Father Okunerere kwesịrị ka e too ya ọ bụghị itinyere ya ọgbatauhie - Fada Mbaka

Ebe foto si, Fr Mbaka/BBC
Ụkọchukwu a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka etinyela ọnụ iji kwadoo ụkọchukwu ibe ya bụ Paul Obayi, bụ onye kwuru n'ọdị nso a na ya nwereike ịpụ n'ịbụ ụkọchukwu n'ihi agwa mmegbu na mkpagbu nke ndị ụkọchukwu ibe ya na-emeso ya.
Mbaka dọrọ ndị ụka katọliki na Nsukka aka na ntị ka ha kwụsi ibuso ụkọchukwu Paul Obayi kama ka ha hapụ ya ka "ọ rụọ ọrụ Chukwu kpọrọ ya ka ọ rụọ".
"Fr Obayi nwereike ọ bụghị onye kacha mma, mana ọ bụ ezigbo mmadụ," Mbaka kwuru. "Ọ rụọla ọrụ ya nke ọma iritere Chineke ọtụtụ mkpuruobi, ọ bụghị onye e kwesịrị ime akaja.
"Onyeisi ncheatụrụ nke Nsukka Dayọsis kwesịrị ichekwa Obayi, ọ bụghị iji iru uju kwụọ ya ụgwọ."
"Mana ana m adọ Obayi aka na ntị ka ọ ghara ịdaba n'ọnwụnwa nke ịhapụ ịbụ onye ụkọchukwu."
Mbaka kwuru na ebe ọ bụ na Fr Obayi hapụrụ otu nzuzo wee bata n'ịbụ ụkọchukwu, ọ bụzi n'ime ụka ka a ga na-emekpa ya ahụ?
Gịnị na-esere Fada Ọkunaereere na Bishop Godfrey Onah?

Ebe foto si, Ozioko Chinonso
Otu ụkọchukwu Katolik a ma ama na Katọlik Dayọsis nke Nsuka bụ Fada Paul Obayi a ma ama dịka Fada Ọkụnaerere ekwuola ka obi dị ya dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia arụ aka na a na-akpagbu ya na dayọsis ahụ.
Fada Obayi bụ onye nwe 'Ọkụnerere Adoration Ministry' Nsukka bụ onye a ma ama maka ịgbasa oziọma na ibibi arụsị ndị si n'ọgọ mmụọ nabata Kraist na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ.
Akụkọ na-efegharị na soshal midịa ugbua na-ekwu na Fada Obayi na-ebo onyeisi ya ma bụrụkwa Bishop ụka Katolik na Dayosis Nsụka bụ Right Rev Godfrey Onah na ndị ụkọchukwu Katolik ebubo ịkpagbu ya site ịnapụ ya ala na emumewu ọ rụrụ nakwa ịkpachapụ ya maọbụ ụkọchukwu ndị na-abịa ya nso .
"Ụka bụ ugbo vine m. Ahụrụ m ụka n'anya. Ahụrụm ụka Nsụka, A hụrụ Bishop n'anya. Ahụrụ m ndị ụkọchukwu n'anya mana ha na-akpagbu m."
"Oge m na-achọ ala m ga na-edobe ekpere m, ahụghị, agara m nweta otu ebe dị n'azụ ụlọakwụkwọ 'Queens College Nsukka'. M bido,Bishop Onah chụpụrụ m ebe ahụ sị na m na- ebute mkpọtụ na-enye ụmụakwụkwọ nsogbu."
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na mkapgbu gaa n'ihu na ya nwere ike iyipu uwe ụkọchukwu ya bụrụzịa onye nkiti.

Mgbe BBC Igbo jụru Fada Obayi ihe na esere ya na Bishop ya okwu, ọ sara na “Obodo bụ igwe ugbua, aga m asa unu ajụjụ a ma emechaa”
N'aka nke ọzọ, mbọ BBC Igbo gbara inweta olu ụka Katolik na Nsuka Dayosis amịtaghị mkpụrụ tupu anyị bipụta akụkọ a.












