Ihe ndị ahịa ha gbara ọkụ n'Ajegunle gwara BBC Igbo
Ihe ndị ahịa ha gbara ọkụ n'Ajegunle gwara BBC Igbo

Ọkụ gbara ahịa ebe a na-ere akụkụ ụgbọala nke dị n'Ajegunle dị na mpaghara Olodi Apapa nke Legọs steeti n'isi ụtụtụ Wenezde.
Ọtụtụ ngwa ahịa ndị mmadụ nọ ebe ahụ gbara ọkụ, dịka akụkọ na-ekwu na ọ bụ n'elekere atọ nke isi ụtụtụ ka ya bụ ọkụ bidoro ịgba.
Ndị ahịa nọ ebe ahụ ji ọnụ ha kọọrọ BBC Igbo ihe ha ma maka ya bụ ọkụ na etu o siri metụta ha.
N'aka nke ọzọ ka Gọvanọ Legọs steeti bịara n'ogige ya bụ ihe mere ma tie ha aka n'obi, O ji kwa ohere a gwa ndị mmadụ ka ha hara iji ya rite uru ndọrọndọrọ ọchịchị.
Kirie ihe ha gwara BBC Igbo n'uju



