Kenya election 2022: Raila Odinga ajụla ịnabata mpụtara ntuliaka Onyeisiala mba Kenya

Ebe foto si, Reuters
Onye so na-azọ ọkwa onyeisiala mba Kenya bụ Raila Odinga ajụla ịnabata mpụtara ntuliaka ahụ nke ụlọọrụ Independent Electoral and Boundaries Commission (IEBC) kpọpụtara.
Odinga bụ onye gbara onye nke abụọ na ntuliaka ahụ kwuru nke a na mgbasaozi o mere na Nairobi.
Nke a bụ mbụ Odinga ga-apụta kwuo okwu kamgbe ụlọọrụ IEBC kpọpụtachara ntuliaka a.
“Mpụtara ndị a bụ adịgboroja na-abaghị uru nke a ga-ama aka n’ụlọikpe”
Ekelere m ndị nkwado m maka ịgbaso ụzọ udo, ana m asị ka ha gaa n’ihu na-eme nke a.
“Ajụla m mpụtara a kpam kpam”
Nke a na-abịa dịka ha na-ebo ebubo na e mere ntrụrụaka na ntuliaka ahụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị kọmishọna ntuliaka mmadụ anọ jụkwara mpụtara a

N’otu aka ahụ ndị kọmishọna ntuliaka mmadụ anọ jụrụ ịnabata mpụtara ntuliaka onyeisiala ha ma sị na onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka esoghi usoro kwesịrị ekwesị n’ịkpọpụta mpụtara ahụ.
Ha sị na mpụtara ntuliaka aka ahụ ekwesighi ntụkwasị obi, na e nyochaghị ha ọfụma.
Osote onyeisi ụlọọrụ a bụ Juliana Cherera sị na e kweghi ha nyochaa mpụtara ntuliaka ahụ kpọpụta ya.
O boro onyeisi ụlọọrụ ahụ ebubo na ọ gara n’ihu kpọpụta mpụtara ahụ ebe a hụbeghi vootu a tụrụ na mpaghara 20.
Ha sị na mgbakọ akara vootu ndị a tụrụ na ndị debanyere aha maka ịtụ vootu adabaghị nke ọma.
Etu William Ruto siri nweta mmeri na ntuliaka 2022 mba Kenya

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Onye bụbu osote onyeisiala Kenya bụ Willliam Ruto emerịela na ntuliaka ọkwa onyeisiala 2022 dịka ụlọọrụ ntuliaka Kenya bụ Independent Electoral and Boundaries Commission (IEBC) si kpọpụta n'ụbọchị Monde ụbọchị 15 nke ọnwa Ọgọstụ.
O ji pasentị vootu 50.49 wee merie. Raila Odinga nwetere vootu pasentị 48.85 ebe George Wajackoyah na David Mwaure nwtere nchịkọta vootu otu pasentị.
Ruto onye bụ osote onyeisiala mba Kenya ruo afọ 10 gara aga, zọrọ ọkwa dịka ‘onye na-anọghị n’ọchịchị’ ebe ozi ya gbadoro ụkwụ n’ikwudoro ndị na-enweghị ka ọ hara ha na mba ahụ ma jụụ ịkwụnyere ndị nwere agba dịka ndị ọchịchị nke ndị otu Kenyatta na Odinga.
Mgbasaozi achụmnta vootu Ruto kpalitere mmụọ ọtụtụ ndị nkwado ya nakwa ndị ntorobịa nke pụtara ihe etu e si kwudoro ya.
Otu ihe o mere tụrụ ọha n’anya ma kwanye ọkụ n’ikpalite aha ya na mmụọ ndị mmadụ bụ oge ọ jụrụ ikwudoro Onyeisiala Odinga nakwa Kenyatta n’iwu ọhụrụ ha chọrọ ịzịpụta nke e kwuru ghara imetụta akụnụba ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ.
Dịka iwu pụtara oge nsogbu na ahụhụ mmụbawanye ọrịa covid-19 n’ụwa kpalịtere, ọtụtụ kwudoro Ruto maka ịjị ịkwụnyere iwu ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ruto zịpụtara ozi maka mmeri ya ma kele ndị nkwado ya, ụmụ afọ Kenya na ụlọọrụ IEBC. O kwuru na obi dị ya mma maka etu usoro ntuliaka siri gaa. Praịm minista Ethopia bụ Aiby Ahmed ezịgarala Ruto ozi maka mmerị ya. Ahmed kwuru na ọ na atụ anya na ya na Ruto ga-arụkọ ọrụ.
Onyeisiala mba Zimbabwa bụ Emmerson Mnangagwa zipụtakwara ozi ekele nye Ruto maka mmeri ya. Mnangagwa kwuru na ụjọ anaghị atụ ya n'ihi na ọma na Ruto ga-achị ndị mba ya nakwa Afrịka n'ụzọ dị mma.
Onyeisiala Muhammadu Buhari zitekwara ozi ekele nye Ruto ma kwuo na ọ na-atụ anya na mba Kenya na Naịjirịa ga-arụkọ ọrụ nke ọma n'ọchịchị ya.
N'otu aka ahụ Najib Balala bụ minista njem nlere anya na mba ahụ abụrụla onye ọchịchị mbụ na-ezigara Ruto ozi ekele.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5

