World War 3: Lee ihe ndị kpalitere agha Mbaụwa mbụ na nke abụọ

Ogbugbu mba Amerịka gburu onyeisi agha mba Iran bụ Qasem Soleimani na mba Iraq akpaliteela egwu ma ọ ga ebute agha Mbaụwa nke atọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ nọ na soshal midia n'arụ aka na ọ bụ ụdị ekweghị ekwe ụfọdụ mere mmiri jị banye opi ụgbọgụrụ nke butere agha abụọ ahụ.
Lee ụfọdụ ihe ndị mere n'agha abụọ ahụ:
Agha Mbauwa Mbụ(1914-19)

Ebe foto si, Getty Images
Ndị lụrụ ya: Agha mbaụwa Mbụ bidoro n'etiti mba Briten na mba Jamini n'abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1914.
Mba Briten,Fransi na Russia kwụkọtara luso Jamani na Austria-Hungary na ndị na-akwado ha.
Ihe butere okwu: Ọ bụ ịzọ onye ga-ewere obere mba ndị ọzọ bụ ihe butere ụka.
Oge ahụ ndị mba nwere agba dịka Briten,Russia na Jamini na-azọkọsị obodo ha ga-eweghara ọchịchị ha(colonies).
Jamani na Austria-Hungary weghara mba Bosnia na Morocco nke were mba Briten Iwe ha were si na Jamini ji anya ike achụ ya bụ ihe.
Agha Mbauwa Abụọ (1939-1945)

Ebe foto si, Getty Images
Ndị lụrụ ya: Na mbụ naanị Briten na Fraansi bụ ndị nọ n'ọgụ ahụ Hitler kotere.
Mana mba Amerịka sonyere n'agha ahụ oge mba Japan wakporo Pearl Harbour.
Ogbunigwe Amerịka tụrụ na Hiroshima n'abali isii nke ọnwa Aụgụst afọ 1945 mere ka Japan chilie aka dịka onye e meriri emerị.
O bụ n'agha ahụ ka Hitler gbalịrị ikpochapụ ndị Juu niile.
Ihe butere okwu: Agha Mbaụwa nke Abụọ dara dịka Adolf Hitler wakporo mba Poland n'abalị mbụ afọ 1939.
Mba Briten chere ha aka mgba ka abali abụọ gachara n'abalị nke atọ nke Ọnwa Septemba.
Agha Mbaụwa Mbụ na Nke Abụọ kpara mkpa mkpa dịka o butere agụụ,mbibi akụnaụba ma takwaa isi ọtụtụ mmadụ.
Nke mere mba lụrụ ya jiri nwee nkweọkrịta na ha agaghị alụkwa agha ọzọ.
N'agbanyeghị na a lụghị agha abụọ ndị a n'ala Afrịka mana ndị mba ofesi ndị nwere ọchịchị n'ala dị n'Afrịka dịka Naijiria dọrọ ụmụ afọ Afrịka gaa lụọ ya bụ ọgụ.









