A kwụsịla ndị Katọlik ife ofufe n'Adoration Ministry Fada Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry
Bishọp ụka katọlik nke Enugwu Dayọsis bụ Bishọp Callistus Onaga enyela iwu sị ka ndị ụka ha kwụsị ife ofufe n’Adoration Ministry nke Fada Ejike Mbaka.
O nyere iwu a site n’akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchị 17 ọnwa Juun, 2022.
Bishop sị na mmachi a ga-adị ruo mgbe e mere nnyocha ndịisi ụka Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka
Ọnụ na-ekwuru Katọlik Enugwu bụ Fada Benjamin Achi, gwara BBC Igbo na ọ bụ Bishọp Onaga tinyere aka n'akwụkwọ ahụ.

Ebe foto si, Catholic Enugu
Ihe mere Bishọp Onaga ji nye iwu a
Ozi a sị “N’ihi ọtụtụ ihe ndị na-eme n’Adoration Ministry nke megidere okwukwe na nkuzi ndị Katọlik; a dọọla Fada Mbaka aka na ntị ọtụtụ oge mana o geghi ntị na ntuziaka ndị a.”
“Site n'ikike na ọrụ m dịka onyeisi ọzụzụ atụrụ nke Katọlik Enugwu Dayọsis, amachiela ndị Katọlik (ụkọchukwu, ndị ụka) ịga n’Adoration Ministry efe ofufe ruo mgbe e mechara nnyocha ndị ndu Katọlik na-eme n’isi Fada Mbaka”.
Bishọp Onaga gakwara n’ihu rịọ sị ka ndị ụka Kraịst niile kpeere Fada Mbaka na ụka Katọlik ekpere.

Ebe foto si, Catholic Enugu
Mmachi a na-abịa n’ụbọchị ole na ole Father Ejike Mbaka buru amụma sị na Peter Obi ji aha Labour Party azọ ọkwa Onyeisiala agaghị emeri maka na ọ bụ onye aka ntachi.
Amụma a Fada Mbaka buru mere ka ọtụtụ ndị mmadụ gbarụọ ihu ma katọọ ya n’ụzọ dị iche iche.
N’ihi nke a Mbaka wepụtara ozi n’ụbọchị Fraịde 17 Juun, sị na ọ gọziela Peter Obi ma rịọ ndị nkwado ya mgbaghara.









