Chronic Respiratory Disorders: Lee etu ị ga-esi gbalahụ 'Asthma', 'sleep apnea' na ọrịa ngụ ndị ọzọ?

Onye na-anụ ọgwụ imi maka Asthma

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Chioma Mgbemena( ọ bụghị ezi aha ya) dị afọ iri na isii oge ọrịa asthma jidere ya n'ụzọ pụrụ iche, e buga ya ụlọọgwụ ebe a zọtara ndụ ya.

" Etum na isi mmanụ ụgbọala anaghị adị m mma na-ahụ. Oge ọbụla m na-aza ụlọ, imi na-ebido na-agba m maọbụ na-eze uzere aghara aghara mana akpọghị m ya ihe ọbụla."

"Mana ọ bụ oge m dị afọ iri na isii m dara ahụ menyere m egwu n'ahụ ka e buru m gbaga ụlọọgwụ ebe dọkịta chọpụtara na enwere m ọrịa 'asthma."

Mgbemena dị afọ iri atọ ugbua, mana ọrịa ahụ ka na-echere ya aka mgba.

"Ọrịa na-enye m nsogbu ị ga ọrụ n'ihi na enweghị m ụgbọala nke aka m. "

Ọ bụghị ọgbakọ ọbụla ka nwaada Chioma na-ala. Ụfọdụ na-akpachapụ ya n'ihi ọrịa nke mere na ọ naghị agwa ndị mmadụ ọnọdụ ya.

Asthma so otu n'ime ọrịa ndị a kpọrọ 'Chronic Respiratory Diseases' (CRDs).

Ngụ

Ebe foto si, Getty Images

'Chronic Respiratory Diseases' (CRDs) bụ ọrịa ndị na-emetụta ngụ maọbụ akụkụ ngụ.

Ọrịa ndị na-emetụta ngụ gụnyere ma ewezụga ọrịa asthma gụnyere "chronic obstructive pulmonary disease" (COPD), "Sleep Apnea", "Bronchitis" wdg.

Dịka WHO si kwuo, ọrịa na-emetụta ngụ na-egbu ihe karịrị nde mmadụ anọ kwa afọ gụnyere ndị okenye na ụmụaka.

Aha onyonyo, Ọ bụ ike ọgwụgwụ na ume ọkụ mere m jiri chọpụta na m nwere ọrịa obi - Onyinye Eze.

Kedụ ihe ndị nwere ike ịbute ọrịa ndịa?

Ihe ndị na-ebute ọrịa CRD gụnyere etum,ịṅụ anwụrụ, kemịkal nakwa inwekarị ọrịa ngụ n'efe efe n'ụmụaka.

Dịka Dọkịta Funmi Akinde nke Lagos University Teaching Hospital Luth bụ onye dọkịta ihe na-eme n'ime ahụ doro anya siri kọwaa, lee ihe ụfọdụ na-ebu ọrịa ndị a :

Asthma

Ọrịa 'asthma' bụ ọrịa nke ọwa ikuku na-akpachi, na-akpaghe ma na-ewepụta ụkwara.

Njirimara ọrịa 'asthma' gụnyere; umeọsọ,ụkwara,uwe ịra ahụ,ume ime mkpọtụ na obi mgbu.

Ihe ndị na-ebute asthma bụ;

  • Ọtụtụ mgbe, 'asthma' na-adị n'ezinaụlọ.
  • Ụfọdụ, ọ na-abụ ịnọ ihe na-ebute ya dịka etum, anwụrụ, nsị anụmanụ, nso
  • Oke ibu nwere ike ibuga mmadụ nso ịrịa ọrịa 'asthma'.
  • Ụkwara anaghị ala ala
  • Oke ibu

Chronic Obstructive Pulmonary Disease (COPD)

COPD bụ ọrịa na-ebute mkpochi ngụ nke na ikuku anaghị aga dịka o kwesịrị.

Njirimara 'COPD'

  • Ụkwara na azụzụ
  • Umeọsọ
  • Ume ime mkpọtụ(Wheezing)

Ihe ndị na-ebute'COPD'bụ;

  • Ịṅụ anwụrụ
  • Ikuru anwụrụ n'aka onye na-aṅụ anwụrụ
  • Oke ikuru anwụrụ dịka a na-ahụ na ndị ji nkụ esikarị nri
  • Oke ụkwara na azụzụ

"Obstructive Sleep Apnea"

Nke a bụ ọrịa na-eme ka mmadụ na-ekubi ume ma ọ na-arahụ ụra.

