O nweela ihe gọọmentị mere ndị wakporo mmadụ maka agbụrụ ha n'oge ntuliaka na Legọs?

N'akụkụ Igbokusu dị na Lekki ebe ndị omekome chụrụ ndị mmadụ ọsọ ma ghasaa ngwa ntuliaka na Legọs, 25 Febụwarị 2023
Nkọwa foto, N'akụkụ Igbokusu dị na Lekki ebe ndị omekome chụrụ ndị mmadụ ọsọ ma ghasaa ngwa ntuliaka na Legọs, 25 Febụwarị 2023
    • Onye dere ya, Jessica Nwankwo & Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News Igbo, Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
bbc

N'ụbọchị 27 nke ọnwa Febụwarị bụ abalị abụo emechara ntuliaka ọkwa onyeisiala na Naijirịa, ụfọdụ ndị amaghị ndị ha bụ nwara ịwakpo ndị Igbo na-azụ ahịa n'ahịa Mandilas dị na Legọs.

Otu onye na-ere ahịa ebe ahụ gwara BBC na ha niile nọ n'ime ọdọ ahịa ha mgbe ụfọdụ ndị omekome ji osisi na mma malitere ịchụ ndị mmadụ ọsọ.

"Anyị malitere ịgba ọsọ ma kpọchie ọdọ ahịa anyị mana o teghi aka ndị uweojii na ndị agha abịa ebe ahụ nke mere ka ndị ahụ gbapụ ọsọ" ka o kwukwara.

Nke a bịara dịka akpọpụtara aha Peter Obi dịka onye meriri Legọs dịka otu steeti na ntuliaka ọkwa onyeisiala.

bbc

Gịnị ka ndị ọrụ nchekwa nakwa gọọmentị na-eme?

Benjamin Hundeyin bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs steeti

Ebe foto si, Benjamin Hundeyin/Twitter

Nkọwa foto, Benjamin Hundeyin na-ekwuchitere ndị uweojii nke Legọs steeti.

Mana ndị uweojii na Legọs kwuru na ọ bụ akụkọ ụgha na awakporo ọdọ ahịa dị ịcheiche ebe ndị Igbo na-azụ ahịa.

Ọnụ na-ekwuru ha na steeti ahụ bụ Benjamin Hundeyin gwara BBC na "ọ bụ naanị na Mandilas ka e nwere obere nsogbu mana ndị nchekwa ruru ebe ahụ n'oge ma gbochie ọgbaghara ịdapụta".

Dịka abalị ole na ole gachara nke a mere, akụko pụtara ihe na ọkụ gbara ahịa Akere dị na Ajegunle ebe ndị Igbo na-azụkarị ahịa.

Ndị uweojii nakwa ndị ọrụ mmenyụọkụ kwetara na ha na-enyocha ya dịka ihe "edoghi anya" nakwa na o nwereike ịbụ "ọkụ mmadụ mụnyere".

Ọkụ a gbara n'ụbọchị Maachị 8 dịka ọ fọrọ naanị abalị atọ tupu a tụọ vootu nke ọkwa Gọvanọ tupu ngalaba INEC ehigharịa ya.

Gọvanọ Legọs steeti bu Babajide Sanwo-Olu gara leta ndị ọkụ ahụ metụtara ọdọ ahịa ha ma kwe ha nkwa ịnyocha ihe mere rue na isi njedebe ya.

Ndị ahịa ahụ n'onwe ha na-ekwusi ike na ha cheere na ọ bụ okwu ndọrọndọrọ ọchịchị mere e ji gbaa ụlọahịa ha ọkụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Mgbe ndị agha wụchiri n'ogige ahịa Lagos Island iji gbochie ọgbaghara ịdapụta ebe ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mgbe ndị agha wụchiri n'ogige ahịa Lagos Island iji gbochie ọgbaghara ịdapụta ebe ahụ.
bbc
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
Ihe onyonyo gosiri ebe otu onye na-amaja ndị mmadụ na ha tụọrọ APC maọbụ ha apụọ n'ọgbọ ntuliaka ahụ.

Ebe foto si, Screenshot/Other

Nkọwa foto, Ihe onyonyo gosiri ebe otu onye na-amaja ndị mmadụ na ha tụọrọ APC maọbụ ha apụọ n'ọgbọ ntuliaka ahụ.

Iji ma atụ, n'ụbọchị ntuliaka bụ Febụwarị 25, ihe onyonyo malitere ifegharị ebe otu nwoke na-amaja ndị bịara ịtụ vootu.

Ọ sị "Ka m kwuo ya ọzọ, o nwee onye Igbo ọbụla chọrọ ịnwa onwe ya, bịa tụọ vootu ebe m ka kwụ ebe a"

N'ihe onyonyo ọzọ, nwoke ọzọ na-ekwu "ebe a bụ mpaghara APC. Ọ bụrụ na ị gaghị a tụrụ APC laghachi n'ụlọ gị, o nweghi onye sị gị pụta".

