Pfizer Covid Vaccine: Mba UK enyela ikike ka a malite ịgba ndị mmadụ ọgwụmgbochi a

Onye a na-agba ọgwụ nnwale maka coronavirus

Ebe foto si, John Cairns/University of Oxford/PA

Nkọwa foto, Onye a na-agba ọgwụ nnwale maka coronavirus

Mba UK abụrụla mba mbụ n'ụwa niile kwetara ka e jiri ọgwụ Pfizer/BioNTech maka mgbochi ọrịa coronavirus.

Ngalaba ahụike mba ahụ enyela ikike ka amalite ịgba ọgwụ ahụ n'izuụka na-abịa abịa.

Nnyocha gosiri na ọgwụmgbochi ahụ nke ụlọọrụ Pfizer/BioNTech rụpụtara na-arụ ọrụ karịa pasentị iri itoolu (%90).

A ga-amalite ịgba ya na mpaghara mba UK ebe ọnụọgụgụ ndị nwere coronavirus karịrị akarị.

Mba UK azụtala ọgwụ ahụ ihe ruru nde iri anọ (40 million) nke ga-ezu ịgba mmadụ nde iri abụọ (20 million), n'ihi na a na-agba otu onye ọnụ ọgwụ abụọ.

Ihe ị kwesịrị ịma banyere ọgwụ mgbochi a

  • Ọgwụ mgbochi a bụ nke mbụ a na-emepụta n'oge kacha nta n'ụwa, naanị ọnwa iri ka o were iji mepụta ọgwụ mgbochi a
  • Ọgwụmgbochi a bụ ụdị nke a na-akpọ mRNA 'vaccine'
  • Nwa afọ Naịjirịa bụ Dọkịta Onyema Ogbuagu so n'isi otu mepụtara ọgwụmgbochi ahụ
  • Ebe e kwesịrị ichekwa ọgwụmgbochi a bụ ebe jụrụ oyi ruo -70C
  • Ọnụ ọgwụ abụọ ka e kwesịrị ịgba mmadụ; nke abụọ bụ ma ọ gachaa abalị iri abụọ na otu a gbara nke mbụ
  • Ndị mbụ a ga-agba ọgwụ a bụ ndị gafegoro afọ iri asatọ, nakwa ndịọrụ ahụike na-elekọta ndị nwere coronavirus

gwụ mgbochicoronavirus ọzọ a kpọrọ 'Moderna'nke ikike ya ruru pasentị 95

Ọgwụ mgbochi

Ebe foto si, Getty Images

Ị nụkwala maka ọgwụ mgbochi coronavirus ọzọ nke ikike o ji egbochi covid-19 e ruola pasenti iri itoolu na ise (95%)?

Nke a si na data ndị ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ bụ Moderna dị n'Amerịka.

Moderna na-esochi ụkwụ ọgwụ mgbochi nke ụlọọrụ Pfizer, nke na-enye ndị mmadụ nkasiobi na ọgwụ mgbochi a nwereike inye aka kwatuo ọrịa ozuruụwaọnụ bụ Coronavirus.

Ụlọọrụ abụọ ndịa jiri ụzọ ọgbara ọhụrụ puruiche emepụta ọgwụ mgbochi ha.

Moderna sị na ha na-eche mbinyeaka ka ọgwụ mgbochi ha n'izu ole na ole na-abịa.

Mana nke a gosiri na asabeghị ọtụtụ ajụjụ ụfọdụ maka ọgwụ mgbochi a.

Ọ ga-adị mma?

Aha onyonyo, Coronavirus: Akụkọ ọma i kwesịrị ịnụ gbasara ọrịa a

Mmadụ karịrị puku 30 n'Amerịka nwara ya ebe mmadụ puku 15 bụ ndị e nyere doz abụọ ya n'izu anọ.

Mmadụ 11 bu coronavirus ebe ọ dị ukwuu mana o metutaghị ndị mmadụ gbara ọgwụ mgbochi a.

"Etu ọgwụ a si akpa ike dị egwu... ọ bụ oke ụbọchị," Tal Zaks, onyeisi ọrụ ahụike na Moderna, gwara BBC.

Aha onyonyo, Coronavirus Tips: Artemisia ọ na-agwọ coronavirus?

Dọkịta Stephen Hoge, onyeisi ụlọọrụ a, kwuru na "o gere ntị ọfụma" dịka ka mpụtara nnyocha gbara n'anwụ.

Ọ gwara BBC: "Echeghi m na o nwere onye n'ime anyị bu n'obi na ọgwụ a ga-akpa ike n'igbochi ọrịa covid-19, ọ bụ nchọpụta na-atụ n'anya."

Kedụ mgbe ọ ga-erute m aka?

Ọgwụ ntụntụ

Ebe foto si, Reuters

  • Nke ahụ si n'ebe ị nọ nakwa afọ ole ị dị.
  • Moderna sị na ọ ga-eso iwu Amerịka niile, mana ọ ga-agba mbọ ịhụ na ọgwụ mgbochi nde 20 dị na mba Amerịka.
  • Ụlọọrụ Mordena sị na ọ ga-enwe opekatampe ọgwụ ruru otu ijeri na mpaghara ụwa niile n'otu afọ na-abịa ma iwu mba ndị ọzọ kwekwa.
  • Ndị gọọmenti UK sị na ha na ndị ụlọọrụ Moderna ka na-ekwekọrịta maka ọgwụ mgbochi a na o soghi n'otu n'ime isii ha tụrụla ahịa ya. Ha sị na Moderna agaghị adị ruo oge 'spring' afọ ọzọ.

Mba UK ewepụtala atụmatụ ga-ahụ na e bu ụzọ nye ndị kachasị kaa nka ọgwụ mgbochi.

Kedụ ihe anyị na-amaghị

Anyị amaghị ogologe oge ole ọgwụ a nwereike igbochi ọrịa n'ahụ mmadụ, a ga na-eso ndị a gbarala ya ruo oge ga-adị anya iji saa ajụjụ a.

E nwere kepukepu na ọ na-echekwa ndị katara nka, bụkwanụ ndị nwereike ịnwụ site n'ọrịa covid, mana ozi a ezuchabeghi.

Maazị Zaks gwara BBC na nnyocha gosiri na afọ ole mmadụ dị "anaghị eme ka ikike ọgwụ a daa."

A maghị ma ọgwụ a ọ na-akwụsị mmadụ ịrịa oke ọrịa, maọbụ kwụsị ha ikesasị nje ya.

Ajụjụ niile a ga-emetụta etu e si aṅụ ọgwụmgbochi coronavirus.

E nwere ọghọm dị na ya?

E nweghi ihe ịtụ egwu ọbụla pụtara ihe a hụtarala mana o nweghi ihe ọbụla bụ ọgwọọ kpamkpam, gụnyere ọgwụ paracetamol.

Obere ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa na ahụ mgbu bụ ndị a hụtara n'ahụ ụfọdụ mmadụ oge a gbachara ha ọgwụ a.

"Ha bụ ihe a na-atụ anya n'ọgwụ mgbochi na-arụ ọrụ ma e tinyere ya ụdị ahụ nwere ikike ibuso ọrịa agha" Ọkammụta Peter Openshaw, nke Mahadum Imperial dị na Lọndọn kwuru.