Njirimara 'sleep apnea' gụnyere; ịgwọ ụra,oke ụra n'ehihie, isiọwụwa ụtụtụ, ọbara mgbalielu na ike ọgwụgwụ n'ụtụtụ n'ihi arahụ ụra nke ọma n'abalị.

Ihe ndị na-ebute ya bụ;

  • Ọrịa shuga
  • inwe ogwodo akpịrị buru ibu nke nwere ike ime ka ọwa akpịrị mmadụ kpaa akpa
  • Ọbara mgbalielu
  • Ịṅụ anwụrụ
  • Oke azụzụ
  • Ọrịa shuga

Ọrịa ngụ a na-ebute n'ọrụ

Ebe a na-egwupúta ihe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye na-arụ ebe a na-egwupoụta kolu, ọlaedo nakwa ọnatarachi ndị zọ nwere ike ibido rịawa asthma maọbụ ọrịa ngụ ndị ọzọ

E nwere ọrịa ngụ a na-ebutekarị n'ọrụ nke Bekee kpọrọ "Occupational lung diseases".

Nke na-emetụta ndị na-arụ ebe a na-egwupụta ihe n'ala, ndị na-akụwa okwute, ndị na-ete uhie(painters) maọbụ na-arụ ebe a na-emepụta ụhie nakwa ndị na-arụ ebe a na-emepụta asbetọs.

Dọkịta Funmi Akinde kwuru na" ụfọdụ ndị ka ọrịa na-ebutu ma ha rụọ ọrụ ihe dịka afọ iri maọbụ iri na ise ebe a na-eme ihe ndịa."

Dr Funmi Akinde

Ebe foto si, Funmi Akinde

Nkọwa foto, Funmi Akinde: "Ndị na-azụ ọkụkọ maọbụ nnụnụ 'pigeon' , ndị na-egwupụta ihe n'ime ala, ndị na-arụ kapịnta nwere ike ibute ọrịa ngụ "

Ọ gara n'ihu sị, "Ndị na-azụ ọkụkọ maọbụ nnụnụ 'pigeon' nwere ike ibute ya dịka nsị ha nwere ajọ ikuku si n'ime ya nwere ike imerụrụ ngụ ahụ ma ọ bụrụ na mmadụ echekwaghị onwe ya ọfụma."

z Mgbochi

  • Kwụsị ịṅụ anwụrụ
  • Chọpụta ihe ndị ahụ na-akpalite ọrịa n'ahụ gị ma gbara ha ọsọ.
  • Ọ bụrụ na ị na-ejikarị nkụ esi nri, chọọ ụzọ ọzọ e ji esi nrị anaghị akwụ anwụrụ.
  • Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ ịkwacha osisi, ịzụ ọkụkọ maọbụ nnụ, maọbụ ihe ọbụla na-ebute etu, maọbụ ikuku ọjọ, gbaa mbọ kpuchi imi na ọnụ gị.
  • Gbaa ọgwụ mgbochi oyi ọkpọnangụ(pnemonia)
Ọrụ kapịnta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye ọrụ kapịnta anaghị egbuchi imi na ọnụ ya nwere ike ibute ọrịa ngụ

Ileta onye na-arịa ọrịa ngụ

Ọtụtụ mgbe, a naghị agwọchapụ ọrịa ngụ mana onye nwere ya bụ ọrịa nwegara ihe o kwesịrị ị na-eme iji hụ na ọ kwụ chịm

  • Inwe mmegharịahụ nke Bekee kpọrọ "exercise" kwa mgbe
  • Lezie anya n'ụdị nri ị na-eri n'ihi na ụfọdụ nri na-azakpalite nsogbu ngụ maka onye ọrịa ahụ dị n'ahụ
  • Gba mbọ hụ dọkịta ọkachamara maka ngụ ọbụladị otu ugboro n'afọ
  • Na-aṅụ ọgwụ nleta gị etu dọkịta siri tuziere gị mgbe dum
  • Gbara etu, anwụrụ, ọgwụanwụ na ihe ndị ọzọ na-akusu ọrịa a ọsọ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: