Lee ụfọdụ ndị Ipob ụlọikpe sị ka a tọhapụ ma kwụọ ha ụgwọ

Ndị nkwado Ipob

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọikpe dị n’Abuja enyela iwu ka a tọhapụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) mmadụ asaa ma sị ka a kwụọ ha ego dị otu nde narị naịra na nde iri atọ (N130m).

Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu onyendu ha bụ Nnamdi Kanu depụtara nke a n'akwụkwọ ozi Facebook ma sị na ndị a ụlọikpe tọhapụrụ bụ ndị e jichiri n’ụzọ iwu na-akwadoghi n’ụlọmkpọrọ dị iche iche na Naịjirịa.

Ejiofor kwuru na ụfọdụ ndị a tọhapụrụ na nso nso a gụnyere;

Skip Facebook post
Hapụ Facebook ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Facebook. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Facebook iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of Facebook post

Nwada Maria Ezediaro

Maria Ezediaro

Ebe foto si, Maria Ezediaro/Fcebook

Ejiofor kwuru na ụlọikpe ukwu dị n’Abuja kụchapụrụ ebubo e boro nwada Maria Ezediaro bụ onye.

A nwuchiri nwada a na 26 Febụwarị 2021 mgbe ọ gara n’ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Owerri, Imo steeti ibugara enyi ya nri na ọgwụ n’ụlọmkpọro ha.

Ndị uweojii boro ya ọnụ ebubo anọ ma dosaa n’ụlọmkpọrọ dị n’Abuja ruo ọnwa Disemba afọ 2022 mgbe ụlọikpe nyere iwu ka a hapụ ya ka o si n’ụlọ na-abịa ụlọikpe.

Ejiofor kwuru na ọkaikpe M.O Olajuwon nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nọọrọ n’ụbọchị 10 Ọktoba 2023 kachapụ ebubo niile dị n’isi Maria Ezediaro ma sị na aka ya dị ọcha.

Ụkọchukwu Cletus na ndị ọzọ

Ndị otu Ipob a nwuchiri n'afọ 2021

Ebe foto si, Imo State Police

Ụkọchukwu Cletus Nwachukwu Egole bụ onyeisi ụlọụka Holy Trinity Sabbath dị n’Orlu Imo Steeti, nwunye ya Ifeanyi Egole, Michael Ubah onye amụma Jew, Ugochukwu Samuel na Raphael Idang bụ ndị uweojii nwuchiri n’ụbọchị 28 Maach 2021.

E buuru ha gawa n’ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Abuja ma jụ ịtọhapụ ha ma ọ bụ ịkpụpụ ha n’ụlọikpe.

Ejiofor kwuru na ndị uweojii mechara tọhapụ mmadụ abụọ n’ime ha Raphael Idang na Egole Ifeyinwa ma ka jichie mmadu atọ n’ime ha na-eboghi ha ebubo ọbụla.

O kwuru na Ọkaikpe V.S. Garba nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nọọrọ n’ụbọchị 19 Septemba 2023 kwuo na njichi ahụ ndị uweojii ji ụkọchukwu Egole na ndị ọzọ megidere iwu ma sị ka a tọhapụ ha.

Ụlọikpe a gara n’ihu sị ka a kwụọ ha ego dị otu nde narị naịra (N100m) dịka ego iti aka n’obi maka nwuchi a nwụchiri ha.

Ejiofor kwuru na ha enwetela akwụkwọ asambodo e jiri kpee ikpe ahụ na-atụ anya na ndị uweojii ga-eme ihe ụlọikpe kwuru ma tọhapụ ndị a.

Nwada Ngozichukwu Ada-Dav

Ngozichukwu Ada-Dav

Ebe foto si, Ada-Dav/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ejiofor kwuru na ndị uweojii nwuchiri Nwachukwu Ada-Dav n’ụbọchị 28 Juun afọ 2021 ma buru ya gawa n’ụlọọrụ ha dị n’Ikeji Legọs, mechaa si ebe ahụ kpọga ya n’ụlọọrụ ha dị n’Abuja n’ụbọchị atọ nke ọnwa Julaị 2021.

Ụlọikpe nyere iwu ka ha tọhapụ ya maọbụ kpụpụ ya n’ụlọikpe, bụ nke ndị uweojii mechara buru Ada-Dav gawa n’ụlọọrụ ha dị na Niger steeti bụ ebe ha kpụpụrụ ya n’ụlọikpe ma mechaa tọhapụ ya.

Ejiofor kwuru na ha mechara gbaa akwụkwọ n’ụlọikpe sị ka a kwụọ Ada-Dav ụgwọ maka mkpagbu ndị ọrụ nchekwa mere ya oge ọ n’aka ha.

N’ụbọchị 6 Ọktoba, 2023 ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nke ọkaikpe Z.B. Abubakar nọ n’isi ya kwuru na nwuchi ahụ a nwụchiri Nwachukwu Ada-Dev megidere iwu ma nye iwu ka a kwụọ ya ego dị ndị naịra iri atọ (N30m) dịka ego iti aka n’obi maka mkpagbu ọ gabigara.

Ntọpụ ndị otu Ipob a na-abịa dịka ụlọikpe kachasị na Naịjirịa hiwere ụbọchị 15 Disemba 2023 ikpebi ikpe dị n'etiti onyendu ha bụ Kanu na gọọmentị Naịjirịa ma a ga-atọhapụ ya.