Idriss Deby news: Nwa ya bụ Mahamat Kaka Deby ga-anọchị ya dịka onyeisiala

Idriss Deby na nwa ya Mahamat Deby

Ebe foto si, Getty Images

Nwa Idriss Deby ga-anọchịte anya ya dịka onyeisiala mba Chad n'oge nta.

Dịka ọ si dị, ndị agha mba Chad ekposala gọọmentị mba ahị ma kwuo na ha ga-eme ntuliaka ọzọ n'ọnwa iri asatọ ọzọ n'abịa.

Idriss Deby

Ebe foto si, Idriss Deby

Ugbua, ehiwela mmachị ngagharị na mba Chad site n'elekere isii nke mgbede ruo elekere ise nke ụtụtụ.

Ndịagha mba Chad kwuru na Onyeisiala mba ahụ bụ Idriss Deby anwụọla site na apa ọnya o nwetara n'ihu agha, izu ole na ole ọ fọrọ ka e duo ya n'iyi ọrụ dịka onyeisiala agba nke isii ya.

Ndịagha mba ahụ na ndị agha nnupụisi na-achịpụ ya na isiobodo mba ahụ bụ N'Djamena.

Nwa amadi ahụ dị afọ iri isi na itoolu (69) tupu ọ nwụọ.

Onyeisiala Deby bụ onye bu ụzọ na ngụkọ mpụtara ntuliaka e mere n'abalị iri na otu (11) ọnwa Epreelụ, afọ 2021.

Ka ọ dị ugbua, a họpụtala nwa ya bụ, Generalụ Mahamat Idriss Deby ka o jidegodu ọkwa onyeisiala dịka a gbachiri agbata mba ahụ na mba ndị ọzọ.

Mana onye nkuzi mahadum bụ Evariste Ngarlem Toldé gwara BBC na nke a megidere iwu ala ahụ dịka iwu kwuru na ọ bụ onyeisi ụlọomeiwu mba ahụ kwesịrị iweghara ọchịchị ma hazie ntuliaka nke ọ gaghị eso azọ.

Ihe ndị kwesr ịma maka Deby

  • A mụrụ ya ụbọchị 18 nke ọnwa Juun afọ 1952 n'ime obodo Berdoba, dị na mpaghara ugwu Chad.
  • Deby banyere ọkwa ọchịchị n'afọ 1990 dịka o weghara ọchịchị n'ike n'aka onyeisiala mba ahụ oge ahụ bụ Hissène Habré.
  • N'afọ 2012, Déby malitere agha megide nrụrụaka a kpọrọ "Operation Cobra," nke e jiri nweta ego ruru nde $50 bụ ego e zupuburu ezupu.
  • Ọ bụ onyeisi ngalaba African Union bido n'afọ 2016 ruo 2017.