Sudan coup 2021: Ihe anyị ma maka Lt. General Abdel Fattah al-Burhan, onye isiagha wegharala ọchịchị n'ike na mba Sudan

Ebe foto si, Getty Images
Ndị mmadụ awụjuola n'ụzọ na ngagharịiwe dịka akụkọ na-ekwu na ndị agha na-anwa iweghara ọchịchị n'ike na mba Sudan.
Nke a malitere n'isi ụtụtụ Mọnde, 25 nke ọnwa Ọktoba 2021.
Onye bụ onye isi agha General Abdel Fattah al-Burhan wegharala ọchịchị n'ike na mba Sudan
- Onye isi agha wegharịrị ọchịchị n'aka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na mba Sudan bụ General Abdel Fattah al-Burhan n'ụbọchị 25 Ọktọba ịgbanahụ agha ime obodo ime mba Sudan.
- O wepụrụ Praịm Minista Abdalla Hamdok ma wuchie ya n'ụlọ ya maka "ọdịnamma nke Praịm minista"
- N'ọnwa Ogọst, 2019 ka ọ kpọwara onwe ya onyeisi ala mgbe ọ bụrụrla onye isi ọgbakọ ndị ọchịchị a kpọọrọ Sovereign Council.
- 2015 ka ọ chịkọtara ndị agha gara ọgụ ndị a kpọrọ 'Sudan ground forces'. Ọ bụ ya chịkọtara ndị agha lụkọrọ n'agba ndị Saudi n'agha Yemen.
- O nwere ihe jikọrọ ya na ndị isiagha Gulf ọ bụ ya bụ oonye isi nchịkọta ndị agha Sudan n'agha Yemen.
- Ka o wegharịrị ọchịchị n'aka Praịm Mịnịsta Bashir, Burhan na ndị United Arab Emirates, Saudi Arabia na mba Egypt arụkọwazie ọrụ.
- Mba ndị Gulf zitekwara enyemaka nye Khartoum.
- N'ọnwa Maachị ka ọ nabatara Onyeisiala Egypt bụ Abdel Fattah al-Sisi na Khartoum.
- Ọ bụ mgbe al-Burhan sonyere ndị chụpụrụ Onyeisiala Omar Hassan al-Bashir n'oche na 2019 ka ọ banyere anya ọha.

Ebe foto si, Reuters
Ihe anyị ma dịka ndị agha na-anwa iweghara ọchịchị n'ike
- Ndị agha anwụchiela ndị minista anọ ma jichie Praịm minista mba ahụ bụ Abdallah Hamdok n'ụlọ ya
- Ndị agha bucha ngwaagha anọchiela mpaghara isiobodo Khartoum, dịka ndị na-eme ngagharịiwe na-akpọ taya ọkụ
- A kwụsịla ịntanetị n'isiobodo mba ahụ
- Ndị agha awụchiela isiụlọọrụ mgbasaozi n'isiobodo ahụ
- Mba Amerịka sị na ọnọdụ a na-enye ha nchekasị

Ebe foto si, Reuters
E mechiela ọdọụgbọelu dị na Khartoum
Njem ụgbọelu akwụsịtụla n'isiobodo Khartoum dịka akụkọ ya bụ mweghara ọchịchị n'ike na-arị ibe ya elu.
E mechiela ma gbochie igaru na ya bụ ọdọụgbọelu Khartoum, dịka ndị agha gbara ogige ahụ gburugburu.
Ka ọ dị ugbua, gọọmentị mba ahụ agbasabeghi ozi ọbụla gbasara ya.

Ebe foto si, Reuters
Ndị agha awụchiela n'ụlọmgbasaozi - mịnịstrị
Mịnịstrị mgbasaozi nke mba Sudan ekwuola na ndị agha wụchiri n'isiụlọọrụ mgbasaozi dị na Omdurman, nso isiobodo Khartoum.
Ha kwuru na ndị agha a ejichiela ndị ọrụ nọ ebe ahụ.









