Liberia Election: George Weah chọrọ ohere ọzọ n'agbanyeghị nsogbu juru Liberia

A man in Liberia wearing face paint and sunglasses with "vote" written on his forehead

Ebe foto si, EPA

    • Onye dere ya, Azeezat Olaoluwa & Yūsuf Akínpẹ̀lú
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Monrovia

George Weah, bụbu ọgba bọọlụ a ma ama, na-azọ ọkwa onyeisiala mba Liberia nke ugboro abụọ, mana ọ dịka ka o jirili aka ya nye onwe ya goolu dịka ọ jụrụ ime ihe nke ọtụtụ mmadụ kpụ n’ọnụ nke bụ ihibe ụlọikpe a kpọrọ ‘economic and war crimes court’.

Weah, onye dị afọ 57, meriri ọchịchị dịka o kwere nkwa ikepụta ọrụ, ịgbanwe ndụ ndị mmadụ, na ihibe ụlọikpe ahụ. Mana dịka e duchara ya n’iyi ọrụ n’afọ 2018, o kwuru na ileghachi anya azụ na mpụ e mere n’oge gara aga abụghị ụzọ kacha mma iji gaa n’ihu.

Ọtụtụ ndị ntorobịa, dịka Frederick Tulay dị afọ 24, anabataghị nke a.

“Dịka onye na-atụ vootu nke mbụ n’afọ 2017, e kwenyere m n’onyeisiala Weah. Mana o meghị ihe ọbụla iji kwụsị nrụrụaka n’ọrụ gọmentị. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-aṅụ ọgwụike ugbua n’ihi na ha enweghị ọrụ,” Tulay gwara BBC. O kwukwara na ya agaghị atụnyere Weah na pati ya bụ Congress for Democratic Change (CDC) na ntuliaka a.

 Frederick Tulay

Ebe foto si, FREDERICK TULAY

Nkọwa foto, Frederick Tulay, onye tunyeere George Weah vootu na ntuliaka gara aga sị na onyeisiala ahụ gharịpụrụ ya.

Mazị Tulay na-arụbu ọrụ n’ụlọọrụ na-arụ ụlọ, mana a chụrụ ya n’ọrụ n’afọ abụọ gara aga dịka ndị ụlọọrụ ya enwekwaghị ike ịkwụ ya ụgwọ ọnwa. Ugbua, ọ bụ onye ọkwọ ụgbọala, mana ọrụ a anaghị agara ya nke ọma: “Okporoụzọ jọrọ njọ, mmanụ ụgbọala na-ada oke ọnụ. Ebumnobi m bụ ịhapụ obodo a.”

Okwu ya gospụtara iwe na-ewe ọtụtụ mmadụ - na afọ 20 agafeela kamgbe a lụchara agha abụọ na mba ahụ, nke ihe ruru mmadụ 250,000 nwụrụ na ya, ọtụtụ ka na-adọlị ndọlị n’ibi ndụ ha.

Mba ahụ nwere ego abụọ e ji azụ ahịa na ya, nke pụtara na ndị a na-akwụ ụgwọ na dọla nke Liberia na-eji ego dọla nke mba Amerịka azụta nri na ihe ndị ọzọ si mba ofesi – nke mere ibi ndụ ji dị oke ọnụ. Enwekwaala akụkọ nrụrụaka ego abụọ na mba ahụ n’ime afọ olemole nke tụrụ ndị mmadụ n’anya, mee ka mba Amerịka nye ọtụtụ ndị ọchịchị Liberia ntaramahụhụ, tinyere onyeisi ndị ọrụ George Weah.

Peterson Sonyah dị afọ 49 kwuru na ihe ndị a emeela ka nrụrụaka dịzie ka omenala na mba Liberia.

Sonyah, onye lanahụrụ otu mwakpo e mere n’otu ụlọụka na Monrovia n’oge agha, kwuru na ya esonyerela otu ndị na-akpọ oku ka ndị aka ha dị n’agha ahụ nakwa ndị si n’agha ahụ baa ọgaranya, zute ikpe ziri ezi.

Oge ọ dị naanị afọ 16, ọ gbara ọsọ ndụ gbaga n’otu ụlọụka, ya na nna ya, bụ onye so na mmadụ ruru 600 ndị agha gburu n’afọ 1990.

“Oge mgbọ ndị agha ahụ gwụrụ, ụfọdụ n’ime ha gara iwetakwu mgbọ, nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji chọọ ịgbalaga, mana ndị agha ahụ ji mma gbukasịwa ndị mmadụ,” ka o kwuru dịka ọ na-atụ aka n’ohere mgbọegbe dị na windo ụlọụka ‘St Peter’s Lutheran Church.

Peterson Sonyah in St Peter's Lutheran Church in Monrovia, Liberia

Ebe foto si, BBC/GIFT UFUOMA

Nkọwa foto, Peterson Sonyah kwuru na ịlọghachi n'ụlọụka St Peter's Lutheran Church na-echetara ya ọtụtụihe mere ya n'oge agha.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ dị mkpa ka e nwee ụlọikpe, ka o kwuru: “ụfọdụ amalitela ikwu na ọ bụrụ na agaghị enwe ikpe ziri ezi, ka anyị onwe anyị buru egbe ma busokwa ndị nke ọzọ ahụ agha.”

“Ha kwenyere na ọ bụrụ na anyị mee otu a, n’ọdịnihu, anyị ga-enweta ezigbo ọrụ ma nwee ezi ndụ. Anyị niile bụcha mmadụ, onye ọbụla na-enwe ọnwụnwa.”

Mmadụ 19 ọzọ na-ama Weah aka n’ihu maka ọkwa onyeisiala ahụ na ntuliaka a ga-eme n’ụbọchị Tuzde. Nke a gụnyere Joseph Boakai, bụbu osote onyeisiala; Alexander Cummings bụ onye oji ego achụ ego; na Tiawan Gongloe, bụ ọkaiwu na-agba mbọ maka ikike dịịrị mmadụ.

Mmadụ atọ a ekwela nkwa ihibe ụlọikpe a ma ha merie ntuliaka – mana ụfọdụ na-ekwu na ha atụkwasịghị okwu Boakai obi, n’ihi mmekọrịta ya na Prince Yormie Johnson, onye bụbu ọchịagha a ma ama, ma na-arụ ọrụ ugbua dịka sinetọ.

Otu n’ime ndị kacha akpọ oku ka e hibe ụlọikpe bụ Yekeh Kolubah, bụbu onyeagha nwata, nke e dubanyere n’ọgụ n’afọ 1990 n’otu ndị ọgụ nnupuisi nke Charles Taylor bụ ‘NPLF’, mana ugbua ọ bụ onye omeiwu na-anọchite mpaghara Montserrado.

Ọ chọrọ ka ndị niile aka ha dị n’agha ahụ zute ikpe ziri ezi, tinyere ya onwe ya.

“Anyị chọrọ ụlọikpe a bụ ‘economic war crimes court’... maka na achọrọ m ịga ebe ahụ ga zara ọnụ m. Ka ndị mmadụ mara ihe ọjọọ m merela, ka m nwetakwa ntaramahụhụ maka ya.”

Dịka mazi Sonyah, o kwenyere na ụlọikpe ahụ ga-enye ohere ka Liberia gaa n’ihu ma nweta ọgwụgwọ: “Ọ bụrụ na anyị emeghị ya, ihe ọ pụtara bụ na-anyị ka na-akwado agha. Ihe mere anyị ji akpa agwa aghara bụ maka na anyị enwetabeghị ntaramahụhụ maka ya.

“Ọ bụrụ na m gaa mkpọrọ maka imekpandị mmadụ ahụ, maka igbu mmadụ, I chere na m ka ga-ebu egbe ọzọ?”

Iwe na-ewe ya maka ụfọdụ oge a gbalịrị ime ya ka o mechie ọnụ site n’ikwe ya nkwa ọkwa dị elu na kọmiti dị icheiche n’ụlọ omeiwu.

Mịnịsta mgbasaozi bụ Ledgerhood Rennie gwara BBC na onyeisiala agaghị enye asịsa ọbụla maka ụdị ebubo ahụ, dịka o kwuru na Kolubah bụ “onye isi mgbaka a ma ama maka ikwu ihe enweghị isi”.

Osote Mịnịsta na-ahụ maka ego rụtụrụ aka na mkpebi ikpeazụ gbasara ihibe ụlọikpe ga-eleba anya na mpụ e mere n’oge agha bụ ndị omeiwu ka ọ dị n’aka.

“Ndị mmadụ kwesịrị ịgwa ndị na-anọchite ha n’ụlọ omeiwu ka ha mee ka okwu ahụ bụrụ ihe kacha mkpa ma gbadosie ụkwụ ike na ya,: Samora Wolokolie gwara BBC.

Rennie kwuru na ya bụ okwu nwereike ịbụ ihe a ga-emere ntuliaka ‘referendum’.

A woman walks past a campaign billboard for the President of Liberia George Weah in Monrovia

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị nkwado onyeisiala Weah kwuru na ọ chịkọtara mba ahụ nke ọma n’oge ọdachi ọrịa Covid bịara.

Mana otu ‘Global Justice and Research Project’ (GJRP), bụ ndị na-edekọ ihe akaebe maka mpụ e mere n’oge agha, kwenyere na gọọmentị enweghị mmasị ọbụla ime ihe ndị a.

Onyeisi otu ahụ bụ Hassan Bility kwuru na akwụkwọ ozi nke ihe karịrị ọkara ndị omeiwu binyere aka na ya, tinyere Kolubah, iji kpọọ oku ka e kwulite okwu ahụ n’ụlọ omeiwu, dara ada ugboro abụọ.

“Udo dị na Liberia ugbua, ekwenyeghị m na ọ ga-adịgide maka na enweghị ihe e tinyere iji gbochie agha ịda ọzọ,” Bility gwara BBC.

Ntuliaka a ga-abụ nke mbụ kamgbe kamgbe ndị ọrụ nchekwa UN pụrụ na mba Liberia. Ha nọbu na mba ahụ kamgbe afọ 2003 bụ oge agha kwụsịrị.

Mazi Wolokolie kwuru na e kwesịrị ịja Onyeisiala Weah mma maka etu o si chịkọta mba ahụ n’oge ọdachi Covid-19 ma kepụta ọtụtụ ọrụ na ngalaba gọọmentị.

Ndị nkwado ya na-ajakwa ya mma maka ịrụ ọtụtụ okporoụzọ na mpaghara dị icheiche na mba ahụ n’ime afọ isii gara aga – o kwuburu na ọ bụ ya bụ ọgwụ nke e ji agwọ ajọ okporoụzọ, nke a mere ọtụtụ ji akpọ ya “ọgwụ na-agwọ ajọ okporoụzọ”.

Weah, bụ naanị onye Afrịka nwetarala nturuugo onye kacha agba bọọlụ n’ụwa, ka nwekwara ọtụtụ ndị na-abịa enye ya nkwado n’ọgbakọ achụmnta vootu ya. Ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ya n’isi obodo Liberia.

WLEH POTEE

Ebe foto si, MOSES GARZEAWU

Nkọwa foto, Wleh Potee, onye nkwado Onyeisiala Weah, kwuru na ọgbaaghara na Liberia gbochitụrụ agụmakwụkwọ ya.

Wleh Potee, onye nkwado onyeisisla na-ere elekere aka na ugogbo anya na Monrovia, kwuru na ndakpọ akụnụba abụghị naanị na Liberia ka ọ na-eme. O kwuru na ọ bụ eziokwu na ya anaghị ree ọtụtụ ngwaahịa ya, mana ya na ndị ahịa ibe ya nwere obi ụtọ n’ebe onyeisiala nọ.

“N’oge gara aga, ndị uweojii na-ebukọrọ ngwaahịa anyị, anyị emefuo nnukwu ego iji nwetaghachi ha. Mana n’ọchịchị a, ndị uweojii anaghịkwa enye anyị nsogbu. Nke a mere anyị ji enwe obi ruru ala n’agbanyeghị obere ego anyị na-enweta.”

Ọtụtụ kwukwara na ndị mmadụ enwewanyela ohere ikwu uche ha n’ọchịchị Weah, n’agbanyeghịkwa na otu UN katọrọ mwakpo a wakporo ụfọdụ ndị ntaakụkọ dịka a na-akwado ntuliaka.

Mana nwa amadi ahụ dị afọ 46, onye nwetakwara ọzụzụ dịka ‘accountant’, kwukwara na ya na-akwado ka e hibe ụlọikpe, ma kọwaa na ya gaara inwetela nzere ‘doctorate’ ya ugbua ma e wepụ agha ahụ: “Ka e hibe ụlọikpe ahụ ma kwụgbuo ha niile.”

Sonyah nwere olileanya na onye ọbụla meriri ọkwa onyeisiala ga-ege ntị n’ihe ndị mmadụ chọrọ nakwa ihe ndị omeiwu na-ekwu, ma nye nkwado ka e kpee ndị mere arụ n’oge gara aga ikpe ma taa ha ahụhụ, iji nweta ọdịnihu ka mma, na-enweghị nrụrụaka, maka Liberia.

“Udo na-enweghị ikpe ziri ezi dịka ‘tea’ na-enweghị ‘sugar,” ka o kwuru.