Gịnị bụ Hamas? Gịnị na-eme n'Izrel n'okeala Gaza? Na ajụjụ ndị ọzọ...

Ebe a gbara ogbunigwe

Ebe foto si, Reuters

Otu ọgụ nke mba Palestine bụ Hamas emeela mwakpo nke ahụbeghị ụdị ya mbụ na mba Israel, dịka ndị agha ha banyere n'obodo dị nso na Gaza Strip, gbuo ọtụtụ mmadụ ma tọrọkwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Akụkọ a ga-akọwara gị ihe dị mkpa maka ebe na ndị mwakpo a gbasara - nakwa nkọwa ga-enyere gị aka ghọta akụkọ a nke ọma.

Gịnị bụ Hamas?

Hamas

Ebe foto si, AFP

Hamas bụ otu ndị ọgụ alakụba nke na-achị mpaghara 'Gaza Strip' na mba Palestine. Hamas aṅụọla iyi ibibi Israel, ha ebusokwala Israel agha ọtụtụ oge kamgbe ha weghaara ọchịchị na mpaghara 'Gaza Strip' n'afọ 2007.

Dịka agha ndị ahụ na-aga n'ihu, Hamas agbaala, maọbụ nye otu ndị ọzọ ohere ka ha gbaa puku kwuru puku ogbunigwe na mba Israel, ma bukwaa ọtụtụ agha megide Israel.

Israel ebusokwala Hamas agha ugboro ugboro site n'ịtụ ha ogbunigwe. Ha na mba Egypt jikọkwara akanọchie ụzọ 'Gaza Strip' kamgbe afọ 2007 dịka ha sị na ọ bụ iji chekwaa onwe ha.

Mba Israel, Amerịka, UK na 'European Unino' na ụfọdụ mba ndị ọzọ na-ahụta otu Hamas, maọbụ ngalaba ndị ọgụ ha, bụ ndị otu na-eyi ndụ egwu. Mba Iran na-enye Hamas nkwado site n'inye ha ọzụzụ, ego, nakwa ngwaọgụ.

Gịnị bụ 'Gaza Strip'?

Gaza
Nkọwa foto, Ihe ruru pasentị 80 ndị bi na Gaza na-adabere n'enyemaka si mba ofesi iji bie ndụ ha, dịka otu UN si kwuo.

Gaza Strip bụ oke ala dị kilomita 41 (mile 25) n'ogologo na kilomita iri n'obosara, nke dị n'etiti mba Israel, Egypt na oke osimiri Mediterranean. Ọnụọgụgụ ndị mmadụ bi ebe ahụ ruru nde 2.3, o so na mpaghara ebe ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ na ya kacha n'ụwa.

Gịnị ka ndụ dịka ya na 'Gaza Strip'?

Ọ bụ mba Israel na-achịkọta mpaghara igwe na Gaza nakwa mpaghara osimiri ya, ha na-ekwukwa onye maọbụ ngwaahịa ga-abata maọbụ pụọ n'okeala ahụ. N'otu aka ahụ kwa, mba Egypt bụ ndị na-achịkọta onye na-abata maọbụ pụọ na mpaghara okeala ha na Gaza.

Ihe ruru pasentị 80 ndị bi na Gaza na-adabere n'enyemaka si mba ofesi iji bie ndụ ha, dịka otu UN si kwuo. Ihe ruru otu nde mmadụ na-adabere n'enyemaka nri kwa ụbọchị.

Gịnị bụ Palestine? Kedu etu ihe a na-emenụ si gbasa ya?

Palestine

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mba Israel na Palestine enwewela mkparịtaụka ọtụtụ afọ mana nke a emebeghị ka udo dị

Mpaghara West Bank na Gaza bụ ebe a ma dịka mpaghara mba Palestine, tinyekwara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem na Israel, ha ncha bụbu mpaghara ala a ma dịka Palestine kamgbe ọchịchị ndị Rome.

Mpaghara ndị a bụkwa mpaghara alaeze ndị Juu n'akwụkwọ nsọ, dịka ndị Jew na-ahụta ya dịka ala nnanna ha.

Maapụ kọwara okeala Israel

A kpọpụtara Israel dịka mba nke aka ya n'afọ 1948, n'agbanyeghị na ndị na-anabataghị na Israel nwere ikike ịbụ mba nke aka ya ka na-ahụta ala ahụ dịka Palestine. Ndị Palestine ka na-ajikwa aha a bụ 'Palestine' iji kpọkọta mpaghara 'West Bank', Gaza na ọwụwa Anyanwụ Jerusalem.

Gịnị ka Israel na Hamas na-alụrụ ọgụ?

Gaza

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Anwụrụ na-arị elu dịka Israel na-aga n'ihu na-atụ ogbunigwe na Gaza

Esemokwu dị oge niile n'etiti Israel na Hamas, mana mwakpo nke ụbọchị Satọde bịara na-enweghị ịdọ aka na ntị ọbụla. Hamas gbabanyere puku kwuru puku ogbunigwe n'ime Israel ebe ọtụtụ ndị ọgụ ha gafere oke ala Israel ma wakpo ụfọdụ obodo n'ime Israel, gbuo ọtụtụ ndị nkịtị ma kpụrụkwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Israel tụkwara ogbunigwe nke ha iji zaghachi Hamas, dịka ha kwuru na ebe ha tụrụ ogbunigwe bụ n'ụlọ ebe ndị ọgụ Hamas bi na Gaza.

Ụdị mwakpo a emeela mbụ?

Etu mba Afrịka dị icheiche si kwụrụ n'okwu Israel na Palestine
Nkọwa foto, Lee ihe mba Afrịka dị icheiche na-ekwu banyere ọnọdụ Israel na Palestine

Dịka onye ntaakụkọ anyị bụ Jeremy Bowen si dee, nke a bụ mwakpo kachasị nke otu Hamas na-eme site na Gaza, ma bụrụkwa mwakpo kacha njọ nke Israel na-ezute n'ime ihe karịrị otu agbụrụ.

Ndị ọgụ Hamas bebiri 'wire' e ji kpachie okeala kewara Israel na Gaza n'ebe dị icheiche.

Mwakpo a nke ahụbeghị ụdị ya mbụ mere dịka ọ gachara otu ụbọchị e ji mee ncheta afọ 50 nke mwakpo mba Egypt na Syria mere n'afọ 1973 bụ nke bidoro nnukwu agha na mpaghara 'Middle East'. Ndị isi otu Hamas ga-ama nke ọma maka ihe ụbọchị ahụ pụtara nye mba Israel.

Nke a ọ bụ nnukwu ọdịda nya ngalaba nchọpụta nke ndị agha Israel?

Ndị agha Israel na nso Gaza

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ndị agha Israel na nso Gaza
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Eeh, dịka onye ntaakụkọ nchekwa BBC bụ Frank Gardner si kwuo. Israel nwere ngalaba dị icheiche kwesịrị inyochapụta gbasara mwakpo a tupu o mee, nke gụnyere 'Shin Bet, Ngalaba nnyochapụta nke ime mba Israel, Mossad - nke bụ ngalaba nnyopu nke mba Israel na mba ofesi, nakwa akụrụngwa niile nke ngalaba nchekwa mba Israel.

Ọ bụ nnukwu ihe ịtụnanya na onweghị onye hụrụ na mwakpo a na-abịa, maọbụ na ha emeghị ihe ọbụla iji gbochie ya ma ọ bụrụ na ha nwetara ịdọ aka na ntị.

Israel nwere ihe a ga-akpọ ngalaba nnyochapụta kacha mma na mpaghara 'Middle East' niile, ha nwechara ndị nnyopu n'ime ndị otu ọgụ Palestine dị icheiche, nwekwaa na Lebanon, Syria na ebe ndị ọzọ.

N'ala, n'ogologo okeala kebiri Israel na Gaza, e nwere osefoto, nakwa akụrụngwa na-anụ mkpọtụ na-eme n'ala, nakwa ndị agha na-agagharị oge niile.

Igwa 'barbed wire' nke e ji kewaa Gaza na Israel kwesịrị inwe ihe a kpọrọ 'smart barrier' bụ nke kwesịrị igbochi kpọmkwem ụdị mwakpo a. Mana ndị ọgụ Hamas bekara igwe 'wire' ndị ahụ banye n'Israel, ụfọdụ sikwa n'osimiri ebe ndị ọzọ ji akụrụngwa 'paraglider' banye.

Gịnị nwereike ime ọzọ?

Ogbunigwe na-agba

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Israel na Hamas ka na-agbarịta onwe ha ogbunigwe

Onyeisi ndị ọgụ Hamas bụ Mohammed Deif akpọkuola ndị Palestine niile nakwa mba Arab ndị ọzọ ka ha jikọọ aka ọnụ iji "zachapụ ndị [Israel] nọchiri ala ha".

Nnukwu ajụjụ dịzị ugbua bụ ma ndị Palestine bi na mpaghara West Bank nakwa Ọwụwa Anyanwụ Jerusalem maọbụ n'ebe ndị ọzọ ha a ga-ege ntị n'arịrịọ a, Yolande Knell, bụ onye ntaakụkọ anyị na Jerusalem kwuru.

Israel kwuru na ha na-atụ anya na agha a nwereike ịmụba n'ebe dị icheiche. Ihe ka njọ bụ na o nwereike ịdọbata ndị ọgụ Hezbollah, bụ otu ọgụ mba Lebanon siri ike nke ukwuu. N'ụtụtụ ụbọchị Sọnde, Hezbollah tụrụ ụfọdụ ogbunigwe na mpaghara Ugwu mba Israel, mana onweghị onye nwụrụ.

Ndị agha mba Israel enyela iwu ka akpọgakwuo ndị agha na mpaghara ahụ. Ha ka na-atụsikwa ogbunigwe ike na mpaghara Gaza, dịka ha kwuru na ha nwere atụmatụ iziga ndị agha ụkwụ ebe ahụ.