Ngalaba Disinformation nke BBC enweghi ike chọpụta ebe ọ bụ kpọm kwem esetere ihe onyonyo ndị ahụ mana ha chọpụtara na o nweghi ebe ọzọ onyonyo ahụ dị .

Gbenga Omotosho

Ebe foto si, Followlasg/Twitter

Nkọwa foto, Gbenga Omotosho bụ Kọmịshọna mgbasaozi nakwa atụmatụ na Legọs steeti.

Kọmịshọna mgbasaozi na atụmatụ na Legọs steeti bụ Gbenga Omotosho tinyere ọnụ n'okwu a.

O kwenyere na mmaja ndị ahụ dị n'ime onyonyo na-efegharị bụ eziokwu ma kwuo na ndị uweojii anwụchiela nwoke ahụ na-amaja ndị mmadụ.

O kwukwara na nwoke ahụ abụghị onye ndị mmadụ cheere na ọ bụ dịka esi ekwu na soshal midia.

Ihe ọzọ o kwuru bụ na gọọmentị Legọs steeti na-akatọ mmegbu nakwa ịkpasa agbụrụ ọbụla agwa ọjọọ mgbe niile.

Dịka o si kwuo, o rubeghi ịma ma ọ bụ okwu agbụrụ bụ ihe kpatara ọkụ gbara na ahịa Akere n'ihi na nyocha mbụ na-ekwu na ikekwa ọ bụ na e nwere ebe adọbara mmanụ agbịdị ụgbọala n'ime ahịa ahụ.

"Gọvanọ Sanwo-Olu na-ezute ndị isi ahịa nakwa otu dị icheiche n'ahịa ebe ndị Igbo juru... mmekọ dị n'etiti ndị ahịa na gọọmentị Legọs steeti dị na mma"

"Nke a mere ka ndị mmadụ ghara inye onwe ha nsogbu ugbua" ka Omotosho kwuru.

bbc

Ọ bụ mbụ a na-amaja agbụrụ ọzọ na Legọs n'oge ntuliaka?

Oba Rilwan Akiolu, Eleko nke Eko bụ Oba Legọs steeti.

Ebe foto si, Oba Rilwan Akiolu/Facebook

Nkọwa foto, Oba Rilwan Akiolu, Eleko nke Eko bụ Oba Legọs steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Hundeyin na-ekwuru ndị uweojii kọwara na anwụchiri ọtụtụ mmadụ maka ịmaja ndị bịara itụ vootu.

N'agbanyeghi nke a, ndị mmadụ ka na-ekwu na soshal midia na gọọmentị Legọs steeti emezubeghi ihe ha kwesiri ịhụ na akwụsịrị mwakpo na mmaja a kpam kpam.

Iji ma atụ, n'afọ 2015, Oba na-achị Legọs bụ Rilwan Akiolu pụtara n'ime ihe onyonyo wuru ewu mgbe ahụ na-amaja ndị Igbo n'otu nzụkọ ya na ha nwere na onye ọbụla atụnyeghịri onye nke ọ (Oba) na-akwado, na "a ga-atụnye onye ahụ n'ime Lagoon (mmiri)".

Onye ahụ ọ na-akwado bụ Akinwunmi Ambode mechara merie ntuliaka dịka Gọvanọ Legọs mgbe ahụ.

Ọzọ, n'afọ 2019, ụlọ ntaakụkọ The PM News nakwa ThisDay Newspaper buru akụkọ gosiri na ndị omekome kposara ntụliaka n'ebe akpọrọ Okota dị na Legọs ma mechaa malite ịwakpo ụlọahịa ndị Igbo n'ọtụtụ ebe dị na Legọs ma na-ebo ha ebubo akwadoghi ndị ha bu n'uche.

Hundeyin kwukwara ọzọ na n'agbanyeghị na ha bụ ndị uweojii na-anwa ike ha niile ịhụ na ha gbochiri mmaja na mwakpo na-esokarị ntụliaka apụta, ọ kachasị nsogbu agbụrụ, na "ị gaghị ewepụnwu ya kpam kpam mana o nwereike ịbelata".

"O zughi oke ikwu na o mere na 2019, o mere na 2023...gịnị meziri o ji eme ọzọ? O nwereike bụrụ na n'afọ anọ ọzọ e mebe ntụliaka, nsogbu ndị a ka ga-adị ya" ka Hundeyin kwukwara.

Dịka ihe si kwụrụ ugbua, onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba agwaala kọmịshọna ndị uweojii dị icheiche ha mechie okwu nsogbu ntuliaka niile ha ji ma nyefee ya n'aka ngalaba Inec ka ha were kpụpụ ndị ahụ ụlọikpe.