Maada Bio emeriela ntuliaka onyeisiala mba Sierra Leone nke ugboro abụọ

Maada Bio

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Sierra Leone bụ Julius Maada Bio enwetala mmeri na ntuliaka ọkwa onyeisiala mba ahụ bụ nke e mere n'ụbọchị Satọde, Jun 24, 2023.

Ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ 'Electoral Commission of Sierra Leone' kpọpụtara na Bio nke 'Sierra Leone Peoples Party (SLPP) nwetara vootu 1,566,932, nke bụ pasentị 56 na ụma nke vootu niile a tụrụ na ntuliaka ahụ.

Onye gbara onye nke abụọ bụ Samura Kamara nke 'All Peoples Congress' (APC) nwetara vootu 1,148,262 nke bụ pasentị 41 na ụma nke vootu niile a tụrụ.

Dịka iwu si dị, mmadụ ga-enwetarịrị vootu gafere pasentị 55 iji bụrụ onyeisiala, ma ọ bụghị ya a ga-enwe agba nke abụọ nke ntuliaka ahụ.

Mana nke a na-abịa dịka ndị otu nlekọta ntuliaka dị icheiche nke gụnyere ndị 'European Union' nakwa 'Commonwealth' kwuru na ntuliaka ahụ nwere ụfọdụ nrụrụaka, ma bụrụkwa nke ọgbaghara dị icheiche dị na ya.

Ndị APC boro ebubo na ndị ọrụ nchekwa gbara egbe n'ogige isi ụlọọrụ ha oge Mazi Kamara na-agwa ndị ntaakụkọ okwu ebe ahụ n'ụbọchị Sọnde.

Kamara bokwara ebubo na e nwere izu ohi vootu nakwa ịkpachị ndị mmadụ ịtụ vootu na mpaghara ụfọdụ.

Mana ụlọọrụ ECSL kwuru na ha tinyere atụmatụ dị icheiche iji gbochie nrụrụaka na ntuliaka ahụ.

Pasentị vootu ha nwetere na ntuliaka

Lee etu ndị nkwado Maada Bio si enwe aṅụrị dịka o meriri ntuliaka

Dịka a kpọpụtara mmeri Bio, ndị nkwado ya na mpaghara dị icheiche na Sierra Leone malitere inwe aṅụrị ma na-agbagharị ebe niile iji gosipụta obi ụtọ ha.

Lee ụfọdụ foto etu ndị nkwado Bio si ṅụrịa maka mmeri a:

Maada Bio
Sierra Leone
Sierra Leone

Ihe dị mkpa maka Maada Bio?

Maada Bio
  • A mụrụ Julius Maada Bio n'ụbọchị 12 nke ọnwa Mee 1964 n'obodo Sogbini nke dị na mpaghara Bon.
  • Ọ bụbu ọchịagha onye rutere n'ọkwa 'Brigadier General' n'otu ndị agha mba Sierra Leone
  • Ọ rụburu ọrụ dịka Mịnịsta mgbasaozi nke Sierra Leone
  • N'ọchịchị steeti, Bio arụbuola ọrụ dịka odeakwụkwọ lekọtara ngalaba mgbasaozi, egwuregwu nakwa ọrụ obodo, nakwa ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ o jirila
  • O meriri ọkwa onyeisiala nke mbụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Maachị afọ 2018
  • Bio lụrụ otu nwaanyị ma mụọ ụmụ anọ

Sierra Leone election: Ndị mba Sierra Leone chị obi n'aka eche mpụtara ntuliaka

Ntuliaka ndị Sierra Leone
Nkọwa foto, Ọnụọgụgụ ndị pụtara sonye na ntuliaka mba Sierra Leone nke afọ a riri elu.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị mba Sierra Leone na-echezi mpụtara ntuliaka 2023 bụ nke so achụmnta vootu ọtụtụ tigbuo zọgbuo dapụtara n’ime ya.

