Ụmụnwoke na ụmụnwaanyị, ole ndị ka agba n’ezi? Lee ihe ndị ọkachamara kwuru

Ebe foto si, Iwaria/Emmanuel
Ndọrịntaụka dị iche iche adapụtala n’okwu ịgba n’ezi na nso nso a, ọkachasị dịka kepukepụ pụtara na otu onye otiegwu Naịjirịa a ma ama gbara n’ezi ma tuba otu nwaada ime n'agbanyeghị na ọ lụọla nwunye.
Na soshal midia, ọtụtụ malitere ikwu na ọ bụ ụmụnwoke kacha agba n’ezi n’alụmadinanwunye maọbụ n’etiti enyi na enyi.
Ụfọdụ ndị na-eme ndọrịtaụka a na-ekwu na ụmụnwoke ka ụmụnwaanyị enwe agụụ aramara dịka chi si kee ha. Mana nke a, abụ eziokwu?
Otu dọkịta akparamagwa aha ya bụ Leonard Okonkwo gwara BBC Igbo na enweghi nnyocha sanyesị ọbụla ọ ma maka ya nke kwuru na ụmụnwoke ka enwee agụụ ịme aramara, kama ọ bụ etu e siri zụọ mmadụ maọbụ ihe na-eme na ndụ ya nakwa na gburugburu ya nwereike ikpalite oke agụụ ime aramama.
O kwuru: “Etu e si zụọ ọtụtụ ụmunwoke bụ ka ha bụrụ ndị na-agbapụ achọta maọbụ chụta nta ihe ọbụla na-agụ ha.”
“Ụmụnwoke bụ ndị na-aka ebu ịnụ ọkụ n’obi n’akparamagwa ha mana nke a apụtaghị na agụụ aramara n’aka n’ime ụmụnwoke niile nọ n’ụwa”.
Dọkịnta Okonkwo gwara BBC Igbo na n’uche ya, etu e si azụ ụmụnwaanyị n’usoro omenala dị iche iche bụ ka ha “nọrọ juu ma ghara ịchụso ihe na-agụ ha”, o kwukwara na ihe ọzọ na-eme ụmụnwaanyị anaghi esonyekarị n’aramara aghara aghara bụ na "ọ bụ ha ka ibu arụ na-eso mmekọahụ na-adakwasị karịa”.
Ọ gụpụtara ibu ndị a dịka “afọ ime, ihere mmetọ aha, ibute ọrịa aramara aghara aghara” na ndị ọzọ.
Ọ kọwara na ụmụ ihe ndị a na-eme ụmụnwaanyị ji ebelata aka n’ime aramara karịa ụmụ nwoke.
Dọkịnta ọzọ aha ya bụ Francis Ezenwankwo, onye bụ ọkachamara n'ahụike ụmụnwaanyị, kwetara na enweghi nnyocha sanyesi ọ ma nke kwuru na ụmụnwoke ka ụmụnwaanyị agba n’ezi.
Mana ọ kọwara na dịka ahụ nakwa okike ụmụnwoke si dị, inwe agụụ aramara nwereike ịka dị elu n’ebe ụmụnwoke nọ karịa ụmụnwaanyị.
O kwuru na nke a pụtakwara ihe ma a tụlee akparamagwa ụmụanụmanụ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Getty Images
Dkt Ezenwankwo kwuru na "enwere ihe a na-akpọ 'testosterone’ n’ahụ mmadụ, ọ na-aka n’ahụ ụmụnwoke mana ọ dịkwa obere n’ahụ ụmụnwaanyị. Ọ bụ ihe a na-eme ka agụụ inwe mmekọ dị n'ahụ mmadụ”.
O kwuru na n’ihi etu 'testosterone' siri dị elu n’ahụ ụmụnwoke, e nwereike ịsị na agụụ inwe mmekọ ga-aka n’ahụ ụmụnwoke.
O kwukwara na etu ahụ ụmụnwaayị dị bụ na ịnwe agụụ ime aramara na-eso usoro ịhụ nso ha, ma kọwaa na ya bụ agụụ na-arị oke elu n’ahụ ụmụnwaanyị n’oge mmụpụta akwa n'ahụ nwaanyị (ovulation).
"Nke a mere ọ bụghị oge niile ka agụụ inwe mmekọ ji adị ụmụnwaanyị n’ahụ etu o siri dị n’ahụ ụmụnwoke, bụ ndị na-anaghị eyipụta akwa ọbụla," Dkt Ezenwankwọ kọwara.
Mana gbasara mmadụ ịgba n'ezi, Ezenwankwo kwuru na "ihe dị etu na-abụ ihe dịịrị onye maka na ọ dịghi etu a n’ahụ mmadụ niile ma ụmụnwoke ma ụmụnwaanyị.
"N’uche m, okwu ịgba n’ezi bụ ihe dịrị onye nakwa mkpebi mmadụ ji aka ya mee,” ka o kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N'okwu nke ya, Elizabeth Akunyili, onye ọkachamara n'okwu gbasara mmekọ ahụ kwuru na "ime nnyocha banyere ịgba n’ezi ga-esi ike n’ihi na okwu aramara maọbụ mmadụ ịgba onwe ya n’anwụ abụghị ihe dị mfe ịjụpụta ndị mmadụ n’ụzọ dị mfe ọkachasị n’ụzọ nnyocha sanyesị".
Akunyili kwuru na site n’ọrụ ya dịka onye na-enye ndị na-eme enyi nakwa ndị di na nwunye ndụmọdụ, ọ chọpụtala na etu omenala dị nakwa etu ọha siri dị “a na-aka anabata ụmụnwoke ịgba n’ezi nke mere ha jiri agba ya n’anwụ etu o siri sọ ha karịa etu o siri bụrụ ihe ‘arụ’ ma ụmụnwaanyị mee ya”.
O kwukwara na etu ọtụtụ akụkọ si apụta ugbua gbasara ‘nghọgbụ n’okwu nna nwe nwa’ nke Bekee na-akpọ ‘Paternity fraud’, o nwereike ịbụ ihe nrụtụaka na ọtụtụ ụmụnwaanyị na-agba n’ezi mana na ha na-ezo ya ezo maka etu omenala siri dị.
Otu nnyocha sanyesị maka akparamagwa na-ekwu na ma ụmụnwoke, ma ụmụnwaanyị na-agba n’ezi na nhatanha.
Mana ndị ọkachamara na ngalaba a na-ekwu na ọ ga-ara ahụ ịchọpụta nke a kpọmkwem n’ihi na ịgba n’ezi, nakwa ịme aramara abụchaghị ihe ndị mmadụ ga-apụta gbaa n’anwụ ka ọha mara.
Ọzọkwa bụ na ihe ndị mmadụ na-ahụ dịka ịgba n'ezi na-agbanwe. Ụfọdụ na-ahụta mkparịtaụka miri emi n'etiti mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye maọbụ enyi, dịka ịgba n'ezi.
Okwu ndị a ka bụ ihe ndị ọrụ sanyesị nke akparamagwa ka na-etinye anya, nke bụ na mpụtara doro anya so nnyocha ndị a agbabeghi n'ọha.
Mana na mpaghara ụfọdụ na Naịjirịa, dịka na mpaghara Ugwu, iwu machiri nwoke lụrụ nwaanyị maọbụ nwaanyị lụrụ di inwe aramara ha na onye ọzọ na-abụghị nwunye maọbụ di ha.
Onye a mara ikpe maka ịgba n'ezi nwere ike ịga mkpọrọ afọ abụọ maọbụ kwụọ nha ọbụla ụlọikpe ga-enye ya.









