Ụmụnwaanyị Naịjirịa esiela ndị Ethiopia n'ite ka ọkpa 9th Mile
Ebe foto si, @NGSuper_Falcons/X
Otu bọọlụ ụmụnwaanyị nke Naịjirịa bụ Super Falcons ejirila ọkpụ goolu anọ a sataghị ihe kụpịa ndị ogbo ha nke mba Ethiopia, oge ha zutere n'asọmpi ntozu oke maka iko Olympics nke afọ 2024 a ga-agba na Paris, mba France.
Uchenna Kalu nyere otu goolu, Rasheedat Ajibade nyere abụọ, ebe Asisat Oshoala nyere goolu nke anọ Naịjirịa ji turu ugo n'asọmpi a nke a gbara n'ama egwuregwu Moshood Abiola n'Abuja n'ụbọchị Tuzde.
Cheta na Naịjịrịa na Ethiopia nyeburu onwe ha otu goolu otu goolu oge ha zutere n'Addis Ababa, mba Ethiopia n'izuụka gara aga. Nke a pụtara na ọ bụ ọkpụ goolu ise a satara otu ka Super Falcons ji merie ndị Ethiopia n'asọmpi abụọ ahụ.
Naịjirịa agafeela n'agba nke abụọ nke asọmpi ntozu oke maka Paris 2024, ebe ha ga-ezute mba Cameroon maọbụ Uganda.
Akụkọ maka nhazigharị naịra a kpọrọ 'redenomination' bụ ụgha - CBN
Ebe foto si, Nigeria Govt
Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ha nwere atụmatụ maka ịhazigharị naịra, nke bekee na-akpọ 'naira redenomination' dịka akụkọ si efegharị na soshal midia.
Isa Abdulmumin, bụ ọnụ na-ekwuru ụlọakụ ahụ kwupụtara nke a n'ime akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Tuzde.
O kwuru na ndị na-ede akụkọ ụgha ndị ahụ ma na-ekesa ya na soshal midia wetara ozi ochie nke CBN zipuru n'afọ 2007 ma degharịa ya, malite ikesa ya ka a ga-asị na ọ bụ ozi ọhụrụ.
"Anyị enweghị atụmatụ ọbụla ugbua ịhazigharị maọbụ ịgbanwe ogogo naịra. Ọ bụrụgodi na ụlọakụ ahụ na-atụle ụfọdụ mgbanwe, anyị ga-eso usoro iwu hibere ụlọakụ a bụ CBN Act 2007 wee mee nke a".
"Anyị na-agwa ọha obodo ka ha ghara ige ntị n'akụkọ ụgha ndị a na-efegharị bụnke a chọrọ iji tinye ndị mmadụ ụjọ n'ahụ."
Ụlọikpe mkpegharị ekwuola na Timipre Sylva ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa
Ebe foto si, hetimipresylva/Instagram
Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja akụchapụla mkpebi nke otu ụlọikpe ukwu nyeburu nke machiri Timipre Sylva iso zọọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa steeti n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' (APC).
Dịka ụlọ ntaakụkọ Channels TV si dee, Ọkaikpe Binta Zubairu nyere mkpebi a n'ụbọchị Tuzde dịka o kwuru na ọkaikpe Donatus Okorowo nke ụlọikpe ukwu mehiere na mkpebi ya nke ụbọchị 9 nke ọnwa Ọktoba, ịmachi Timipre isonye na ntuliaka ahụ ga-adị n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2023.
Zubairu kwuru na onye wetara mkpesa ahụ n'ụlọikpe, bụ onye otu APC aha ya bụ Demesuoyefa Kolomo, enweghị ikike ọbụla iweta ya bụ mkpesa, nke bekee na-akpọ 'locus standi', n'ihi na o sonyeghị na ntuliaka imeụlọ nke APC ebe a nọrọ họpụta Sylva dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Bayelsa n'aha APC.
O kwuru na ebe ọ bụ na onye wetara mkpesa ahụ enweghị ikike iweta ya na nke mbụ, ụlọikpe ọbụla enweghị ikike ikpebi ikpe gbasara mkpesa ahụ.
Cheta na ọkaikpe Donatus Okorowo kpebiri na Sylva etozughị ịzọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa ọzọ n'ihi na e duola ya n'iyi ọrụ ugboro abụọ dịka gọvanọ na steeti ahụ, ọ bịakwa rụọ ọrụ dịka gọvanọ ihe ruru afọ ise.
