Coup in Africa: Ugboro ole ndị agha wegharala ọchịchị n'ike n'Africa kemgbe 2021

Ndịisiala mba Afrịka

Ebe foto si, Getty Images

Ndị agha napụrụ onyeisiala mba Burkina Faso, Roch Marc Christian Kaboré, ọchịchị n'ike n'ụbọchị Mọnde, Jenụwarị 24, 2022.

Ha bu ụzọ gbaa ụlọntakụkọ gọọmentị mba ahụ dị n'isiobodo Ouagadougou gburugburu, tupu ha ekwuputa n'onyonyo na ha ekposaala gọọmentị ahụ ma weghara ọchịchị.

Ndị agha ahụ kwuru na ihe mere ha ji weghara ọchịchị bụ na gọọmentị ha emeghi ọfụma n'ihe gbasara ibibi ndị oyi ndụ egwu na-akpa mkpamkpa n'obodo ahụ kemgbe afọ 2015.

Nnwuchi ya bụ nke mbụ ndị agha na-eweghara ọchịchị n'ike na mpaghara Afrịka n'afọ 2022, mana o mere ugboro ise n'afọ 2021.

Etu ndị agha si weghara ọchịchị n'ike na mba Afrịkan'afọ 2021

Sudan:

Abdallah Hamdok

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Abdallah Hamdok mechara jiri aka ya gbaa arụkwaghịm

Ndị agha wegharala ọchịchị n'ike ugboro abụọ na mba Sudan n'afọ 2021.

Abdalla Hamdok bụbu Praịm Minista mba Sudan banyere ọchịchị n'ọnwa Ọgọst 2019, ka ndị agha chụpụchara Omar Hassan al-Bashir bụ onyeisiala mgbe ahụ, n'ọnwa Epreelụ afọ ahụ.

Tupu a chụpụ al-Bashir, ọ chịala mba ahụ afọ 26 n'ọkwa dị iche iche, site n'afọ 1993 ruo mgbe a chụturu ya n'afọ 2019.

Ka Hamdok batara ọchịchị, a nọ na-atụ anya na ọ ga-eduru mba ahụ mee ntuliaka iji họpụta onyeisiala ọhụrụ n'afọ 2021, mana nsogbu ya na ndị agha mba Sudan na-enwe mere ka a chụpụ ya n'ụbọchị 25 nke ọnwa Ọgọst, 2021.

Nchụpụ ha chụpụrụ ya na mmachi ha machiri ya ịpụta ezi mere ka ndị mba ofesi tiwe mkpu ma kwụsịkwa nde kwuru nde dọla ha na-enyebu mba ahụ maka enyemaka.

E tinyeghachịrị Hamdok n'oche ọchịchị n'ọnwa Nọvemba 2021, mana o mechara jiri aka ya gbaa arụkwaghịm n'ọnwa Jenụwarị 2022, ka ọnwa abụọ a chụpụrụ ya n'oche gachara.

Guinea:

Alpha Conde

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Alpha Conde chịrị dịka onyeisi African Union otu afọ, site n'ụbọchị 30 nke ọnwa Jenụwarị 2017 ruo 28 nke ọnwa Jenụwarị 2018

Alpha Conde bụ onyeisiala mba Guinea ruo mgbe ndị agha chụpụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Septemba, 2021.

Ndị agha ahụ nke Kọnel Mamady Doumbouya du, kwuru na ọ bụ nrụrụaka na mpụ juru na gọọmentị mere ha ji weghara ọchịchị n'ike.

Ndị agha ahụ gbachiri okeala ha ma machie njem ụgbọelu na mba ahụ dịka ha kposakwara iwu obodo ahụ.

Conde banyere ọchịchị n'ọnwa Disemba afọ 2010, dịka e mechara ntuliaka nke mmadụ niile kwenyere na aka enwe abaghị n'ofe.

Mali:Bah Ndaw; ụzọ o si bịa ka o si laa.

Bah Ndaw

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E ji mweghara ọchịchị n'ike kpọbata Bah Ndaw, etu ahụ ka e sikwa chụpụ ya n'oche ọchịchị

Bah Ndaw batara dịka onyeisiala mba Mali n'ụbọchị 25 nke ọnwa Septemba afọ 2020, mgbe ndị agha chụpụchara Ibrahim Boubacar Keïta n'oche onyeisiala.

Ndaw mere Assimi Goita bụ onye agha osote ya, dịka ha nọ n'ọchịchị kwesịrị ịnọ naanị ọnwa 18 ruo mgbe a ga-eme eme ntuliaka iji họpụta onyeisiala.

Ka ọ bachara ọchịchị, onyeisi otu Economic Community of West African States (Ecowas) kwuru na ha ga-ebuli mmachi ha machiri mba Mali ma ọ bụrụ na o jiri onye nkịtị mee Praịm minista.

Nke a mere ka Ndaw họpụta Moctar Ouane dịka Praịm minista n'afọ 2020.

N'ụbọchị 24 nke ọnwa Mee, 2021, ndị agha kpatara Ndaw na Ouane aka ma nwụchie ha n'ọgbọ ndị agha ebe Ndaw nọ kwuputa na ọ gbaala arụkwaghịm n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee ahụ.

E wepụrụ mmachi ịpụta ezi e tinyeburu ya na ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Ọgọst 2021.

Dịka a na-atụ anya na ndị agha ga-enyefe ndị nkịtị ọchịchị site na ntuliaka e kwesịrị ime n'ọnwa Febrụwarị 2022, minista na-ahụ maka mmekọrịta mba Mali na mba ndị ọzọ kwuputere n'ọnwa Jenụwarị 2021, na ha adọtịkwuola oge ha tinyeburu iji nyefe ndị ọchịchị onye kwuo uche ya ọchịchị.

Chad:

Mahamat Idriss Deby

Ebe foto si, Reuters

Idriss Déby bụbu onyeisiala mba a nwụrụ n'ihu agha ebe o du ndị agha mba ya ga gakwuru ndị agha nnupuisi na-enye nsogbu na mba ahụ.

Ka ọ nwụchara, nwa ya nwoke bụ Mahamat Déby, bụ otu n'ime ndị agha welitere isi na mba ahụ eweghara ọchịchị dịka onyeisiala.

Ka o wegharachara ọchịchị, o kwuru na a ga-enyeghachị ndị nkịtị ọchịchị mgbe ọnwa 18 gafechara.

Ndị ọzọ ha na ndị agha nwere nsogbu

Ndị agha nwakwara iweghara ọchịchị n'ike na mba Niger n'ọnwa Maachị afọ 2021, mana nke ahụ kpụrụ afọ n'ala.

Ndị agha ahụ nọ na-akwa mgbọ nso obi onyeisiala mba ahụ, mana aka mechara kpara ndị kpara ya bụ arụ.