Ogidi youth protest: Etu ọnwụ nwokorobia ndị ọrụ nchekwa gbagburu si kpalite ngaghariiwe n'Anambra

Ebe foto si, screengrab
Ndị uweojii Anambara steeti ekwuola na ha anwuchiela onye nche a sị gbagburu otu nwokorobia oge ha na-achụ onye omekome n'Ogidi Anambra steeti.
Ndị ọrụ nche gbagburu Nonso Okeanị, gbara afọ 30 n'ụlọ ya dịka ha na-achụ onye omekome ọsọ.
Ndị ntorobia Ogidi mere ngaghariiwe ụbọchị Tọzde iji kpoo oku ikpenkwụmọtọ na mgbagbu a gbagburu onye otu ha n'obodo ahụ.
Ha bu ozu nwamadi ahụ mee ngaghariiwe gaa n'isi ụlọọrụ Okpuru Ọchịchị Idemili-North bụ ebe ha kwuchie ụzọ iji gosi iwe ha.
Ndị ọrụ nchekwa okpuru ọchịchị gbagburu otu nwokorobia a kpọrọ n'Ogidi, Anambara steeti, dịka ndị uweojii Anambara steeti siri kwuo.
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na nke a mere dịka ndị ọrụ nchekwa na-achụ onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye otu nzuzo e nyere aha ya dịka 'China" ọsọ, ọ gbaba n'ụlọ ebe nwokorobia ahụ bi ka ya bụ ọdachi mere.
Ha kwuru na nwa amadi ahụ nwụrụ lọtara na-akwado ịga ịhụ nwunye ya mụrụ nwa ọhụrụ n'ụlọọgwụ oge ndị nche ahụ wụrụ mgbọ, ọ tụọ ya.
Dịka ụfọdụ na-ebo ndị nche na ọ bụ ha kpatrara mkpamkpa ahụ, ụfọdụ na-ebo ndị uweojii nzuzo Naijiriaa na-akpọ DSS n'ịchafụ so na ndị nche na-arụ ọrụ ebubo na ọ bụ ha gburu nwa amadi ahụ.
Onyeisi otu jikọrọ ndị Ogidi bụ Ichie Jideofor Onubogu gwara BBC Igbo sị,
"Nwa be anyị a na-akpọ 'China' Ikenze jere ohi ndị nche na-achọ ya."
"Onye ha gbagbuziri bụ onye enweghị ihe o mere."
"Ọ bụ nwatakịrị nwunye ya dị ime ime na-eme, ọ lọta n'abalị ahụ lọta ka ọnwadoro ya, ọ pụta n'ezi ka ọ nyụọ mammiri, onye nche na-eche nche n'Local Government', gbagbuo ya.
"Ndị agbataobi nụrụ ya, nụzịe gbapụta jide onye gbara egbe ahụ."

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ Tony Ikenga, onye kwetara na ọdachi ahụ mere n'ezie, kwuru na ọ bụghị ndị DSS gburu nwa amadi ahụ, dịka ụfọdụ akwụkwọ akụkọ si kwuo.
Ọ sịrị, "Ọ bụ otu n'ime ndị ọrụ nche ogbe ahụ gbagburu onye nwụrụ."
"Ka ndị uweojii nwetara ozi, ndị ọrụ anyị gbara gaa ebe ahụ nwuchie onye gbara egbe ahụ bụ onye e nwetara egbe n'aka ya."
"A napụrụ ya egbe,gbaa ya ajụjụ dịka nnyocha ya bụ okwu maliterela."











