ahụ.

Ebe foto si, Islamic Movement of Nigeria
Onye odeakwụkwọ ngalaba na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'otu Shitte (Academic Forum) bụ Abdullahi Musa, gwara BBC Igbo sị,
Ọ gara n'ihu kwuo sị, "Unyahụ bụ Tọzde, ụbochị 16 nke ọnwa Maachị afọ 2023 n'ihe dịka elekere ise nke mgbede, ndị otu anyị nọ n'okporoụzọ Nnamdi Azikiwe eme ngaghariwe ka ahapụ akwụkwọ njem onyeisi anyị na nwunye ya."
"N' atụghịanya, ụgbọala ndị so gọvanọ Kaduna steeti zutere ha, ha bidoro igba ha ikuku ose ma mechaa gbawa ha egbe ma gbuo mmadụ ise ebe ndị ọzọ merụrụ ahụ, mmadụ asaa ọzọ merụrụ ahụ ebe ọ dị njọ maka mgbọ egbe gbatara ha".

Ebe foto si, Islamic Movement of Nigeria
Abdullahi gara n'ihu kwuo sị, "N'ihe dịka elekere 7:30 nke abalị ka ndị uweojii bịara n'ebe a na-echekwa ozo ndị a, gbawa kwa egbe ọzọ ma gbuo otu onye nke mere ya mmadụ 6 ha kwuru".
Ndị nsonso Sheik kpebiri ịpụta n'ụzọ Abuja, Kaduna, Sokoto, Bauchi na steeti ndị ọzọ mee ngaghariiwe maka nke a.
Abdullahi kwuru sị, "Ha niile gara nke ọma, ọ bụ naanị nke Kaduna nwere nsogbu".
Cheta na Ụlọikpe Ukwunke Kaduna tọhapụrụ onyeisi anyị bụ Sheikh Ibraheem El-Zakzaky na nwunye ya bụ Zeenah n'ụbọchị 28 nke ọnwa Julaị afọ 2021 mana gọọmentị jichiri akwụkwọ njem ha.
Kemgbe ahụ, ndị otu Shiites kpebiri na-eme ngaghariiwe maka akwụkwọ njem a gọọmentị jichiri".












