Simeon Okezuo Nwobi: Onye bụ ụkọchukwu a Pope họpụtara dịka Bishọp Ahiara Diocese?

Ebe foto si, Simeon Nwobi
Onye isi ụka Katọlik bụ Pope Francis ahọpụtala ụkọchukwu aha ya bụ Simeon Okezuo Nwobi, ka ọ bụrụ 'Auxilliary' Bishọp ga na-elekọta Ahiara dayọsis nke dị na mpaghara Mbaise, Imo Steeti, Naịjirịa.
Ụkọchukwu Nwobi bụ onye obodo Eziama Oparanadim Ekwereazu dị na Mbaise.
Ọ bụ n'ụbọchị Satọde, 14 Ọkutoba 2023 ka ngalaba mgbasaozi nke Vatican wepụtara akwụkwọ ozi gbasara nke a.
Cheta na dayọsis Ahiara enwebeghị Bishọp kamgbe afọ 2012 dịka ndị mpaghara ahụ jụrụ ịnabata Bishọp Peter Okpaleke bụ onye Pope nyere ha. Ha kwuru na ha agaghị anabata bishọp ọbụla na-esighi na mpaghara dayọsis ahụ.
Ihe ị kwesịrị ịma maka Simeon Okezuo Nwobi
- A mụrụ ụkọchukwu a n'ụbọchị 25 nke ọnwa Maachị afọ 1960
- Ọ bụ onye Mbaise - Eziama Oparanadim Ekwereazu
- E chiri ya ụkọchukwu n'ụbọchị 21 nke ọnwa Julaị afọ 1990, n'otu 'Congregation of Missionaries Sons of the Immaculate Heart of Mary' (Claretians)
- Ọ gụrụ akwụkwọ na ụlọ ọzụzụ ndị ụkọchukwu Katọlik bụ Bigard Memorial Seminary n'Enugwu, Mahadum Sayensị na Tekịnụzụ nke Enugwu, Pontifical Gregorian University, Rome, na 'National Open University' nke Naịjirịa.
- Ọ bụkwara ọka mmụta na Biard Memorial Seminary bido n'afọ 2000 ruo 2009
- Ọ bụ ya bụ onyeisi otu Congregation of Missionaries Sons of the Immaculate Heart of Mary na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Gịnị mere Ahiara enwebeghị Bishọp ruo ugbua?

Ebe foto si, Catholic Diocese of Ekwulobia
E hibere Ahiara dayọsis n'ọnwa Nọvemba 1987. Bishọp mbụ lekọtara mpaghara ahụ bụ Victor Adibe Chikwe, onye mechara nwụọ n'ọnwa Sepụtemba afọ 2010 ka ọ dị afọ 72.
Ka Bishọp Chikwe nwụchara, onyeisi ụka Katọlik n'oge ahụ bụ Pope Benedict XVI họpụtara bishọp ọhụrụ aha ya bụ Peter Ebere Okpaleke ka ọ bụrụ onye nlekọta dayọsis Ahiara, mana ndị katọlik na mpaghara ahụ ekweghị anabata ya n'ihi na o sighị na mpaghara Mbaise, kama ọ si na steeti ọzọ na-abụghị Imo.
Ọtụtụ ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị bụ ndị ụka Katọlik n'Ahiara malitere ime ngagharịiwe, ụfọdụ kwuo na onweghị ihe ga-eme ka ha nabata bishọp e si ebe ọzọ zitere ha, na-abụghị onye a ga-ahọpụta site n'ime Ahiara dayosis.
Ihe a megidere ruo mgbe Pope Benedict gbara arụkwaghịm n'ọnwa Febrụwarị afọ 2013, Pope Francis wee malite ọchịchị ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'ọnwa Julaị 2013, Pope Francis họpụtara Cardinal John Onaiyekan, bụ Bishọp na-elekọta mpaghara Achịdayọsis nke Abuja n'oge ahụ, ka ọ bụrụkwa onye ga na-elekọta dayọsis Ahiara.
N'ọnwa June afọ 2017, Pope Francis nyere ndị ụkọchukwu na ndị niile e chiri echi n'Ahiara dayọsis ụbọchị 30 iji rịọ mgbaghara maka inupuru Pope isi, nakwa ịnabata Okpaleke dịka Bishọp ha. Onye ụkọchukwu ọbụla jụrụ ide akwụkwọ ịrịọ mgbaghara ahụ, achụpụla onwe ya n'ịbụ ụkọchukwu.
Akụkọ kwuru na ndị ụkọchukwu ahụ dere leta iji rịọ mgbaghara, mana ha ekweghị anabata Okpaleke dịka onye ndu ha. Ha kwuru na ọ bụ omume ịkpa oke na ndị isi ụka Katọlik na Vatican jụrụ ịhọpụtara ha onyeisi site n'etiti onwe ha.
N'ọnwa Febrụwarị 2018, Ọkpaleke tinyere akwụkwọ arụkwaghịm ma kwuo na ya agaghị abụzi bishọp ndị Ahiara. "Echeghị m na ọrụ m ga-amịta mkpụrụ ọbụla ebe ọ bụ na ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị na mpaghara ahụ achọghị m dịka onye ndu ha," ka Okpaleke dere n'akwụkwọ arụkwaghịm nke o zigaara Pope Francis.
Nke a mere ka Pope họpụta Bishọp Lucius Ugorji, bụbu onye na-elekọta dayọsis Umuahia, ka ọ bụrụkwa onye nlekọta Ahiara, n'ihi na Onaiyekan na-elekọtabụ dayọsis ahụ alaala ezumike nka.
N'ọnwa Maachị afọ 2020, Pope kepụtara dayọsis ọhụrụ n'Anambra steeti, a kpọrọ Dayọsis Ekwulobia, ma tinye Okpaleke ebe ahụ dịka onye nlek.ọta ya. O teghị aka, n'ọnwa Mee afọ 2022, Pope Francis buliri Okpaleke n'ọkwa dịka Cardinal.