Ọnụọgụgụ ndị pụtara tụọ vootu na ntuliaka a riri elu, dịka ndị pụtara ịtụ vootu gwara BBC na usoro ahụ gara nke ọma n'agbanyeghị na ebe ọgbọ ntuliaka ọtụtụ emepeghị n’oge.

Otu n’ime ihe chere ndị mmadụ echiche tupu ntuliaka ahụ amalite bụ na ọgbaghara ga-adapụta.

N’ụbọchị Wenezde, otu pati na-anọghị n’ọchịchị boro ebubo na ndị uweojii gbagburu otu onye nkwado ha mana ndị uweojii gọrọ n’aka ha adịghị n’ebubo ahụ.

A na-arụ ndị nkwado patị abụọ nwere agba na ntuliaka aka iwakpo onwe ha.

Ebubo ebubo ọnọdụ ndị dị aṅaa dapụtakwara na na ntuliaka Satọde, ka onyendu otu pati na-anọghị n’ọchịchị boro ebubo nrụrụaka na ntuliaka site n’iji agụghọ fọjuo vootu nakwa igbochi ndị pụtara ịtụ vootu atụmatụ ha ịtụ vootu n’uju n’akụkụ ụfọdụ na mba ahụ.

Agbanyeghị nke a, dịka otu na-ahụ maka ntuliaka siri kwuo na mkparịtaụka ha nye ndị ntaakụkọ na mbido izu a, ha kwuru na ha hibela usoro iji hụ na ntuliaka gara n’ụzọ ziri ezi. Ndị mgbasaozi mba ahụ kwuru na a nwụchiri ụfọdụ ndị.

Ntuliaka a na-aga n’ihu n’oge mba a na-agabiga ndakpọ akụnaụba, iri elu ọnụego ihe ahịa nakwa nchegbu banyere ịdịn'otu mba ahụ.

Ntuliaka nyere ohere ka ndị mmadụ họpụta onyeisiala, ndị ụlọomeiwu, ndị ọchịchị obodo ndị ọzọ na ntuliaka nke ugboro ise na-eme na mba ahụ kemgbe agha 2002 bichara.

Agha a nke a lụrụ ruo afọ 11 tara isi ihe ruru mmadụ 50,000, mana kemgbe ahụ mba a enweela ntuliaka zuru oke gara n’udo bụ ọtụtụ nwere ntụkwasị obi na ya, dịka Marcella Samba Sesay bụ onyeisi oche ụlọọrụ ikike dịrị onye ‘National Elections Watch’ siri kwuo.

Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-akwadosi pati ha na-eso n’ike gụnyere mmadụ 3.3 debanyere aha itụ vootu na ntuliaka, mgbasaozi achụmnta vootu ndị patị dị iche iche gbadoro ụkwụ n’ịhụ na ha ratara ọtụtụ ndị mmadụ karịa ịgbasa ozi banyere ọrụ nakwa atụmatụ ochịchị ha ga-eso ma ha nweta mmeri.

Agbanyeghị nke a, ndị pụtara ịtụ vootu gwara BBC na ha chọrọ ịhụ mgbanwe pụtara ìhè na mba ahụ n’oge a.

Solomon Beckley si Freetown kwuru:

"Achọrọ m ịhụ gọọmentị ga-etinye aka n’ọrụ bụ nke ga-enye ndị mmadụ ọrụ, kwalite agụmakwụkwọ, kwalite ọrụ ahụike ma hụkwa na echebere mmepụta nri. Ana m atụ anya na onyeisiala ọhụrụ a ga-rụọ ọrụ ọma maka mba anyị,"

Osinbajo gaara ile ka ntuliaka ha si aga

Yemi Osinbajo

Ebe foto si, Tolani Alli

Onye bụbụ Osote Onyeisiala Naijira bụ Yemi Osinbajo maburukwa onyeisi otu ndị obodo 'Commonwealth' na-ele ka ntuliaka si ga (Commonwealth Observer Chair)na mba Sierra Leone soro ndị otu ya gaa n'ọtụtụ ọgbọ atụmvootu, ụlọ ngụkọ na ụlọ nchịkọta etu ihe si aga dị na Freetown, isiobodo Sierra Leone.

