Ethiopia crisis: Gọọmentị Ethiopia na-achọ ịnwuchi ndịagha 76

Mpaghara Tigray

Gọọmentị mba Ethiop[ia ekwuola na ha na-achọ ndị agha iri asaa na isii maka ebubo na ndị mpaghara Tigray na-enwe mmekọ.

Nkea na-eme dịka ndị mpaghara Togray na ndị agha gọọmentị mba Ethiopia na-alụ ọgụ na Tigray.

Onyeisi mba Ethiopia bụ Abiy Ahemd na-ekwu na ndị agha gọọmentị na-akwado ịbanmye isi obodo Tigray.

Dịka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla ebe ihe imirikiti mmadụ agbapụla n'ụlo ha.

Ị mata ihe na-eme na mpaghara Tigray siri ike dịka emechiri ụzọ niile esi ezipụ ozi.

Ndị agha Tigray

Ọgụ adapụtala na mpaghara Tigray nke dị na mba Ethiopia n'etiti ndị bi na mpaghara obodo Tigray na ndị agha nke gọọmentị mba ahụ.

Ọgụ dapụtara n'ụbọchị anọ nke ọnwa Nọvemba dịka gọọmentị Ethiopia boro otu Tigray People's Liberation Front (TPLF) ebubo na ha mere ntuliaka nke gọọmentị na-akwadoghi ma wakpo kwa ogige ndị agha gọọmentị dị na mpaghara ahụ.

Nke a mere ka onyeisiala mba Ethiopia bụ Abiy Ahmed nye ndị agha mba ahụ ikike ịbanye mpaghara Tigray n'ike maka o boro ha ebubo ịgba ọchịchị mba ahụ mgba okpuru.

N'aka nke ọzọ ka ndị otu TPLF na-ekwu na iwu akwadoghi ọchịchị Abiy n'ihi na o bugharịrị ụbọchị ntuliaka onyeisiala maka ọrịa coronavirus nke mere na ọchịchị ya enweghị isi.

Kedụ ndị bụ ndị TPLF?

Mapụ Ethiopia

Otu Tigray People's Liberation Front (TPLF) bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị batara n'ọchịchi n'afọ 1991.

Ọ bụ n'afọ 2015 ka ha pụrụ n'ọchịchị dịka ndi mpaghara ndị ọzọ dịka Oromo, bụ ndị kacha na mab ahụ mere ngaghariiwe na obi adịghị ha mma etu onyeisiala ha mgbe ahụ bụ Hailemariam Desalegn si achị.

Desalegn mechara rituo n'ọchịchị dịka onyeisiala mba ahụ.

Abiy Ahemd mechara banye n'ọchịchị nke mere ka ndị otu TPLF laa na mpaghara Tigray were nọọrọ onwe ha.

Akụkaọ na-ekwu na Abiy webatara ọtụtụ atụmatụ nke ndị mmadụ chọrọ kamgbe.

Kama ọtụtụ mpaghara ndị ọzọ na-ekwu na ha chọrọ ịchị onwe ha kamgbe Abiy batara n'ọchịchị.

Etu ole ka ọnọdụ dị na mpaghara Tigray?

Ndị agha nọ na mpaghara Tigray

Gọọmentị Ethiopia na-ekwu na ha na-emerị na ya bu ọgụ dịka ha kwuru na ha na-abanye isi ọbọdo Tigray bụ Mekelle.

N'aka nke ọzọ ka ndị agha Tigray na-ekwu na ha na-echekwa Alamata nke dị n'ụzọ e si aga Mekelle.

N'otu aka ahụ ka ndị TPLF na-ekwu na gọọmentị na-atị ndi nkịtị ogbunigwe mana gọọmentị mba ahụ sị na ọ bụ nanị ndị agha ka ha na-atụ ogbunigwe.

Ihe ndị otu gbatagbata na ndị otu ikike dịịrị onwe na ekwu maka ọnọdụ Tigray.

Ndị mmadụ na-agbapụ na mpaghara Tigray

Ngalaba United Nations na-ahụ maka ọrụ gbatagbata bụ United Nations High Commission for Refugees (UNHCR) na-ekwu na ọ bụrụ na enweghị ihe emere na mkpamkpa ga-akpa na mpaghara Tigray.

Ngalaba UN na-ekwu na ọtụtụ ndi bi na Tigray agbapụla n'ụlo ha ma sịkwa na ndị ọrụ gbatagbata enweghịike ị banye ebe ahụ nyere ndị mmadu aka.

Ogige ndí gbatagbata
Nkọwa foto, Mba dịka Sudan ekwela ịnabata ndị gbara ọsọ maka ọgụ Tigray.

Ngalaba Amnesty International kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ ka e ji mma sugbuo n'obodo Mai-Kadra nke dị na Tigray.

Abiy na-ekwu na ọ bụ ndị agha TPLF bụ ndị na-akpa arụ a.

Mgbe ọgụ a nwereike ịkwụsị

Dịka ndị agha gọọmentị Ethiopia na-ekwu na ha na-achọ ịbanye isi obodo Tigray, Mba Kenya na Uganda na-akpọ oku ka enwee nzụkọ maka udo na mba Ethiopia kama gọọmentị mba ahụ na-ekwu na ha na ndị TPLF agaghị enwe nzụkọ ọbụla.