Mbaka agọziela Peter Obi ma rịọ ndị nkwado ya mgbaghara

Ebe foto si, Adoration Ministry
Ụkọchukwu Katọlik a ma ama n'Enugwu Steeti bụ Ejike Mbaka arịọla aka chịburu Anambra Steeti bụ Peter Obi mgbaghara maka nkatọ ọ katọrọ ya n'abalị olemole gara aga.
Mbaka rịọrọ mgbaghara a n'akwụkwọ ozi o wepụtara site n'akara Facebook ya n'ụbọchị Fraịde.
O kwuru na ọ bụ nghọtahie ka ndị mmadụ ghọtahiere ihe o kwuru.
"N'ụzọ ọbụla ụnụ si ghọtahie m, maọbụ etu ọbụla m si mejọọ, biko ghọtanụ ma gbagharanụ m," Mbaka kwuru.
End of Akụkọ gbasara Fada Mbaka
Cheta na Mbaka kwuburu na "enweghị ebe Peter Obi ji azụ aga n'okwu gbasara ịbụ onyeisiala Naịjirịa na 2023".
O kwuru nke a n'ọgbakọ ekpere nke 'Adoration Ministry' nụbọchị Wenezde, abalị iri na ise nke ọnwa Jun 2022.

Ebe foto si, Adoration Ministry
N'akwụkwọ ozi ya, Mbaka kwuru na ya na-ekpere Peter Obi ekpere ka uche Chineke mezuo n'isi ya.
"Ebumnuche m abụghị iluso Peter Obi ọgụ maọbụ kọtọọ ya."
"Ọ bụ enyi m ma bụrụkwa nwanne m nwoke. Ahụrụ m ya n'anya, ma na-ekpekwara ya ekpere ọma."
"Ana m agọzi Peter Obi na ndị na-akwdo ya."
"Ana m agọzikwa ndị ọzọ niile na-azọ ọkwa onyeisiala nakwa ndị nkwado ha."
"Ana m ekwe mmadụ niile nkwa na ana m ekpe ekpere ka Chineke nye anyị ezi ndị ndu na Naịjirịa ndị ga-eme uche ya."

Ebe foto si, Adoration Ministry
Mbaka gara n'ihu kwuo na ya anọghị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla, kama ya na-akwado onye ọbụla ga-eweta ọchịchị ọma na Naịjirịa.
"Ihe na-agụ m agụụ oge niile bụ ka Naịjirịa pụta n'ụbịam na ihe isi ike na-echere ọtụtụ mmadụ aka mgba," Mbaka kwuru.
"Ka Chineke nyere anyị aka."
Onye bụ Fada Mbaka?

Ebe foto si, Adoration Ministry
Fr Ejike Camillus Mbaka bụ ụkọchukwu Katọlik na-arụ ọrụ na Dayọsis nke Enugwu, na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Ọ bụkwaya ya bụ onyeisi ụlọ ekpere a na-akpọ 'Adoration Ministry Enugwu, Nigeria' (AMEN).
E chiri ya ụkọchukwu n'ọnwa Julaị nke afọ 1995, nke pụtara na ọ rụọla ọrụ dịka ụkọchukwu ihe ruru afọ 27 ugbua.
Otu ihe e ji mara Mbaka bụ na ọ na-ebukarị amụma gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ntuliaka, nakwa ndị ga-emeri ntuliaka.
N'afọ 2020, Mbaka buru amụma na Hope Uzodinma ga-arigo n'oche Gọvanọ Imo Steeti.
O buru amụma a na-agbanyeghị na Emeka ihedioha bụ Gọvanọ Imo Steeti n'oge ahụ, dịka okwu ntuliaka ya kadị n'ụlọikpe.
Ulọikpe kachasị na Naịjirịa mechara chụtuo Ihedioha ma kwuo na ọ bụ Hope Uzodinma meriri ntuliaka ahụ.
Mbaka bukwere amụma na Buhari ga-emeri Jonathan na ntuliaka nke 2015, Amụma a bịakwara na mmezu.
Mana n'afọ 2020, Mbaka mechara katọọ ọchịchị Buhari.