Naanị ndị nọ n'ahiri tupu Elekere ise ga-atu vootu- Onyeisi ngalaba na-ahazi ntuliaka

Mohamed Konneh

Onyeisis ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na mba Sierra Leone a kpọrọ,"Electoral Commission for Sierra Leone,' (ECSL) bụ Mohamed Konneh ekwuola na ọbụ naanị ndị kwụ n'ahịrị tupu Elekere ise nke mgbede bụ oge atụmvootu kwesịrị ịkwụsị bụ ndị ga-enwe ohere ịtụ vootu ha.

Konneh gwara ndị ntaakụkọ nke a n'ụlọ ọgbakọ 'Bintumani Conference Center dị na Freetown sịrị na ohere agaghị adịrị ndị bịara ọgbọ atụmvootu ka oge e nyere gachara.

Cheta na e bidoghị ntuliaka n'oge n'ọtụtụ ebe na mba ahụ ụbọchị Satode.

Samura Kamara nke All People’s Congress atụọla vootu

Samura Kamara

Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n’aha pati All People’s Congress bụ anọghị nọ ọchịchị na Mba Siera Leone bụ Samura Kamara atụọla vootu.

SKamara tụrụ vootu n’ọgbọ atụmvootu dị n’okoro ụzọ Regent Road dị na Lum;ley, na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Freetown isiobodo Sierra Leone.

Ntuliaka ebidoghị n'oge n'ọtụtụ ebe dịka onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'ebe ụfọdụ si wetara anyị ozi.

Ndị ọrụ ntuliaka abịaghị n'oge na mpaghara dị icheiche

Ntuliaka mba Sierra Leone

Ndị ọrụ ntuliaka abịaghị n'oge na mpaghara dị icheiche na Freetown, bụ isi obodo Sierra Leone dịka Satọde, Jun 24, bụ ụbọchị ntuliaka ọkwa onyeisiala na mba ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC chọpụtara na ndị ọrụ nke ụlọọrụ 'Electoral Commission for Sierra Leone' (ECSL) apụtaghị n'oge dịka ntuliaka amaliteghị n'ebe dị icheiche n'elekere asaa, bụoge ha kwuru na ịtụ vootu ga-amalite.

N'ụfọdụ ebe BBC gara, ntuliaka amalitebeghị n'ebe elekere itoolu nke ụtụtụ.

Otu nwaanyị aha ya bụ Mariatu Sesay, onye dị afọ 45, gwara BBC na ya bịara n'ebe a na-atụ vootu kamgbe elekere ise nke ụtụ iji nweta ohere tụọ vootu ma gawa ihe ndị ọzọ dị ya mkpa.

Ndị otu nleta ntuliaka bke otu 'European Union' zitere ka ha bịa mara etu ntuliaka ahụ si aga, kwukwara na ha chọpụtara na ịtụ vootu ebidoghi n'oge n'ebe dị icheiche ha gara.

Ntuliaka ọkwa onyeisiala ebirila ọkụ na mba Sierra Leone - Lee etu o si aga ugbua

Maada Bio na Samura Kamara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmadụ 12 na-azọ ọkwa onyeisiala na Sierra Leopne, mana ndị ọkachamara na-ekwu na ntuliaka a ga-esi ike n'etiti Onyeisiala Maada Bio na Samura Kamara

Ịtụ vootu amalitela ugbua na mba Sierra Leone dịka ihe karịrị mmadụ nde atọ na-esonye na ntuliaka iji họpụta onye ga-abụ onyeisiala ọhụrụ nke mba ahụ.

A ga-emekwa ntuliaka iji họpụta ndị ga-anọ n'ụlọ omeiwu etiti nakwa nke okpuru ọchịchị na mba Sierra Leone.