"Ọ bụrụ na Sylva merie ntuliaka a, ọ pụtara na a ga-edu ya n'iyi ọrụ nke ugboro atọ, nke megidere iwu Naịjirịa kwuru na mmadụ ga-aṅụ iyi ọrụ dịka gọvanọ naanị ugboro abụọ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọ merie ntuliaka ahụ ma chịa afọ anọ ọzọ, ọ pụtara na mkpokọta afọ ole ọ rụrụ ọrụ dịka gọvanọ na Bayelsa steeti ga-abụ afọ itoolu, mana iwu Naịjirịa kwuru na mmadụ agaghị arụ ọrụ dịka gọvanọ karịa afọ asatọ," ka Okorowo kpebiri n'oge ahụ.
Mana dịka ọkaikpe Zubairu si kwuo n'ụbọchị Tuzde, "ọ bụrụ na ụlọikpe enweghị ikike ikpebi ikpe ọbụla, ma gaa n'ihu kpebie ya, n'agbanyeghị amamihe dị na mkpebi ahụ, ikpe ahụ niile lara n'iyi".
Ọkaikpe Zubairu gakwara n'ihu nye iwu ka a kwụọ Sylva otu nde naịra
A nwuchiela nwoke tụrụ ndị 'Jehova Witness' ogbunigwe
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii kwru na ha anwuchiela otu nwoke a na-enyo maka ịtụnye ogbunigwe n'ọgbakọ ndị ụka Ama Jehova nke Bekee kpọrọ, "Jehovah Witnesses".
Mmadụ atọ nwụrụ ,ebe mmadụ 50 merụrụ ahụ site n'ọdachi ahụ mere Ụbọchiụka' dịka ndị ụka ahụ nwere ọgbakọ ekpere.
Ụmụnwaanyị abụọ nwụrụ ebe ahụ, ebe obere nwaanwaanyị gbara afọ 12 nwụrụ n'ụlọọgwụ site n'ọkụ gbara ya site n' ogbunigwe ahụ.
Otu onye ụka ahụ nọ ebe ihe mere bụ Queen Richard,kwuru sị, "Anyị mechir anya ka anyị kpee ekpere, anyị nụ ka ihe gbara n'etiti ụlọọgbakọ. Nnukwu oku malitere" Nwaanyị ahụ onye kwuru na ya na di ya bụ onye nwere ọlụsi so, kwuru na ọ hịara ha ahụ ịgbapụ ọsọ n'ebe ahụ.
Ndị uweojii India nwụchiri nwoke ahụ a kpọrọ 'Maazi Martin' dịka nwa amadi bụbụ onye otu ahụ ahụ wepụtara ihe onyonyo n'ọbaozi Facebook were kwuo na ọ bụ ya mere ya n'ihi iwe ya maka ụfọdụ nkuzi ndị na-ekpe ụka ahụ na-akụzi.
Ndị uweojii kwuru na Martin onye si na steeti Kerala steeti dị n'India rụburu ọrụ na Dubai.
"Anyị nwere nkwenye na ọ bụ ya kpara ya bụ mkpamkpa n'ihi ihe o kwuru nakwa ihe aka ebe anyị nwetara."
Ogbunigwe ahụ gbara tinyere egwu n'ọtụtụ ndị mmadụ n'India ma mee ka ndị uweojii welie etu ha si echekwa Delhi, Mumbai na obodo ndị ọzọ mepere emepe.
Ụka Ama Jehova bụ otu ụka Kraisti nwere nkwenye na ndị ụka Kraistị ndị ọzọ ahapụla nkuzi nke Akwụkwọ Nso nakwa n'agha Armaggedon adịla nso
Otu a na-ekwu na ha dị nde 8.7 , ebe ihe ruru mmadụ 60,000 na-aga ụka ha n'India, dịka ha hikwara nne na Kerala steeti, ebe ha na-esi ụlọ aba ụlọ izi ozioma.
Mmadụ abụọ emerụọla ahụ na mwakpo ojiegbe na Japan
Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ abụọ emerụọla ahụ n'otu ụlọọgwụ dị na Toda mba Japan dịka onye ji egbe wakporo ebe ahụ.
Onye ojiegbe ahụ nke ndị ụweojii na-achụ mabara ọgbatumtum ma jiri ya gbapụ ọsọ n'ebe ahụ dịka ọ gbachara egbe ahụ.
N'otu aka ahụ, e ji otu onye n'ime ụlọorụ nzịpu ọzị edemede dị n'obodo Warabi dị nso na Toda.
O dobeghi anya ma o nwere ihe jikọrọ ihe abụọ a .
Ndị mgbasa ozi mba Japan ewepụtala ihe onyonyo na-egosi ebe otu nwoke bu egbe kwụrụ na mpụta ụlọọgwụ Toda Chuo General ebe agbara ndị ahụ egbe.
Akụkọ na-ekwu na ndị a gbara egbe bụ otu onye dọkịnta nakwa otu onye agadị bịara ịnata ọgwụgwọ.
Ngụkọ nke ngalaba 'Police Service Commission' (PSC) wepụtara egosila na ọnụọgụgụ ndị si mpaghara ọwụwa anyanwụ tinyere akwụkwọ maka ịbanye ọrụ uweojii n'afọ 2023 kacha nta na mpaghara Naịjirịa niile.
Dịka ngụkọ a nke e bipụtara na websaịt PSC si gosi, naanị ndị si Kaduna steeti tinye akwụkwọ karịrị ndị si na steeti ise dị na Ọwụwa Anyanwụ.
A bịa na steeti ise ahụ, Anambra na-agba ndị ikpeazụ dịka naanị mmadụ 541 tinyerela akwụkwọ n'oge ndị PSC wepụtara akwụkwọ ozi ahụ. Ndị ọzọ gụnyere: Ebonyi - 737; Abia - 966; Imo - 999 na Enugwu - 1,036.
Nke a pụtara na dịka ụbọchị itoolu gachara e ji malite atụmatụ iwe ndị uweojii n'ọrụ, naanị mmadụ 4,279 si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa tinyerela akwụkwọ igosi mmasị, ebe naanị Kaduna steeti nwere mmadụ 20,259 tinyere akwụkwọ.
Solomon Arase bụ onyeisi PSC kwuru na ọ bụ ihe mwute na ndị ntorobịa si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ anaghị egosi mmasị ọbụla isonye n'ọrụ uweojii.
Arase kwuru na ebe ọ bụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ na-agabiga nnukwu ọnọdụ nchekwa ọjọọ ugbua, o kwesịrị ịbụ ndị ntorobịa ha ga-aka nwee mmasị ịbanye ọrụ uweojii iji chọta ogbugbo ma weta nchekwa na mpaghara ha.
O kwuru na ọ gaghị adị mma ma ọ bụrụ na gọọmentị wechaa ndị uweojii n'ọrụ, otu mpaghara ebido ime mkpesa na a na-emekpa ndịnke ha ahụ, ebe ọ bụ na ha egosighi mmasị ọbụla ịbanye n'otu ndị uweojii.
N'otu aka ahụ kwa, onyeisi otu Ohaneze Ndigbo bụ Emmanuel Iwuanyanwu wepụtara akwụkwọ ozi nke o ji kpọkuo ndị ntorobịa ọwụwa anyanwụ ka ha gosi mmasị isonye n'ọrụ uweojii iji nwee ohere ịgbagote n'ọkwa n'ọdịnihu.
Etu e si chọta ozu mmadụ karịrị 70 n'ebe a na-ere ehi na Lokpanta - Alex Otti
Ebe foto si, Alex Otti/Getty Images
Gọvanọ Alex otti nke Abia Steeti akọọrọla ọha obodo ihe mere ya ji kurie mpaghara ụfọdụ n'ahịa ebe a na-ere ehi na Lokpanta, dị n'okpuru ọchịchị Umunneochi, ma nyekwa iwu na mmadụ agaghịzi na-arahụ n'ahịa ahụ.
Na mkparịtaụka nke ya na ndị ntaakụkọ na-enwe kwa ọnwa, Otti kwuru na ya chọpụtara na ndị ekperima ji ahịa mere isi ụlọọrụ ha, dịka ndị na-azụ ahịa ọgwụike, egbe nakwa ndị na-agba akwụna bicha ebe ahụ.
"Anyị tinyere akụrụngwa tekịnụzụ ọhụrụ na-enyere anyị aka ịmata ihe na-eme na mpaghara niile n'Abia steeti. Nke a mere ka anyị chọpụta na ọtụtụ ego ndị ntọrị mmadụ napụrụ ndị mmadụ bụ n'Umunneochi ka ego ndị ahụ na-aga.
"Nke a mere ka anyị wakpo ebe ahụ, ihe anyị hụrụ tụrụ anyị n'anya. Anyị chọtara ozu mmadụ karịrị 50 n'ahịa ahụ ebe a na-ere ehi n'Umunneochi. Anyị hụkwara ozu mmadụ isi ha dịghị na ya, ọnụọgụgụ ha karịrị 20 - gụnyere ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, ụmụaka. Anyị hụkwara ọtụtụ ọkpụkpụ ndị e gburu egbu ebe ahụ," Otti kwuru.
Gọvanọ ahụ na ọ bụ nke a mere ha ji kurie ụfọdụ ụlọ ebe ndị akwụna na-ebi n'ahịaahụ, ma tinyezie iwu na ọ ga-abụ ahịa a na-azụ malite n'elekere isii nke ụtụtụ ruo elekere isii nke mgbede ụbọchị ọbụla.
O kwukwara na ya ga-arụ ogige gbaa ahịa ahụ gburugburu iji hụ na ndị ekperima ahụ alaghachikwaghị ebe ahụ ọzọ.
"Anyị ekpebiela iweta nchekwa zuru oke n'Abia steeti n'ihi na enweghị gọọmentị ọbụla ga-eme nke ọma n'ebe enweghị nchekwa na-arị elu.
Mike Pence, bụbu osote Trump, apụọla na ndọrọndọrọ ọkwa onyeisiala Amerịka
Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbu osote onyeisiala mba Amerịka bụ Mike Pence ekwuola na ya esozighị azọ ndọrọndọrọ ọkwa onyeisiala mba ahụ na ntuliaka nke a ga-enwe n'afọ 2024.
Pence kwuru nke a n'ọgbakọ nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Repọblịkan n'ụbọchị Satọdee na Las Vegas.
"Anyị mabu na nke a ga-abụ ihe siri ike nke ukwuu, mana enweghị m mwute ọbụla isonye na ya," Pence kwuru.
"Ana m ahapụ ndọrọndọrọ a, mana agaghị m ahapụ ọgụ m na-alụ maka ihe ziri ezi."
Pence bụ onye otu Ripọblikan pati mbụ a ma aha ya ga-ekwu na ya esokwaghị azọ ọkwa onyeisiala, dịka aka chịburu Amerịka bụ Donald Trump na-agba onye nke mbụ na ndọrọndọrọ ahụ.
Cheta na Pence bụ osote onyeisiala oge Trump bụ onyeisiala bido n'afọ 2016 ruo 2020, mana ha abụọ sere okwu dịka Pence jụrụ ịkwụnyere Trump n'ebubo ọ na-ebo na ntuliaka nke afọ 2020 jupụtara na ntuliaka.
Na ngagharịiwe nke ọtụtụ ndị nkwado Trump mere n'ogige 'Capitol' n'afọ ahụ, ọtụtụ n'ime ha na-eti mkpu sị "kwụgbuo Mike Pence". Kamgbe ahụ, ọtụtụ ndị nkwado Trump na-ahụta Pence dịka onye rere nna ya ukwu.
N'akwụkwọ o wepụtara iji kwuo na ya anakwaghị azọ ọkwa onyeisiala, Pence agwaghị ndị nkwado ya onye ha ga-atụnyere vootu, kama ọ sị ha ka ha họrọ onye ha chere na ọ ga-abụ onye ndu ga-edubanye ha n'ọdịnihu dị mma.
'Onye sị na m na-arụrụ Tinubu ọrụ, ya wepụta ihe akaebe ya' - Lamidi Apapa
Ebe foto si, Other
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ndị pati APC na-enye Lamidi Apapa nkwado ka o bute nkewa na Labour Pati, mana o kwuola na nke ahụ abụghị eziokwu
Onye bụ onyeịsị otu alaka nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour patị bụ Lamido Apapa ekwụola na ebubo ndị mmadụ na-ebo na ya na-arụrụ onyeisiala Bola Tinubu ọrụ abụghị eziokwu ma ncha.
Apapa kwuru nke a na mkparịtauka ya na BBC Yoruba nwere n'ọdị nso a, ebe ọ nọkwara kọwaa ịhe ọ sị bụ ịwe ya n’ebe Peter Obi nọ, bụ onye zọrọ ọkwa onyeisiala na Labour pati.
Cheta na e boro Lamido ebubo na ọ na-akwado onyeisiala Bola Tinubu iji buso Peter Obi agha.
"Ụlọ ntaakụkọ dị ịcheịche jụrụ m ajuju gbasara ịrụrụ Tinubu ọrụ, mana ekwuola m na ihe ndị ahụ bụ okwu ugha, onye nwere akaebe wepụta ya, kamgbe ọnwa ịse o nwebeghị onye pụtara kwụọ na ọ nwere akaebe," Apapa kwuru.
"Ana m ekwusi ike na enweghị m aka ọbụla na mmerị Tinubu meriri n’ụlọịkpe 'tribunal'. Ụfọdu ndị ntaakụkọ jụru m na ọ buru na onyeisiala Tinubu kpọọ mụ oku, ma m ga-aza ya? Asara m ha na Tinubu bụ Onyeisiala obodo anyi, ọ bụrụ na pati m zịga m ka m ga hụ ya, aga m aga hụ ya. Anaghị m aga ịhu Tinubu maka na ọ bụ Tinubu kama aga m aga za ya maka na ọ bụ onyeịsịala Niajịrịa."
Ebe foto si, Other
Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị nkwado Labour Pati gbochiri Lamidi Apapa ịgwa ndị ntaakụkọ okwu n'ụlọikpe n'ọnwa Mee afọ a
Gbasara esemokwu ya na Peter Obi, Lamido Apapa kwuru na ya na-ekpere Peter Obi ka ọ dịrị ya mma, mana iwe ya n'ebe ọ nọ bụ etu o si akwanyere Julius Abure aja n'ukwu.
Cheta na Julius Abure bụkwa onyeisi otu alaka nke Labour Pati, dịka ikpe gbasara onye bụ onyeisi pati ahụ kpọmkwem ka na-aga n'ihu.
"Nani ebe ịwe sị ewe anyi n'ebe Peter Obi nọ bụ ịhe banyere nchekwa o nyere Abure, bụ onye ụlọikpe nyere ịwụ sị ya egosizịna onwe ya ka onyeisi Labour Pati, ya ka Obi na-agaghari na-akwado ya ka onye nke ya," Abure kwuru.
Ọ gara n'ihu kọwaa ihe mere n'ụlọikpe mkpegharị oge a na-ekpe ikpe dị n-etiti Peter Obi na onyeisiala Bola Tinubu gbasara onye meriri ntuliaka 2023.
O kwuru na ya bịara n'ụlọikpe n'ụbọchị ahụ dịkaonyeisi Labour Pati, mana oge ọkaikpe jụrụ onye ga-anọchite anya Labour Pati, "otu nwaanyị onye ọkwa ya dị nta kwụụrụ ọtọ kwuo na ọ bụ ya ga-anọchite Labour Pati".
"Ajụrụ m ajụ. Ekwuru m na onweghị onye ọzọ ga-anọchite anya Labour Pti ebe m nọ n'ụlọikpe ahụ."
"Oge e kpechara ikpe nke ụbọchị ahụ, m si n'ụlọikpe na-apụta, ndị ntaakụkọ chọrọ ịjụ m ajụjụ, mana dịka m na-agwa ha okwu ụfọdụ ndị omekome, ndị m na-eche na ọ bụ Abure maọbụ Peter Obi zitere ha, bịara kwụsị m ịgwa ndị ntaakụkọ okwu."
"Ọ fọrọ ntakịrị ihe ka ha merụọ m ahụ mana ndi uweojii zọpụtara m ma kpọrọ m gaa n’ụlọọrụ ha’’.
Mathew Perry, omeiheejije Amerịka a ma ama alaala mụọ
Ebe foto si, Getty Images
Onye ihe ejije Amerịka a ma ama bụ Matthew Perry anwụọla ka ọ gbachara afọ 54.
A ma Perry maka ime agwa ‘Chanddler Bing' n'ihe ejije wuru ewu n’agbata 1990s na 200os a kpọrọ 'Friends'.
A hụrụ ozu Perry n’ụlọ ya na Los Angeles dịka ndị uweojii si gwa ndị ntaakukọ.
Ụlọntaakụkọ LA na TMZ bụ ndị bụ ụzọ wepụta akụkọ ọnwụ Perry kwuru na a hụrụ ya dịka ọ naghị ekuzi ume n’ime efere ọba e ji asa ahụ dị n’ụlọ ya.
Ụlọọrụ ‘Warner Bros TV bụ ndị mepụtara ihe onyonyo ‘Friends' kwuru sị, “Ụkpụrụ ya dịka ọkpaọchị ọkaibe gazuru ụwa nile, ọ ga-anọgide n’obi ọtụtụ ndị mmadụ.”
'Friends' bụ ihe onyonyo maka ndị enyi isii bi n' obodo New York nke agbasara n’onyonyo TV n’agbata afọ 1994 rue 2004.
Supreme Court ruling: Alaka Labour Party nke Lamidi Apapa ekelela Tinubu
Alaka otu 'Labour Party' nke Lamidi
Apapa nọ n’isi ya ekelela Onyeisiala
Bola Tinubu mmeri m Ụlọikpe Kachasị.
N’ụbọchị Tọzde, Ụlọikpe Kachasị kụpụrụ n’akụkụ mkpesa nke Atiku Abubakar nke PDP na Peter Obi nke Labour Party wetara iji gbagha mkpebi Ụlọikpe pụrụ iche e
hiwere maka ntuliaka nyere nke kwadoro mkpọpụta Inec kpọpụtara Bola Tinubu dịka onye meriri na
ntuliaka Onyeisiala nke afọ 2023.
N’ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru alaka ahụ bụ Abayomi Arabambi, binyere
ma wepụta n’ụbọchị Satode, o kwuru na mmeri Tinubu ruuru ya dịka o gosiri ihe
akaebe kara aka.
“Mmeri a ebiela okwu nile metụtara ntuliaka nke ọkwa Onyeisiala na Ụlọomeiwu e mere nabalị 25 nke ọnwa Febụwarị 25,"
"Ọ bụ olileanya anyị na Onyeisiala ga-adị ebere na mmeri o meriri kpọbata Labour Party n’ọchịchị ya maka ịkwalite ịdịnotụ Naijiria.”
N'aka nke ọzọ, alaka ahụ kwakwara Peter Obi emo sị na mkpesa ya enweghị ume nke
na o weghị ndị ọkaikpe Nkeji 120 ịkụchapụ
ya n’akụkụ.
Ndi 'bandits' jizi anyị mere ohu - Ndị bi na Katsina
Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị mmadụ bi n'okpuru ọchịchị Faskari na Katsina steeti ekwuola na ha nọ na nnukwu nhịahụ n'ihi ndị ekperima 'bandits' weghaara ọnọdụ na mpaghara ahụ ma werezie ha bụ ndị bi ebe ahụ mere ohu.
Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Hausa na ndị ekperima ahụ weghaara ala ubi ha niile ma na-amanye ndị mmadụ ka ha na-arụrụ ha ọrụ n'ubi ha.
"Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na ndị ekperima ewerela ọnọdụ n'ụlọakwụkwọ praịmarị dị na Kogo. Ndị mmadụ na-ebugara ha nri ebe ahụ, ha hụ nwa agbọghọ dị ha mma, ha akpọrọ, onye kwuo okwu, ha egbuo ya."
Onye a kwuru na obodo dị icheiche n'okpuru ọchịchị ahụ nke gụnyere: Birnin Kogo, Yar-tsamiya, Kahi, Fankama, Hayin Dungu na Gobirawa, nọcha n'aka ndị ekperima bụ ndị weghaara ọnọdụ ebe ndị ahụ ma na-emekpa ndị mmadụ ahụ.
"Ọtụtụ ndị obodo ahụ agbaala ọsọ ndụ ga biri n'ụlọ ebe ndị gbara ọsọ ndụ, mana ụfọdụ n'ime ha enweghị ike ịnọ ebe ahụ n'ihi oke nhịahụ dị ya, ha wee lọghachite n'ụlọ ha n'agbanyeghị ihe ha na-agabiga n'aka ndị ekperima," onye ahụ kwuru.
Nasir Mu'azu bụ kọmishọna nchekwa nke Katsina Steeti kwuru na gọọmentị nwere nnukwu mwute maka ihe a na-emenụ, mana gọvanọ steeti ahụ bụ Dikko Umar Radda na-agbasi mbọ ike ichekwa ndụ ndị mmadụ, nakwa ilekọta ndị gbapụrụ n'ụlọ ha n'ihi mwakpo ndị ekperima.
Ndị uweojii ahụla ozu nwoke gbagburu mmadụ 18 na Maine, mba Amerịka
Ebe foto si, Androscoggin County Police
Achọtala ozu otu nwoke a na-enyo enyo maka iji egbe gbagbuo mmadụ 18 na steeti Maine na mba Amerịka n'ụbọchị Wenezde, dịka ndị uweojii mba ahụ chọrọ ya ihe karịrị abalị abụọ.
Kọmishọna nchekwa ọha na steeti Maine, bụ Michael Sauschuck kwuru na ha hụrụ na ihe gburu nwoke ahụ bụ mgbọ egbe nke o ji aka ya gbaa onwe ya.
Onyeisi ndị uweojii nke Androscoggin County kwuru na ha hụrụ ozu nwoke ahụ na Lisbon, na nso ebe ọ nọ gbagbuo ọtụtụ mmadụ.
Ndị uweojii ewepụla iwu mmachi mkpagharị ha tinyeburu dịka a na-achọ nwoke ahụ achọ.
Ebe foto si, Reuters
"Steeti Maine ga-ekutu ume ndụ ugbua n'ihi mbọ nke ọtụtụ mmadụ gbara iji chọta onye ogbu mmadụ a," Sinetọ na-anọchite mpaghara Maine, bụ Susan Collins kwuru.
N'akwụkwọ ozi nkeonyeisiala Joe Biden wepụtara, o kwuru na ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ezinụlọ n'Amerịka nọkwa n'iru uju ọzọ n'ihi mwakpo onye oji egbe.