Ndị nkwado Ruto ji ọṅụ na obi ụtọ agba egwu n'isi ụlọọrụ pati William Ruto dị na Nairobi dịka akpọpụtachara aha ya dịka onye mmeri.
Etu nsogbu siri dapụta n'oge mkpọpụta aha onye mmeri na ntuliaka a

Ọgụ dara n'ọgbọ ebe a na-atụ anya mkpọpụta mpụtara ntuliaka e mere ọhụrụ na mba Kenya n'ehihe Mọnde. Mmadụ anọ n'ime asaa so na kọmitii na-eme ntuliaka ahụ jụrụ ịkwado mpụtara ya, ma na-ekwu na “kpuchi kpuchi” ka nkụ n’ime usoro ya nke ha na-enyo enyo ma jụụ ikwudoro.
Juliana Cherera bụ osote onyeisioche nke ụlọọrụ Independent Electoral and Boundaries Commission (IEBC) kwuru, "Anyị enweghị ike ị nweta nsonaazụ na mkpọpụta aha so mpụtara ntulika a n'ihi etu e siri mee kpuchi kpuchi n’agba ikpeazụ ngụkọ ntuliaka a”
Ọ gbakwụnyere, "Anyị ga-enye nkwupụta zuruoke n’oge adịghị anya... n anyị na-arịọ ndị Kenya ka ha nọrọ jụụ."
Cheta na otu onye nnọchiteanya pati Odinga ebobuola ebubo na e nwere na usoro ntuliaka ahụ ezịghị ezi.
Etu Raila Odinga na William Ruto si chụsoo onwe ha n'ike n’ọsọ ntuliaka Onyeisiala

Ebe foto si, Getty Images
Mpụtara ntuliaka ndị a gbarala n’anwụ na Kenya na-egosi na osote onyeisiala ha bụ William Ruto na Raila Odinga bụbu minista na-asọkọta ihe n’ịzọ ọkwa a.
Dịka 90% mpụtara ntuliaka si na mpaghara dị iche iche pụtarala ihe, ọ na-egosi na ọnụọgụgụ vootu na-ekewa ha abụọ dị obere.
Mana o nwereike ịdị etu a ruo ọtụtụ ụbọchị a ga-akpọpụta onye meriri kpọmkwem.
Pasentị ndị tụrụ vootu dị iri isi na anọ, nke dị obere na pasentị iri asatọ tụrụ vootu na ntuliaka afọ ise gara aga.
Mana onyeisi ụlọọrụ ntuliaka bụ Wafula Chebukati sị na ọnụọgụgụ nwereike ịrị elu ma a mata ọnụọgụgụ ndị na-ejighi eletrọnik tụọ vootu pụta.
Ntuliaka nwere ihe ọgbatauhie dịka ngwa ọrụ abịaghị n’oge nakwa ụfọdụ ha arụghị ọrụ n’ụfọdụ mpaghara.
Chebukati rụtụrụ aka na ọgbaghara dapụtara na ntuliaka a ebe otu onye omeiwu ji egbe gbagbuo otu n’ime ndị nchekwa onye na-ama ya aka.
Ugbua onye omeiwu ahụ na-agba ọsọ ugbua, ọ sị na ndị uweojii ga-arụ ọrụ iwete ikpe ziri ezi.
Ndị Kenya na-eche mpụtara ntuliaka

Ebe foto si, AFP
Dịka a tụchara vootu ụnyahụ, ndị Kenya na-eche mpụtara ntuliaka Onyeisiala e mere ụbọchị Tuzde.
Ntuliaka ahụ nke gara n'udo, nwere nsogbu ebe ụfọdụ e nwere ndọghachi ahụ dịka e bidoghị n'oge nakwa nsogbu igwe e ji atụ vootu.
E mechiri atụmvootu mana atụmvootu ka na=-aga na mpaghara ebe ndị a maliteghị ịtụ vootu n'oge.
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka ekwubeghị mmadụ ole tụrụ vootu mana n'ihe dịka Elekere anọ nke ehihie ụbọchị Tuzde, ihe karịrị pasent 50 ndị debanyere aha ha maka atụmvootu atụọla.

