Sierra Leone Crisis: Ọtụtụ ndị nkịtị na ndị uweojii anwụọla n'ọgbaghara a

Ebe foto si, Reuters
A nwuchiela ihe ruru mmadụ otu narị na iri atọ maka ngagharịiwe megide gọọmentị bụ nke a na-eme na mba Sierra Leone dịka ndị uweojii si kwuo.
Ngagharịiwe a bụ maka oke ọnụ ahịa ngwa ndị e ji ebi ndụ nakwa oke mpụ malitere na Wenezde gbanwere ma bute ọgbaghara n’etiti ndị mmadụ na ndị uweojii.
Odobeghi anya ndị nkịtị ole nwụrụla, ndị ọrụ ntaakụkọ Reuters sị na ọ bụ mmadụ iri abụọ na otu ebe ndị uweojii sị na ndị otu ha mmadụ anọ nwụrụ.
Onyeisiala ha bụ Julius Maada mere njem n’ofesi abatala ma sị na a ga-eme nyocha banyere nke a mere.
Dịka ọ dị ugbua ebe niile adịla jụụ n’obodo Freetown, mana e mebiri ọtụtụ ngwa ọrụ na akụnaụba ndị mmadụ nakwa nke gọọmentị.
A machiela ngagharị na mba Sierra Leone

Ebe foto si, Reuters
Gọọmenti mba Sierra Leone amachiela ndị mmadụ ịgagharị ebe ahụ ugbua.
Mmachi a ga-amalite n'ụtụtụ ruo mgbede, na-abịa dịka ndị mba ahụ na-eme ngaghariwe iji gosi iwe ha n'ebe gọọmenti nọ gbasara ihe isi ike na etu ọnụ ego si agbali elu mba ahụ.
Onyeisiala Sierra Leone bụ Julius Maada Bio arịọla ka obodo dere duu dịka e wetechara mkpesa na ụfọdụ mmadụ anwụọla site na ngaghariwe ahụ.

Ebe foto si, Reuters
Ihe Ecowas kwuru maka ọgbaghara a
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ndị isi ngalaba Economic Community of West African States(ECOWAS) akatọọla ọgbaghara ahụ dapụtara na mba Sierre Leone n'ụbọchị Wenesde.
Akụkọ kwuru na e gburu ụfọdụ ndị mee ngaghariwe nakwa ndị uweojii mgbe ọgbaghara sochiri ngaghariwe e mere na mba ahụ kamgbe abali atọ.
N'akwụkwọ ozi ndị is Ecowas wepụtara n'Abuja, ha kwuru ka ebe niile dere duu ugbua na Sierre Leone ka iwu obodo metụta ihe na-emenu.
Ọ bụ pati na-anọghị n'ọchịchị nakwa ngalaba na-ahụ maka ikike dịrị onye kwuru ka eme ngaghariwe maka etu gọọmenti esighị achị ọfụma na mba ahụ.
N'ụbọchị Wednesday, ka ụfọdụ mmadụ gbochiri ụzọ e si abanye ọdọụgbọelu Lungi, lụsa ndị ọrụ nchekwa ọgụ ma na-ekwu ka onyeisiala Julius Maada Bio tinke akwụkwọ arụkwaghịm.
Onyeisiala Bio kpọrọ ezinụlọ ya si mba ahụ pụọ ma hapụ oste ya bụ Mohamed Juldeh Jalloh ka ọ nọchite anya ya.
Osote ya bụ onye nyere iwu ka a machie ngaghariwe na mba ahụ mgbe ọ hụrụ na ndị mmadụ ji ohere ngaghariwe emebesi akụrụngwa gọọmenti.
A ga-eme ntuliaka onyeisiala na Sierre Leone n'afọ na-abịanụ ebe ndị mba ahụ na-ekwu ka onyeisiala nọ ugbua ghara ịpụta ịzọ ọkwa ọbụla ọzọ.









