Kenya election 2022 results: Etu mpụtara ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Kenya si aga

Ebe foto si, AFP/Reuters
Ụmụafọ mba Kenya ebinyela aka iji họpụta onyeisiala ọhụrụ, ụlọomeiw, ndị Sịnetọ nakwa ndị Gọvanọ nke mba ha.
Ndị pụtara binya aka ebughi ibụ dịka naanị vootu a tụrụ bụ nde 12.1 n'ime vootu nde 21 a tụrụ anya e kwesịrị ịtụ.
Ụfọdụ n'ime ha hichara ụra n'ọdọ ebe a na-atụ vootu iji hụ na ha binyere aka.
Otu ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ kedụ a ga-akpọpụta onye meriri?
Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent Electoral and Boundary Commission (IEBC) bụ ndị nwere ikike ịkpọpụta onye meriri n'ọkwa Onyeisiala.
Nke a ga-abụ ma ha kpokọta, hazie, gụọ vootu si n'odo ebe niile a tụrụ vootu (polling unit).
Iwu ha kwuru na onyeisiala ụlọọrụ ga-akpọpụta onye meriri ma degara onyeisi ọkaikpe nakwa onyeisiala bụ Uhuru Kenyatta akwụkwọ.
Etu a ga-esi akpọpụta onye meriri?
Iji merie na ntuliaka ọkwa Onyeisiala agba nke mbụ, onye na-azọ ọkwa ga-enwete:
Vootu karịrị ọkara vootu niile a tụrụ na mba ha.

Opekatampe vootu pasentị 25% a tụrụ na mpaghara (counties) 24 dị na mba ahụ.
A ga-atụkwa vootu ịhọpụta ndị ụlọomeiwu, ndị sịnetọ, ndị gọvanọ, ndị omeiwu steeti nakwa ụmụnwaanyị 47 ga-ewere ọkwa n'ụlọomeiwu.
A ga-amalite ịgụkọ vootu ndị a ngwa ngwa a tụchara ma pịachie oge ibinye aka.
E mechiela ọdọ ebe ndị a na-atụ vootu na Kenya.
Mmadụ anọ na-azọ ọkwa ịbụ onyeisiala, dịka ndị na-atụ vootu ga-ahọpụtakwa ndị gọvanọ, ndị sịnetọ, ndị omeiwu nakwa ndị ụlọomeiwu si mpaghara dị iche iche.
BBC ji ozi si n'ọbaozi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent Electoral and Boundaries Commission (IEBC) egosipụta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala a.
Dịka ụlọọrụ a na-agbaso usoro nyocha, e nwereike inwe ihe igbu oge n'etu BBC si ewepụta ozi a.
Dịka iwu mba Kenya siri dị, ọ bụ ulọọrụ IEBC ga-akpọpụta mpụtara ikpeazụ nke ntuliaka ọkwa onyeisiala a.
Mpụtara ntuliaka ọkwa Onyeisiala si kwụrụ













