Onyema Ogbuagu: Oge ọkammụta lụrụ ọkammụta ma mụta ọkammụta

Chibuzo Ogbuagu, Chinyere Ogbuagu na Onyema Ogbuagu

Ebe foto si, Absu/Linkedin

Nkọwa foto, Ọkammụta Chibuzo Ogbuagu, nwunye ya bụ Ọkammụta Chinyere Ogbuagu na nwa ha nwoke bụ Ọkammụta Onyema Ogbuagu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị Igbo na-atụ ilu sị na "ihe agwọ mụrụ ga-etorịrị ogologo", ha na-asịkwa na "nwa Agụ anaghị ata ahịhịa".

Ilu a pụtara nnọ ihe na ndụ ọkammụta Onyema Ogbuagu, bụ nwa afọ Igbo nọ n'isi otu ndị chọpụtara ọgwụ mgbochi maka ọrịa coronavirus.

N'izụụka ole na ole gara aga ka ụlọọrụ Pfizer n'Amerịka kwuru na ha arụpụtala ọgwụ mgbochi ọrịa coronavirus.

Ụlọọrụ a sị na nnyocha ha gosiri na ọgwụ ahụ ruru ọrụ ruo pasentị 95 n'ibuso nje coronavirus agha.

Mana dịka ụwa niile kpụzi Ọkammụta Ogbuagu n'ọnụ ugbua, ọbụghị mmadụ niile ma maka nne ya na nna ya, ha abụọ bụchakwa ọkammụta n'isi onwe ha.

Ole ndị bụ Ọkammụta Chibuzo na Chinyere Ogbuagu?

Chibuzo na Chinyere Ogbuagu

Ebe foto si, Facebook/Abia State University

Nkọwa foto, Ọkammụta Chibuzo na Chinyere Ogbuagu
  • Ha abụọ bụ ndị ọkammụta na-akuzi na mahadum Abia steeti dị n'Uturu.
  • Ha abụọ gụrụ akwụkwọ mahadum na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka.
  • Ha abụọ pụtara na Mahadum n'afọ 1974.
  • Chibuzo gụrụ maka ndọrọndọrọ (Political Science) ebe Chinyere gụrụ maka mmekọrịta mmadụ na ibe ya n'obodo (Sociology and Anthropology)
  • Ọkammụta Chibuzo nwetere nzere 'Masters' na 'PhD' ya na Mahadum Yale nke mba Amerịka, ebe ọkammụta Chinyere nwetara nke ya na Mahadum Pennsylvania n'Amerịka
  • Ha abụọ akụziela na Mahadum Naịjirịa Nsukka, Mahadum Maiduguri, Mahadum Uyo, Mahadum Calabar na Mahadum Abia steeti.
  • Ọkammụta Chibuzo bụ onyeisi Mahadum Abia steeti malite n'afọ 2010 ruo 2015.
  • N'aka nke ya, ọkammụta Chinyere bụ osote onyeisi Mahadum Abia steeti malite n'afọ 2000 ruo 2004
  • Ha mụrụ ụmụ ejima nwoke abụọ nke otu n'ime ha bụ Onyema Ogbuagu, onye gburu Agụ coronavirus nke ụwa kpụ n'ọnụ ugbua.
  • Ejima nke ọzọ bụ onye Injinịa.

Onye bụ Dọkịta Onyema Ogbuagu?

Onyema Ogbuagu

Ebe foto si, Onyema Ogbuagu Twitter Page

  • Dọkịta Onyema Ogbuagu si Abia steeti dị na Naịjirịa.
  • Ọ bụ otu n'ime ụmụejima ọkammụta Chibuzo Ogbuagu bụbụ 'Vice Chancellor' mahadum Abia steeti nakwa odeakwụkwọ gọọmenti steeti ahụ.
  • Ọ bụ ọkammụta n'okwu ahụike na Mahadum Yale, ngalaba ọgwụ na ahụike.
  • Ọ bụ onyeisi na ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe na Mahadum a.
  • Ọ na-akuzikwara ụmụakwụkwọ ndị dọkịta ihe banyere ọrịa ndị na-efe efe.

Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu bụkwa ụkpa ekele bunye nwa amadi a maka etu o si sonye n'irụpụta ọgwụ mgbochi covid-19 a ga-azọ ndụ ọtụtụ mmadụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Agụmakwụkwọ na ọzụzụ

Dọkịta Ogbuagu gụrụ akwụkwọ na Mahadum Calabar nke Naịjirịa n'afọ 2003,

Nwee ọzụzụ ndị dọkịta n'ụlọakwụkwọ ahụike Yale (Yale School of Medicine), Ụlọakwụkwọ ahụike Mount Sinai (Mount Sinai School of Medicine).

O lere ule n'ihe banyere ahụike a kpọrọ 'Board Certification' na AB of Internal Medicine, Infectious Disease n'afọ 2012.

Nturuugo

Dọkịta Ogbuagu eritela nturuugo dị iche iche nke gụnyere;

Nturuugo a kpọrọ Gerald H. Friedland maka ndị kachasị eme nyocha n'ụwa n'otu Connecticut Infectious Society n'afọ 2014 nakwa 2019.

Dọkịta Ogbuagu dere n'akara twitter ya, sị na ime nyocha banyere ọrịa ndị na-efe efe na-esikaarị ọnwụ na-amasị ya.

O meela nyocha banyere nje HIV, Coronavirus nakwa ọrịa ndị ọzọ na-efe efe.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe mere m ji hapụ ọrụ uweojii chie Fada n'ụka Katọlik