Mba Kenya amalitela ntuliaka ọkwa onyeisiala taa bụ ụbọchị Tozde.
Ụfọdụ ụmụafọ mba ahụ malitere kwụwa n'ahịrị n'ọdọntaa vootu n'abalị foro taa n'isi obodo Kenya bụ Nairobi.
Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe ahụ bụ Anne Soy kwuru na en'ụzọ ụtụtụ n'a ahịrị ndị chọọ ịtụ vootu eruola mita 200 n'isi ụtụ.
Ụfọdụ gwara ya na ha bịara n'ebe Elekere itoolu nke abalị.
Otu nwaanyị na-ere mgbụrụosisi bụ Margaret Mwangi,dị afọ 59, kọwara nna ya kpebiri na ya agaghị ala n'ụllọ ya n'abalị iji nweta ohere ịtụ vootu yua ọsọọsọ.
Ya bụ nwaanyị bụ onye nke abụọ n'ahịrị kwuru na na-aele anya ya tụcha vootu, ya ala n'ụlọ ya na-esozi ihe na-eme n'ihe onyonyo TV.
Ihe niile i kwesịrị ịma maka ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na mba Kenya ga-eme n'ụbọchị Ọgọst 9

Ebe foto si, AFP
Ndị mba Kenya ga-eme ntuliaka iji họpụta onyeisiala mba ha n’ụbọchị itolu nke ọnwa Ọgụst a.
Dịka ha na-akwado ka nyocha sitere n’aụjụ ajụrụ ndị mba ahụ na-egosi na ọ bụ Ralla Odinga na osote onyeisiala mba ahụ ụgbua bụ William Ruto bụ isi sekpụ ntị na ya bụ ntuliaka.
N’otu aka ahụ ka onyeisiala mba ahụ ugbua bụ Uhuru Kenyatta na-akwado Odinga ma katọọ Ruto.
Ka ha na-akwado, ụfọdụ echefubeghị ọgbaaghara dapụtara na ntuliaka nke afọ 2007 nke tara isi mmadụ 1,200.
Cheta na ndị obodo Kikuyu bụ ebe Kenyatta si ahopụtala ndị isiala atọ n’ime anọ kemgbe afọ 1963.
Lee ndị na-azọ ọkwa onyeisiala nke afọ 2022

Ebe foto si, AFP/Reuters
William Ruto
Wlliam Ruto dị afọ 55 bụ onyeisi otu Pati Kenya Kwanza Alliance.
Ọ rụbụrụ ọrụ dịka onye omeiwu, Mịnịsta ọrụ ugbo ma bụrụ osote onyeisiala ugbua.
A kpụpụrụ Ruto ụlọikpe maka ebubo imegide ikike dịịrị onwe n’ụlọikpe International Criminal Court nke metụtara ọgbaaghara mere oge ntuliaka 2007.
A kụpụrụ ya bụ Ikpe ma Ruto sị kwa na aka ya dị ọcha.
Ruto na Kenyatta meriri Odinga na ntuliaka nke afọ 2013 na nke 2017.
O na-ekwe nkwa na ọ ga-akwalite ego ndị ọrụ ubi na ụlọọrụ ndị nọọrọ onwe ha ma kwalite kwa ọnọdụ ahụike mba ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Raila Odinga
Raila Odinga bụ onye otu pati Azimio La Umoja nke otu pati Kenyatta bụ Jubilee nọ n’ime ya.Odinga bụ nwa onye mbụ bụ osote onyeisiala mba Kenya ebe Kenyatta bụ nwa onyeisiala mbụ mba ahụ.
Odinga, onye nọbụ na nga maka ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwu na ntuliaka atọ emerela na mba ahụ bụ ya kwesịrị ịnwe mmeri.
Odinga na-ekwe nkwa na ọ ga-enye ndị enweghị ọrụ ego mgbado ume, nye mmadụ niile ahụike, kwalite agụmakwụkwọ ma chụọ mpụ na nrụrụaka ọsọ ụkwụ eru ala.

Ebe foto si, AFP
George Wajackoyah
George Wajackoyah na-ahụ onwe ya dịka ọkaiwu, ọkaibe n’akwụkwọ na onye na-enyopu ala.
Ọ bụ ọkọlọtọ nke Roots Party ka o ji azọ ọkwa onyeisiala mba Kenya.
Ọ na-ekwe nkwa ịkọpụta Igbo maka iji ya mepụta ihe na ọgwụ ahụike, ọ kwekwara nkwa iji mkpụrụ amụ Hayina na nsị agwọ gbaa mgbere mba na mba ma belata ụgwọ Kenya ji n’ofesi.
Wajackoyah kwukwara na ọ ga-akwụ onye ọbụla ejidere na-eme nrụrụaka ụdọ.

Ebe foto si, GEORGE WAJACKOYAH
David Mwaure Waihiga
Waihiga bụ onye ọkaiwu ji ọkọlọtọ otu Agano azọ ọkwa onyeisiala mba Kenya.
O kwuru na ọ ga-alụso nrụrụaka ọgụ ma wepụta ihe niile gọọmentị ji ego eme ka mmadụ niile hụ.










