Liberia akpọpụtala Joseph Boakai dịka onyeisiala ọhụrụ

Liberia akpọpụtala Joseph Boaki dịka onyeisiala ọhụrụ

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Liberia akpọpụtala Joseph Boaki dịka onyeisiala ọhụrụ

Liberia akpọpụtala Joseph Boakai dịka onyeisiala ọhụrụ mba ha, nke a na-eme n’ụbọchị Monde.

Boakai gbara afọ iri asaa na itolu, ji obere ihe merịe onye chịbụrụ Liberia bụ George Weah n’ntụrịaka emere n’Nọvemba 2023.

Boakai ga abụ onyeisiala Liberia kachasị mee ọkenye, ọ ga achị ha afọ isii.

George Weah na Joseph Boakai

Ebe foto si, AFP/Reuters

Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah akpọọla onye ya na ya zọrọ ya bụ ọkwa na ntuliaka bụ Joseph Boakai ma kelee ya maka imeri ya bụ ntuliaka.

N'ozi o gbasara dịka ngụko ntuliaka na-apịachi o sị "ndị Liberia ekwuola okwu, anyị anụla olu ha."

Boakai ji vootu ruru 28,00 nọrọ n'ọkwa mbụ na ntuliaka ahụ dịka o fọro obere ka agụchaa vootu niile.

Onyeisiala Weah nọ n'ọkwa ahụ kemgbe afọ 2018. Ọ ga-enyefe ọchịchị n'ọnwa Jenụwarị afọ 2024.

Mgbe ọ banyere n'ọchịchị ndị mmadụ, ọ kachasị ndị ntorọbịa na-atụ anya na ọ ga-eme ebumnuche ha, ọ bụkwa Boakai ka o meriri.

Mana ugbua ndị mmadụ kwenyere na ọ dara n'ịlụso mpụ ọgụ maọbụ zọọ akụnaụba obodo ha.

Onye na-agba egwu

A malitere ntuliaka pụrụiche bụ 'run-off' mgbe o doro anya na o nweghi onye n'ime mmadụ abụọ ahụ bụ Boakai na Weah nwetara ihe karịrị pasentị 50 na ntuliaika dịka iwu ala ha si nye.

Na ntuliaka ahụ, Weah nọ n'ihu dịka o ji vootu 7,000 gafee Boakai ebe mmadụ iri na asatọ ndị ọzọ so zọ ya bụ ọkwa.

Nke a bụ ntuliaka kachaa dị mkpa kemgbe alụchara agha imeụlọ na mba ahụ.

Boakai na-ekwu na ọ ga-azọpụta mba ahụ n'ọchịchị ọjọọ bụ ihe ọ kpọrọ ọchịchị Weah.

Onye Liberia na-atụ vootu

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụafọ Liberia apụtawala ịtụ vootu na ntuliaka onyeisiala nke onye ọgbaboolu a ma ama bụ George Weah, nwere ohere ịlaghachi azụ nke ugboro abụọ ya.

Onye kachasị nwe agba na ndị ya na Weah gbara afọ 57 na-azọ ọkwa ahụ bụ Joseph Boakai, agbara 78, bụ onye bụbụ Osote Onyeisiala.

N'ozi achụmta vootu ya, okwu Boakai kpụ n'ọnụ bụ "Mgbapụta" dịka ọ kwuru na mba ahụ dị n'Ọdịda Anyanwụ Afrika na-akụda akụda kemgbe afọ isi Weah nọ n'ọnwa.

George Weah
Nkọwa foto, Oge Onyeisiala George Weah tụrụ vootu ya

Mana Weah kwenyesiri ike na ọ ga-enwe mmeri dịka ọ kwuru na o wetara udo ma kwalite agụmakwụkwọ.

Nke a bụ mbụ ndị na-eto eto bụ ndị a mụrụ ka a lụchara agha Liberia ga-atụ vootu.

Agha Liberia nke tara isi ihe ruru mmadụ 250,000 biri afọ 20 gara aga.