Lee ka akwamozu aka chibụrụ Kenya bụ Mwai Kibaki si aga

Akwamozu aka chịbụrụ Kenya na-aga n'ihu n'ama egwuregwu Nyayo dị na isiobodo Kenya bụ Nairobi.

Gọọmentị mba Kenya na-eme emume akwamozu aka chibụrụ Kenya bụ Mwai Kibaki ,onye lara mmụọ n'otu izu gara aga taa bụ Fraịde (29/4/22).

Kibaki nwụrụ ka ọ dị afọ iri itoolu.

Ozu ya hapụrụ ụlọ olili ozu n'ụtụtụ taa ma gawa obi gọọmentị dịka ụgbọala ndị agha so chiri ya bụ ndị na-eduzi usoro olili ozu ahụ.

Ọtụtụ ndị isi mba Afrịka nakwa mbaụwa ndị ọzọ ga-abịa emume a, nke gụnyere Cyril Ramaphosa nke South Africa, Salva Kiir nke South Sudan na Sahle-Work Zewde nke Etiopia ndị kwupụtarala nkwenye ha na ha ga-abịa.

A na-eme mmemme a n'ama egwuregwu Nyayo dị na isiobodo Kenya bụ Nairobi. Emechiela nnukwu okporoụzọ dị Nairobi iji mee ka ọ dịrị ndị na-abịa ya bụ emume mfe ibanye ama egwuregwu ahụ.

Ndị agha mba Kenya na-eme usoro ngagharị pụrụiche dịka ha na-aga n'eme mmemee a.

Ebe foto si, State House

Ndị agha mba Kenya na-eme usoro ngagharị pụrụiche dịka ha na-aga n'eme mmemme a.

Ndị mba Kenya nọ n'ahịrị ugbua maka ịkwanyere Mwai Kibaki ugwu ikpeazụ ha nke malitere kemgbe ụbọchị Mọnde, bụ ebe a na-ekiri ozu ya nke ikpeazụ n'obi gọọmentị nke ndị ụlọomeiwu dị na steeti.

Gọọmentị Kenya ekwuola na taa bụ Fraịde bụ ụbọchị ezumike nye ọha iji nye ha ohere iru uju nakwa inwe ike bịa ya bụ emume.

Ndị mba Kenya nọ n'iri uju dịka ha na-akwanyere Mwai Kibaki ugwu nke ikpeazụ ya taa

Ebe foto si, State House

Mba Tanzania bụ mba agbataobi Kenya ekwupụtala ụbọchị iru uju ụbọchị abụọ site na Fraịde iji kwado ndị Kenya.

Cheta na a dụrụ Kibaki iyi ọrụ dịka onyeisiala nke atọ na mba Kenya n'ebe ngwụcha afọ 2002, ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisiala ruo n'afọ 2013.

A ga-eli ya n'ụbọchị Satọde n'ụlọ ya dị na mpaghara etiti Kenya.

Mwai Kibaki

Ebe foto si, AFP

Onye bụ Mwai Kibaki

Mwai Kibaki bụbụ onyeisiala mba Kenya nwụrụ n'izu gara ka ọ gbachara afọ 90.

Onyeisiala mba ahụ bụ Uhuru Kenyatta bụ onye gbara ama nke a ụbọchị Fraide.

Kibaki bụ onye ndu mbụ na esighị n'otu 'Kenya African National Union (Kanu), bụ pati chierala afọ 40 kemgbe Nnwereonwe mba ahụ.

E ji iwulite akụna mba ahụ mara Kibaki onye chịrị Kenya malite n'afọ 2002 rue afọ 2013.

Mana mmeri o ji laghachi n'okwa site na ntuliaka afọ 2007 butere tigbuo-zogbuo nke tara isi mmadụ 1200.

Kenyeta kwuru sị, "Mwai Kibaki bụ onye a ndị ala anyị a hụrụ n' anya ma na-akwanyere ugwu."

"Ọ bu ụzọ n'ịhụ na pati nọ n'ọchichị kwụ n'ụkwụ ha site na ịcha ha ọkụ."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: