Lee ọtụtụ olulu 'Tunnel' ndị otu Hamas gwuru ebe ha si ebuso Israel agha

Tunnel dị na Gaza

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị isi Hamas na Gaza ekwubuola na ha nwere kilomita 'tunnel' ruru narị ise

Israel ekwuola na ha na ebe ha kacha atụ ogbunigwe ugbua bụ na mpaghara dị icheiche ebe ndị otu Hamaz gwuru ọtụtụ olulu 'tunnel' na Gaza Strip ebe ha si ebuso Israel agha.

Nke a na-abịa dịka otu Hamas, bụ ndị otu oyi egwu dị na mba Palestine, wakporo Israel ma buso ha agha n'ụdị ahụbeghị atụ ya mbụ n'ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Ọktoba.

"Chee maka Gaza Strip dịka mpaghara nwere ngalaba abụọ. Otu ngalaba bụ maka ndị nkịtị, ngalaba nke ọzọ dị n'okpuru ala bụ maka Hamas. Ọ bụ ngalaba nke abụọ a Hamas rụrụ ka anyị na-achị ịla n'iyi," ọnụ na-ekwuru ndị agha Israel kwuru n'ihe onyonyo n'ụbọchị Tọzde.

"Ebe a abụghị 'bunker' ebe ndị nkịtị na-agbaba izere mgbọ. Ọ bụ naanị maka ndị Hamas na ndị otu ekperima ndị ọzọ ka ha si ebe ahụ na-atụ Israel Ogbunigwe, nakwa na-ahazi atụmatụ ha iji wakpo Israel."

N'ọgụ mba Israel na Hamas n'afọ 2021, ndị agha Israel kwuru na ha mebiri ihe ruru otu narị kilomita nke 'tunnel' Hamas, mana ndị ọgụ Hamas kwuru na ogologo 'tunell' ha karịrị kilomita narị ise, mana ọ bụ naanị pasentị ise nke a ka Israel mebiri.

Iji kọwaa ya nke ọma, okporo ụgbọ oloko 'London Underground' dị kilomita narị anọ n'ogologo.

E bidoro igwu 'tunnel' na Gaza tupu ndị agha Israel esi na mpaghara ahụ pụọ na 2005.

Mana ọ gara n'ihu nke ukwuu dịka Hamas weghaara ọchịchị na mpaghara ahụ na 2007, nke mere Israel na Egypt ji bido ịmachi mbubata ngwaahịa na ngafe ndị mmadụ n'ihi nchekwa.

N'oge ahụ, akụkọ kwuru na e nwere ihe ruru 'tunnel' 2,500 n'okpuru okeala Egypt ebe Hamas na ndị ọgụ ndị ọzọ si ebubata ngwaahịa, mmanụ ụgbọala nakwa ngwa ọgụ.

Hamas na ndị ọgụ ndị ọzọ bidokwara igwu 'tunnel' iji wakpo ndị agha Israel. Na 2006 ha si n'otu n'ime olulu dị otu a wakpo okeala Israel, gbuo ndị agha abụọ ma jichikwaa otu ọzọ aha ya bụ Gilad Shalit, bụ onye ha jidere ruo afọ ise.

Tunnel

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E gwuru 'tunnel' n'okpuru okeala Egypt iji si ebe ahụ na-ebubata ibu na ngwaọgụ

N'afọ 2013, ndị agha Israel chọpụtara otu 'tunnel' ogologo ya dị kilomita 1.6, ụmi ya ruru mita 18, nke si na 'Gaza strip' ruo n'ala dị nso na mpaghara Kibbutz. dịka ndị mmadụ sị na ha nụrụ ụda gbara ha gharịị n'ime ala.

"Tunnel ndị a gafere okeala anaghị esi ike nke ukwu. Naanị mbunuche ndị rụrụ ya bụ iji ya wakpo mba Israel," Daphné Richemond-Barak, bụ ọkammụta na-akụzi na mahadum Reichman nke mba Israel, kwuru.

"Mana 'tunnel' ndị nke dị na Gaza dị iche, maka na Hamas na-eji ha eme ihe kwa mgbe kwa mgbe. Ọ bụ ebe ha na-anọsapụ ahụ ma nọkwaa ogologo oge. A rụsiri ha ike."

"Ndị isi Hamas na-ezo ebe ahụ. Ha nwere ụlọọrụ na ngalaba dị icheiche n'ime ebe ahụ Ha na-esi ya eme njem sikwa na ya na-ezikọrịta ozi. Ha nwere ọkụ latrik na okporo ụgbọ oloko. I nwereike ịkpagharị n'ime ebe ahụ maọbụ kwụrụ ọtọ."

Gaza

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụlọ atọ dakpọrọ na Gaza n'afọ 2021 dịka Israel tụrụ ogbunigwe na 'tunnel' dị ha nso
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọkammụta Daphné Richemond-Barak, kwuru na Hamas mụtara nke ọma etu e si egwu olulu 'tunnel' site n'aka ndị otu ọgụ ndị ọzọ dịka ndị ọgụ nnupuisi nke Aleppo na mba Syria, na ndị ọgụ alakụba Islamic State na Mosul.

A na-eche na 'tunnel' ndị dị na Gaza na-emi emi ruo mita 30 (maọbụ 100 ft). Ebe e si abanye ha na-abụkarị n'ụlọ dị icheiche dịka 'mosque', ụlọakwụkwọ, ụlọ obibi ndị mmadụ, dgz.

Otu ndị agha Israel na-ebo ebubo na Hamas na-ewere ego enyemaka nke mba dị icheiche na-enye ndị Gaza, nakwa 'cement' nke e kwesịrị iji rụgharịa ụlọ ndị e mebiri n'oge agha, jiri ya na-egwu tunnel ndị a.

Mana dịka narị kwuru narị ndị agha Israel na-akwado ịwakpo mpaghara Gaza, ọkammụta Richemond-Barak kwuru na ọ gaghị ebụcha ihe ga-ekwe omume imebicha 'tunnel niile dị na Gaza.

"A ga-enwe mpaghara ebe ahụ ebe ndị nkịtị agaghị ekwe ịpụ. Ụfọdụ 'tunnel' ndị a bụ ndị mmadụ amaghị ebe ha dị. Ọzọ kwa bụ na ndị ga-anwụ na ya ga-akarị akarị, ma ndị nkịtị ma ndị agha."