Sexual Abstinence: Lee ihe ga-eme ahụ gị ma ị hapụ ime aramara oge tere aka

Ebe foto si, Getty Images
N'agbanyeghị na ọ dịka aramara o juru ebe niile ugbua, e nwere ụfọdụ ndị kpebiri na ha agaghị eme aramara.
Ọtụtụ ndị bụkwa ndị anaghị enwe mmasị ime aramara kwadaa, n'ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ.
Nnyocha sayensi gosiri na e nwere ọtụtụ uru dị na nwoke mọbụ nwaanyị ị na-eme aramara kwa mgbe kwa mgbe.
Mana ọtụtụ na-ajụ ma onwere ihe ọghọm maọbụ mperi nye ahụike mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ anaghị eme aramara chaachaa, maọbụ ọ naghị eme ya kwadaa?
BBC Igbo kpọtụụrụ Dibia bekee aha ya bụ Udodi Okoli, onye gbalịrị ịza ajụjụ a.
Emeghi aramara anaghị emetụta ahụike mmadụ

Ebe foto si, Nonniz Photography
Dọkịnta Okoli, onye na-arụ ọrụ n'Akwa Ibom, kwuru na "ọ bụrụ na mmadụ sị na ọchọghị inwe mmekọ nwoke na nwaanyị, nnyocha sanyesi ekwughị ihe ọbụla banyere ọghọm ahụike so mkpebi a."
Ọ sị; "Ọ bụrụ na mmadụ jiri anya ọcha hapụ ime aramara nke na-abụghị na mmanye, ahụike onye ahụ ga-akwụ chim".
O kwuru sị naanị ihe sayensi kwuru maka nke a bụ mmetụta ahụike ụbụrụ nke Bekee kpọrọ "Mental Health"
"Aramama na-enyere ụfọdụ ndị mmadụ aka ibelata ahụ mgbakasị nke bekee na-akpọ 'stress'", Dr Okoli kwuru.
N'otu aka ahụ, Malik Haruna King bụ dọkịnta ma bụrụkwa ọkachamara n'aramara, gwara BBC Igbo na enweghị ihe pụrụiche na-eme nwaanyị ma o tee aka tupu ọ nwee aramara.
King kọwara sị, "Ị lee anya, e nwereike igbochi ahụ mmadụ ịrụ ọrụ aramara ma enweghị ihe ga-eme onye ahụ, mana e gbochie mmadụ iri nri maọbụ ịga mposi, onye ahụ agaghị adị ndụ".
O kwukwara na nwaanyị ọbụla na-emeghị aramara oge tere aka ga-ebi ndụ ya etu ndị na-eme aramara ga-esi ebikwa.
E nwere ike iji maka anaghị enwe aramara kọọ mmadụ ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwa okorobịa aha ya bụ Robert gwara BBC na ụfọdụ ndị enyi ya na-akọ ya ọnụ n'ihi na ọ naghị enwe aramara kwadaa.
Robert sị na ya na nwaanyị enwebeghị mmekọ aramara kamgbe afọ 2018
"Ndị mmadụ menyere m ihere maka mkpebi ịwepụ aka n'aramara. Ụfọdụ na-eche na m bụ nwoke na-achọ ime mmekọ nwoke na nwoke," Robert kwuru.
Okwu a ndị mmadụ na-agwa ya metụtara ọnọdụ ahụike ụbụrụ ya.
N'afọ 2017, nwaada ọkpaọchị a ma ama na Naijịrịa dịka Chigul, kwuru na ya na nwoke ọbụla enweghị mmekọ ruo oge ọ lụrụ dị.
Chigul kwuru nke a na mkparịtaụka ya na onye ntaakụkọ Kemi Adetiba nwere n'afọ 2017.
"Alụrụ m di mgbe m dị afọ 33, amaghi nwoke ọbụla tupu m alụọ di"
Ọ kọwara na mkpebi ahụ na-akpa ya obiọma, ma bụrụkwa nke enweghị ọghọm ọbụla nye ya.
Emeghị aramara anaghị ebutere nwoke ọrị 'prostate cancer'

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ na-eche na nwoke anaghị enwe aramara kwa mgbe kwa mgbe nwere ike inwe ọrịa 'prostate cancer', mana dọkịta Okoli kwuru na nke a abụchaghị eziokwu.
Okoli kwuru na ọ bụ eziokwu na nnyocha sayensi gosiri na nwoke na-anaghị ewepụ uhe ya (sperm) kwa mgbe kwa mgbe site n'ụzọ aramara maọbụ ịgbọ ncha, nwereike ibute ọrịa 'Prostate Cancer'.
"Prostrate" bụ akụkụ ahụ nwoke na-emepụta uhe.
Mana Okoli gara n'ihu kọwaa na ụfọdụ oge, ahụ nwoke na-eji aka ya gbapụ uhe kariri akari n'ime ahụ onye ahụ site na nrọ nke a na-akpọ "wet dream" na bekee.
N'aka nke ụmụ nwaanyị, otu mperi dị n'ịnọte aka tupu emee aramara bụ na aramara ahụ nwere ike ịfụ ya ụfụ.
Ihe jikọrọ aramara na nsọ nwaanyị igbu ya mgbu

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwa agbọghọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọọrọ BBC na enwere mgbe enweghị aramara mekpara ya ahụ.
O kwuru sị, "Dọkịnta abụọ m hụrụ gwara m na ọ bụ maka anaghị eme aramara ka nsọ m ji afụ m ụfụ".
O kwukwara na ndị dọkịnta ahụ gwara ya na enweghị aramara nwereike ibute ogbeke (Fibroid) n'akpa nwa ya.
"Ndị dọkịta a gwara m na ọ bụrụ na m lụọ di, mgbu ịhụ nsọ m ga-akwụsị ma m malite inwe mmekọahụ mgbe niile," nwaanyị a kwuru.
Mana ọ sị na kamgbe ọ lụrụ dị, "enweghị 'fibroid' dị n'akpa nwa m, onweghịkwanụ nnukwu mgbanwe ọ chọpụtara n'ahụ ya."












