Biafra: Akuko a siri imi n’ala ichoputa ebe aha a si pụta

Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chris Sanctus Okereke
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist

Biafra, aha malitere ịda ụda nnukwu n'ikpeazụ a.

Ya bụ aha diwara gboo dịka njirimara okeala niile dị n'ikpere mmiri oke osimiri Atlantic ebe ọ gafere mba ndị a: Naịjirịa, Kameroon, Ikwetoria Gini na Gabọn.

Ị gaa na mapụ Afrịka, i ga-ahụ na okeala ndị a gbagọrọ agbagọ, bata n'ime ala karịa ebe ndị ọzọ dị n'ugwu Afrịka.

Ọ bụ ya mere e jiri akpọ ebe ahụ niile "Bight of Baifra" bụ nke dị n'ime Gulf of Guinea.

Ndị ọkammụta sị na ya bụ "Bight of Biafra" malitere na "river Delta dị na Naịja, n'ugwu gbadaruo na Cape Loez dị na Gabọn.

Ha kwukwara na mapụ nke 1710 gosiri na ọ nwere ebe ana akpọ Biafra dị n'ime Kamaruun mgbe ahụ.

Nke a gosiri na ya bụ okwu bụ Biafra abụghị okwu Igbo, kama ọ bụ aha obosara ala dị n'akụkụ osimiri Atlantic nke gụnyere mba ndị a niile anyị gụpụtara na mbụ.

Ya bụ aha digidere ruo 1975 mgbe gọomentị Naịjirịa gụgharịrị ya bụ aha kpọwazịa ebe ahụ niile "Bight of Bonny".

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ka ha were ya wepụ aha Biafra na mapụ. Mana nke ahụ akụkọ ụbọchị ọzo.

Aha onyonyo, Biafra at 50: 'Enweghi ezinaụlọ Igbo ọbụla na-enweghi onye a tufuru n'ihi agha Biafra'

Keduzia ka Igbo siri zawazia Biafra?

N'ọnụ okwu ya, Mbazuruike Amechi bụ onye bụbu Minista njem ụgbọelu n'ọchịchị onyekwuo uche ya nke mbụ na Naịjirịa na 1962 ma bụkwara onye nwere ọnụokwu mgbe a nụrụ agha Bịafra kwuru na ya bụ

aha bụ Ojukwu na ndị otu ya wetere ya.

Mbazuruike sị na tupu ya bụ agha Biafra dapụta na Ojukwu bụ onye nọ n'isi ya bụ agha kpọchịrị ọtụtụ n'ime ha bụ ndị nwere agba n'Ọwụwa anyanwụ na nga mgbe ya na ndị otu ya zara aha ahụ.

O kwuru na "o bụ na okeala dị n'ikpere mmiri nke Atlantic ka ya bụ aha si pụta".

Aha onyonyo, Ihe ụmụ Igbo ama ama kwuru maka ịnweta Biafra

Ụfọdu ekweghị na ha bụ Biafra

Onye ọkammụta nke politikal Sayensi na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ọnweghị ihe dị njọ mmadụ ị sị na ya achọghị ịbụ Biafra maka na ọbụghị mmadụ niile kwenyere na ya.

Ọ sị na ihe butere nke a bụ agwa ndị mmadụ kpasara ibe ha mgbe agha.

Ọ sị na nke bụ eziokwu bụ na "Igbo dị n'ime Biafra otu ọtụtụ mba ndị ọzị sịkwa nọrọ n'ime okeala ahụ akpọrọ Biafra".

Onye ọzọ anyị jụkwara bụ ndị bu mwereonwe ndị Igbo n'isi na-achọghịkwa ka anyị kpọọ aha ya sị na onye senyere agbụrụ ndị ọzọ na-abụghị Igbo na mapụ Biafra emeghị ajọ ihe maka na ndị agburu ahụ nọ n'okeala akpọrọ Biafra "mana ọ dị mkpa ịjụ ndị ahụ ka ha ekwetere iso na Biafra dịka ụbọchị siri dowe ihe na anya".

O kwuru na ya bụ "nsogbu malitere tupu alụọ agha Biafra bụ mgbe gọọmentị Naịjirịa kebiri regọnụ ọwụwa anyanwụ ụzọ atọ iji mee ka ike ha daa".

Ọ sị na ya bụ nkewa butere ịkpaoke n'etiti agburu ndi nọ na ya bụ ogige akpọrọ Biafra.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, 'Ọkụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua na-amụnye ga-eregbu anyị niile' - Mbazulike