Nke a bụ nke ise a na-eme ntuliaka na mba Sierra Leone kamgbe a lụchara agha na mba ahụ afọ 21 gara aga.

Ntuliaka nke a na-abịa dịka mba Sierra Leone nọ na nsogbu ndakpọ akụnụba, mgbali elu ọnụ ahịa nakwa enweghị ịdịnotu n'obodo.

A na-atụ anya na e nwereike inwe ọgbaaghara n'ebe dị icheiche dịka pati abụọ kacha pụta ihe na ntuliaka a na-ebo ibe ha ebubo mwakpo.

N'ụbọchị Wenezde, pati nke na-anọghị n'ọchịchị boro ebubo na ndị uweojii gbagburu otu onye nkwado ha, mana ndị uweojii gọnahụrụ ebubo a.

Kedụ ndị na-asọ mpi na ntuliaka a?

SLPP na APC

Ebe foto si, SLPP/APC

Onyeisiala Maada Bio nke nọ n'otu 'Sierra Leone Peoples Party (SLPP), na-achọ inweta mmeri ga-eme ka ọ nọrọ n'ọkwa a ruo afọ ise ọzọ.

Bio dị afọ 59 ji obere ihe merie ntuliaka nke afọ 2018 dịka ya bụ ntuliaka banyere n'agba nke abụọ.

Mana mmadụ iri na abụọ ọzọ na-achọ ịchụpụ ya n'oche eze ahụ, kama ndị ọkachamara na-ekwu na onye kacha sie ike n'asọmpi a bụ Samura Kamara, onye gbara onye nke abụọ na ntuliaka nke gara aga e mere n'afọ 2018.

Kamara, dị afọ 72, arụbuola ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Sierra Leone na mba ndị ọzọ.

Ntuliaka ndị Sierra Leone

Ebe foto si, Getty Images

Gịnị bụ okwu a kpụ n'ọnụ na ntuliaka a?

Ọnọdụ akụnụba mba Sierra Leone bụ isiokwu onye ọbụla kpụ n'ọnụ dịka ntuliaka a na-abịa.

Mgbali elu ọnụahịa ihe nakwa mbuli ụtụ isi gọọmentị bụcha nsogbu ndị mmadụ sị na ha na-agabiga.

Ngụkọ nke ndị ọkachamara n'okwu akụnụba mere gosiri na ọnụahịa ihe ndị dị mkpa maka ibi ndụ ji ihe karịrị pasentị 52 gbalie elu n'ebe ọnwa Eprel 2023.

Nke a bụ nke kacha ọnụahịa na-agbali elu na mba ahụ.

Ndị na-azụ ahịa na-enwekwa nsogbu etu ọnụahịa dọla si arị elu kwa ụbọchị.

Pati ndị na-anọghị n'ọchịchị na-ebo Onyeisiala Maada Bio ebubo na o meghị ihe ọbụla iji jikwaa dọla ka ọ ghara ịdị oke ọnụ bụ nke na-akpata ọnụahịa ihe ndị ọzọ ji gbalie.

N'agbanye mmegharị ego nke mba Sierra Leone mere n'afọ 2022, o metụtaghị ọnọdụ akụnụba ahụ chaachaa n'ihi na ndị mmadụ ka jikwa ego ochie azụ ahịa, ọnụahịa ihe ka na-agbalikwa.

Kedu etu a ga-esi mata onye meriri?

Onye ọbụla ga-emeri ntuliaka a ga-enwetarịrị pasentị 55 nke vootu niile a tụrụ. ọ bụrụ na nke a emeghị, a ga-enwe agba nke abụọ nke ntuliaka nke ga-adi n'etiti mmadụ abụọ kacha nweta vootu.

A na-eche na ọ bụ vootu nke ndị ntorobịa ga-ekpebi onye ga-emeri na ntuliaka a.