Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-amachi CNN maka akụkọ nyocha Endsars ha gosiri

Lai Mohammed

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Minista mgbasaozi Naịjirịa bụ Lai Mohammed ekwuola ka amachipu ụlọọrụ ntaakụkọ CNN maka ya bụ ihe onyonyo akụkọ nyocha ha gosiri ụnyaahụ bụ Wenezde maka ngaghrịiwe Endsars ndị ntorobịa mere n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Oktoba 2020.

Iwe Mohammed bụ onye kwuru nke a ụbọchị Tọzde bụ na CNN kwuru na ya bụ ihe ngosi, na ndị agha Naịjirịa ji mgbọ igwe gbaa ndị gara ya bụ ngagharịiwe ma gbagbu ọbụladị otu onye, bụ nke ndị agha Naịjriịa kwuru na ọ bụ ụgha.

N'akụkọ CNN biputara na mgbede a, ha sị na ya bụ ihe nkiri gosiri ihe mere na ya bụ ngagharịiwe udo akpọrọ Endsars ndị mmadụ mere n'ụbọchị ahụ.

Mohammed kwuru na " Ihe a CNN mere abụghị obere ihe, e kwesiri ịmachi ha".

Ọnụ na-ekwuru CNN sị na "ụlọọrụ ntaakụkọ ha anaghị alaazụ maka ya bụ akụkọ ha buru".

"Anyị kpachapụrụ anya, mee ezigbo nchọpụta maka ya bụ akụkọ anyị mere, ị laa azụ adịghị na ya", ya bụ nwaamadị dere n'akwụkwọ ozi.

Ha gosiri otu nwaamadị aha ya bụ Victor Sunday bụ onye ndị be ha sị na ha ka na achọ achọ ruo ugbua.

Ha sị na ha ji akụrụngwa di iche iche na-egosi ebe e sere foto na mgbe e sere ya arụ ọrụ.

CNN gbara ọtụtụ mmadụ ajụjụ ọnụ bụ ndị so na ya bụ ngagharịiwe.

Ha kwuru na tupu ha ewepụta ya bụ ihe onyonyo, na CNN gbara mbọ ikwuru ndị agha Naịjirịa, mana ha atụpụghị ọnụ.

Ha kwukwara na ha kpọkwara ndị uweojii bụ ndị so na ya bụ ebubo, mana onye ahụ atụpụghị ọnụ.

CNN sị na onye ọrụ Legọs steeti ha kpọrọ sị na ha agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu nọ n'aka kọmitii na-enyocha ya.

'CNN enweghi onye ntaakụkọ na Lekki, ọ bụ ihe ha hụru na soshal midia ka ha dere' - Lai Mohammed

Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed agwaala ndị ntaakụkọ na ihe ụlọ ntaakukọ CNN kwuru maka mkpa mkpa kpara na ebe a na-anata ụtụ isi ụgbọala na Lekki di na Legọs adabaghi ma ncha.

Alhaji Mohammed sị na akuko CNN banyere ihe a mere na-edughe ndị mmadụ.

CNN mere ihe onyonyo na akụkọ gosiri etu e si gbaa ndi mmadu egbe na Lekki, mana ndị agha Naịjirịa gọrọ na ha agbaghị ndị mmadụ egbe ọbụla.

CNN sị na ha hụrụ ihe onyono gbara akaebe nakwa akaebe ndị hụrụ ihe emere bụ ihe ha jiri kpebie na o mere etu ahụ ha siri kwuo.

Ihe Lai Mohammed kwuru

Gọvanọ Legọs Steetị

Ebe foto si, Sanwo-Olu/Twitter

Alhaji Mohammed sị na CNN enweghi onye ntaakụkọ na Lekki, nke mere ihe niile ha kwuur bụ ihe ha hụrụ n'ihe onyonyo ọ sị na-efegharị na soshal midia.

Ọ jụrụ, "Kedụ ebe ha gbadoro ụkwụ mee akụkọ a?"

Ọ sịkwa na CNN edeghị akụkọ ha n'ụzọ oji kwụrụ ọtọ.

Ọ sị: "Kedụ ihe mere ha ejighị tinye ọnụ okwu Ọchịagha Taiwo bụ onye nọchitere ndị agha na ngalaba na-enyocha ihe mere na na Lekki.

Ọ sịkwa na CNN sibu na mmadụ 38 nwụrụ, ma kwuzịa na ọ bụotu mmadụ nwụrụ ugbua.

Lai Mohammed sị na ha gwara ndi agha ihe ha ga-eme tupu ha agawa ọrụ.

Ọ sị; " Ọ bụ mgbọ agaghị egbu mmadụ ka a sị ha jiri gawa ọrụ."

Lai Mohammed sị na gọọmentị kwadoro etu ndị agha siri kpaa agwa na Lekki.

Gọọmentị Legọs Steetị asaala ndị ntaakụkọ CNN maka nyocha ha mere n'ogbugbu ndị na-eme ngagharịiwe EndSARS na Lekki toll gate.

Gọọmentị Legọs gwara BBC Pidgin na ha enweghi ọbụla ha nwereike ikwu maka akụkọ nyocha CNN mere banyere ihe mere na Lekki.

Gọọmentị enweghi okwu ọbụla ruo mgbe kọmitii e hiwere maka ilebanya na mkpagbu ndị uweojii ewepụta nyochapụta nke ha.

Nke a bụ ihe ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu bụ Gboyega Akosile kwuru.

Kenechukwu Okeke sị na ọ ga-akpụpụ CNN n'ụlọikpe maka nyocha ha mere n'ogbugbu ndị ngagharịiwe

Lekki Toll Gate

Ebe foto si, Getty Images

Otu nwoke kpọrọ onwe ya onye na-agba mbọ maka ikike dịị onye bụ Kenechukwu Okeke ekwuola na ya-akpụpụ ụlọntaakụkọ "Cable News Network" a kpọrọ 'CNN' n'ịchafụ ụlọikpe maka nnyocha ha mere n'ogbugbu ndị na-eme ngagharịiwe EndSARS na Lekki Legọs n'abalị iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020.

Ụlọọrụ ntaakụkọ "CNN" wepụtara akụkọ nyocha ha mere maka ndị na-eme ngagharịiwe EndSARS a sị ndịagha gbagburu na Lekki toll gate.

Akụkọ gosiri ihe onyonyo ebe ndịagha si, oge ha hapụrụ ogbe ha na Bonny Camp nakwa mgbe ha rutere Lekki Toll gate ma malite ịgba ndị ngagharịiwe a egbe.

Akụkọ ahụ nyochakwara mgbọ tụrụ ụfọdụ ndị gbakọrọ ebe ahụ nakwa ebe o si pụta.

Aha onyonyo, 'Ndịagha agaghị agọ na ha agbaghị mmadụ egbe na Lekki Toll Gate n'ihi na e bugara m ọtụtụ ụlọọgwụ'

Ọtụtụ ndị mmadụ etoola ụlọọrụ CNN n'akụkọ ebe ndị ọzọ dịka Kenechukwu Okeke katọkwara akụkọ a sị na CNN tinyere aka n'okwu ka dị n'ụlọikpe.

Okeke sị n'ihi nke a na ọ ga-agba ụlọọrụ CNN akwụkwọ n'ụlọikpe maka nke a.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2

End of X post, 2

Kedụ ihe ndịagha kwuru?

Onyeisi ndịagha Naịjirịa bụ Tukur Buratai

Ebe foto si, AFP

Mgbe ihe a mere ọhụrụ, ndịagha Naịjirịa sị na ndị otu ha agaghị na Lekki toll gate mana ha mechara kwuo na ndị otu ha gbaliri mgbọ egbe na-enweghi ike igbu mmadụ na-elu.

Dịka akụkọ nyocha CNN a pụtara, onwebeghi ihe ha kwuru banyere ya, mgbe BBC Igbo kpọrọ Sagir Musa bụ ọnụ na-ekwuru ha, ọ zaghị ekwentị ya.

Mana onyeisi ndịagha bụ Tukur Buratai ekwusiela ike na ndịagha Naịjirịa na-arụ ọrụ ha ka ndị a zụrụ ọfụma.

Buratai kwuru nke a mgbe ndị kọmitii ụlọomeiwu nta na-ahụ maka ndịagha kpọtụrụrụrụ n'isiụlọọrụ ndịagha na Wenesde n'Abuja.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Otu onye a kpọrọ Adamu sị na ọ gaara agba CNN akwụkwọ n'ụlọikpe kama na ọ bụ maka na ha kwenyere na ha na-eche nyocha kọmitii goomentị hiwere pụta.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Remo Omokiri jụrụ na ọ kwa ndịagha ahụla nyocha ndị CNN mere?

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Tunde Ednut sị na ugbua ka CNN matara na gọọmentị Naịjirịa na-atụ asị.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5