Ọ kpọkuru ndị omeiwu nke pati Republican ka ha rụọ ọrụ dịịrị ha ma tinye iwu ga-eme ka o siwanye ike mmadụ inweta egbe.
Ọkaikpe na-ala ezụmịke nka akatọọla etu e si hazi mkpokọba ndị ọkaikpe ikpe ntụlịaka 2023.
Ebe foto si, NJC
Otu ọkaikpe na-alara ezụmike nka bụ Dattijo Mohammad ekwụola na
otu e siri kpọkọta ndi okaikpe kpere ikpe ntụlịaka onyeisiala Niajịrịa abụghị
otu osị kwesị ịdị.
O kwuru nke a n’emume nadụmma e meere ya n’Abuja.
Dattijo kwuru na ịke e nyere ọkaịkpe kachasị n’Naijrịa bụ
Olukayode Ariwoola ekwesịghị idị otu ahụ.
O kwuru na ndi okaikpe asaa kpere ikpe
megidere okwu Peter Obi na Atiku ezụghị oke dịka ufodụ mpaghara Niajịria enweghị ọkaịkpe
nọchitere anya ha, dịka iwu Naijiria si dị.
Dịka o siri kọwaa, n’ime mpaghara isii e nwere na Najịrịa, nanị mpaghara Saụt-saụt,mpagharị ndịda ugwu na mpaghara Ọwuwa Anyawu Ugwu nwere ndị nọchịrị anya
ha n’ndi ọkaịkpe kpere ịkpe ntụlịaka onyeisiala.
O kwuru na ebe o si kara njo bụ na onye nọchịrị anya mpaghara Ọwụwa Anyawụ bụ Centus Nweze nwụrụ n' onwa Jụlai, onye nọchịrị anya mpaghara Etiti Ugwu(north-Central) bụ ya onwe ya bụ Mohammad na-ala ezụmịke nka nke pụtara na mpaghara abụọ a
enweghị onye na-ekwuru ha ugbua.
Dịka o siri kwu, ihe nile a bụ nkata akparaakpa nke sitere
n’oke ike e nyere Ọkaikpe kachasị n’Najịrịa.
‘’Ihu na e kpere ikpe zịrị ezị bido n’ụlọịkpe okpuru,
mpaghara isii e nwere n’Naijịrịa kwesiri ị so gee ntị n’ikpe ọkwa ntụlịaka onyeịsiala
Niajịrịa’.’
‘’Ọ bụ ihe ọjoo nyere ọchịchị onyekwuoucheya
na-agụpụrụ mpaghara abụọ n’ikpe metụtara mmadu nịle na Naijịrịa.’’
Cheta na e mere Jọstis Dattijio Mohammad,Onye Niger Steeti ọkaikpe nke Ụlọikpe Kachasị nke Naijiria n'ọnwa Julai afọ 2012.
A gara n'ihu mee ya osote Onyeisioche otu 'National Judicial Council' n'ọnwa Juun afọ 2022.
Ọ bụghị ndị ụlọikpe ka ọ dịịrị ikwu onye meriri ntuliaka - Femi Falana
Ebe foto si, Falzthebadguy/Instagram
Okaiwu na-ahụ maka ikike ruru onye bụ Femi Falana ekwuola na ọ bụghị ụlọikpe kachasị ka ọ dịịrị ikwu onye meriri na ntuliaka.
Falana gwara ụlọ ntaakụkọ Channels nke a ma kwuo na ikike ahụ bụ naanị Inec ka ọ dịịrị maọbụrụ na e mere ihe etu e si kwesi.
"Ọ bụ eziokwu na mkpebi ụlọikpe kachasị jigidere ma kwado mpụtara ntuliaka mere na Febrụwarị afọ a, mana ọ bụghị mbinye aka ndị ụlọikpe n'atụmatụ Inec ji hazie ntuliaka ahụ ka ọ bụ" ka Falana kwuru.
"Ihe m na-ekwu bụ na ewezuga mkpebi ụlọikpe kachasị, o doro anya na Naijiria ka nwere nnukwu ọrụ ịrụ iji hazie ntuliaka kwụ ọtọ nke enweghị mgbagha, nke mmadụ niile tụkwasịrị obi na ya mana ọ ka toro anyị aka n'agbanyeghị mkpebi ahụ"
"Ụlọikpe kachasị ekpebiela ya bụ ntuliaka mana o kwesighi. Ntuliaka ahụ kwesịrị ibi na Febrụwarị. Ọ bụghị ndị ụlọikpe ka ọ dịịrị ikwu ndị meriri ntuliaka hoo haa" ka o kwuru.
Ihe karịrị ụmụaka dị 2000,000 gabigara mmetọ n'aka ndị ụkọchụkwu
Katolik na mba spen.
Otu kwụrụ onwe ya
chọpụtara nke a na nnyocha ha mere katọrọ ụka Katolik maka ịgba nkịtị ewu amụọ
n'ọgbụrị maọbụ ịgọ na mmetọ emeghị
Na nnyocha ahụ nke ụlọomeiwu Spen nyere ntuziaka ka eme, Angel
Gabilondo kwuru na ndị mkpamkpa gara n'ihu sị, Ihe nwenwuru ike ime n'ihi na
Ụka gbara nkịtị"
Na nnyocha ahụ nke ha gbara mmadụ 800,000 ajụjụọnụ, pasent 0.06
kwuru na ha gabigara mmetọ n'aka ụkọchukwu.
Unụ asaala chi?
Igbo, ndị ọma anyị ji eme ọnụ, ụnụ asaaala chi?
Bia soro anyị ebe a maka akụkọ dị mkpa.
Onye e gburu n’Aba abụghị onye uweojii, ọ bụ onye 'vigilantee' - Abia PPRO
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii
Abia Steeti ekwuola na ọ bụghị onye ọrụ ha ka e gburu n’Aba kama na ọ bụ onye
nchekwa ụkpọrọ ‘vigilantee’.
Nke a dị n’ozi
ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Maureen Chinaka wepụtara n’ụbọchị Fraịde, 27 Ọktoba
2023.
Chinaka kwuru
na ha nwetere ozi banyere ndị ọrụ nchekwa a wakporo n’obodo Isiahia Umuojima dị
n’Osisioma Aba. Na ndị a wakporo gụnyere otu onye uweojii, otu onye ọrụ pụrụiche
na ndị nche vigilantee atọ.
“Mgbe ndị ọrụ
anyị ruru ebe ahụ, na ha hụrụ ụgbọala Sienna ndị ọrụ nchekwa a ji nakwa ozu otu
onye e bepụrụ isi ya. Site na nyocha e mere gosiri na onye ahụ e gburu ma bepụ
isi bụ Obinna Ndukwe e ji Socket maara, bụ otu n’ime ndị ọrụ nchekwa ‘Abia
State Vigilantee’ ya na ndị uweojii na-arụkọ ọrụ.”
Chinaka kwuru
na e burula ozu onye ahụ gawa n’ụlọozu.
“Anyị chọrọ
ime ka o doo anya na o nweghi onye uweojii ọbụla e gburu na mwakpo ahụ.”
O kwuru na
ndị ọrụ ha enwetela ụgbọala ndị ojiegbe jiri wakpoo ndị ọrụ nchekwa ahụ na ha
na-agba mbọ ịnwụchi ndị a.
Ọ gara n’ihu
rịọ ka ndị bi n’obodo dere jụụ ma na-aga mkpa dịịrị ha.
Ọchịchọ onye ojiegbe wakporo Maine abaala ụbọchị abụọ n'Amerịka
Ebe foto si, Reuters
Taa mere ye ụbochị nke abụọ ndi uweojii nke mba Amerịka bidoro ịchọ ekperima gbara egbe gburu mmadu 18, merụọ mmadụ 13 ahụ n’Maine dị na Lewiston US.
Ndị ụweojii adọọla ndị mmadu aka n’ntịn,ha gwara ha nọgịde n’ụlọ ha maka ọdimma na nchekwa ha, n’ihị na eperima ahụ ana achọachọ kwesiri ka atụọ ya egwu.
Na abalị tọsde,ndi uweojii gbakọrọ n’otu ụlọ dị na Bowdoin,ulọ ahu dị nso n’Lewiston ebe agbara egbe abali garaaga.
Ha kwuru na ha enwetela ịkịkere ị baenye ebe dị ịheịche ị chọ onye gbara egbe ahu.
E nwere mkpọtụ anuru n’ogbe mere ndi uweojii jiri chee na-ọbu eperima ahu, ha bidoro tịbe-mkpụ sị ya pụta nyefee onweya, ka ha mechara nke a, onweghị onye ha hụrụ, ha mechara laba.
O dobeghi anya ihe kpatara ndi uweojii jiri mee ihe ha mere ,mana otu onye na ekwuru otụ na-ahu maka nchekwa obodo Maine kwuru na ndi uweojii mere ihe ha kwesịri ịme iji hụ na ha mere nyocha pụrụiche ga enyere ha aka ị wụchị eperima ahu ana enyoncha bụ Card’’