Polyamory Relationship: O nwere uru ọ bara mmadụ inwe ọtụtụ ndị ya na ya na-enwe mmekọ?

Polyamory

Ebe foto si, Getty Images

Anyị na-ahụkarị ime enyị maọbụ mmekọrịta dị ka nkwenye pụrụiche n'etiti naani mmadụ abụọ.

Mana nke a abụrụla ihe ọtụtụ na-enyochazi na agbụrụ ọhụrụ anyị a, dịka ndị mmadụ na-achọta ụzọ ndị ọzọ isi kọwaa ịhụnanya nakwa ime enyị.

Na mgbe gboo, inwe ọtụtụ nwụnye maọbụ ndị iko abụghị nsogbu ọbụla, mana ugbua ọ dịka alụmdịnanwunye naani otu nwoke na otu nwaanyị na-ebutezi ọtụtụ okwu.

Nke a mere ndị mmadụ jizi ajụ ma ọ ga-aka mma ịlaghachi na ntọnala anyị na-abụghị nke otu nwoke lụọ naani otu nwaanyị?

dị imeenyi maọbụ mmekorịta ndị mmadụ na-achọzi ugbua?

Di na nwunye

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọkachamara kwuru na ịlụ otu di nakwa otu nwunye adịkarịghị n'oge gboo karịa etu ọ dị ugbua

Justin Lehmiller, onye bụ ọkammụta n'akparamagwa mmadụ na mba Amerịka, kwuru na ya mere nnyocha banyere nke a.

N'ime nnyocha ahụ, ọ jụrụ ihe ruru mmadụ puku anọ ihe kacha agụ ha ma a bịa na mmekọ.

Nnyocha ahụ gosiri na ọtụtụ ndị mmadụ chọrọ ka ha na onye nke ha na otu onye ọzọ nwekọọ mmekọ ọnụ.

Lehmiller kwuru sị: "N'agbanyeghị na ịlụ otu nwụnye bụ ihe na-ewu ugbua, ụmụ mmadụ na-achọsi ike ka ha na ndị ọzọ na-abụghị ndị nke ha na-enwe mmekọ."

Nnyocha a Lehmiller mere gosiri na ọ bụ ụmụ nwoke kacha enwe ụdị echiche a banyere aramara nke bụ na o ruru pasentị 26 n'ụmụ nwoke ma pasentị asatọ n'ebe ụmụ nwaanyị nọ.

Ndị ọkammụta gbasara akparamagwa mmadụ na-ekwu na ha chọpụtara na atụmatụ mmadu inwe naanị otu onye ya na ya na-enwe mmekọ adịghịzi etu ọ dị n'oge mbụ.

Ha kwuru na ọ bụ site na mgbasaozi nakwa ihe onyonyo na-efeghari ka ndi mmadụ kacha si na ya amụta agwa a.

N'agbanyeghị nke a, nnyocha gosiri na ndị mmadụ anaghị enwe naanị otu onye ha na ya na-enwe mmekọrịta.

Ọ dịkwa otu a ma n'ime akwụkwọ agba ochie nke akwụkwọ nsọ Baịbụlụ.

Kedụ ụfọdụ uru dị na mmadụ inwe ọtụtụ ndị ya na ya na-enwe mmekọ?

Mmadụ atọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Isiokwu nnyocha a bụ mmadụ ime ka onye nke ya mara ihe na-agụ ya gbasara aramara, ma nata efe n'aka ha tupu ha emee ihe ahụ na-agụ ha.
  • Afo ojuju: Ọkammụta Amy Muise, bụ ọkachamara gbasara akparamagwa mmadụ nakwa aramara kwuru na "ndị nwere ọtụtụ ndị ha na ha na-enwe mmekọ na a ka enwe afo ojuju na ndụ." Ya bụ na ọ dị ka mmadụ inwe ọtụtụ ihe na-enye ya obi ọma karịa naanị otu.
  • Ọ na-ewulite mkparịtaụka: Samantha Joel bụ osote ọkammụta na mmekọrịta mmadụ na ibe ya na mahadum Western University na mba Canada kwuru nke a.Ọ sị na ya bụ mmekọ ga-enyere onye ahụ aka ka ya na ndị niile ya na ya na-enwe mmekọ na-enwe ezi mkparịtaụka kwa mgbe kwa mgbe.
  • na-ewulite mmesapụ ahụ na egwuregwu: Ọkamụta Rhonda Balzarini nke mahadum York University kwuru na mgbe mmadụ na naani otu onye na-enwe mmekọ ọ na adị ka mmadụ i na-eri nani otu ofe, nke pụtara na ọ ga-adịzị ka ịgba otu ebe gburugburu.Balzarini kọwara na ihe ọhụrụ na aka enye obi ọma karịa ihe ọchịe ndị Igbo si kwuo, 'akwa ọhụrụ na-akpa mamiri'.
  • Ọ na-akwalịte mmadụ i nwere onye nke ya obi ọma: Ọkammụta Amy Muise kwuru na o nwere ụdị obi ụtọ mmadụ na-enweta ma ha hụ na onye nke ha nwere afọ ojuju, ya bụ ihe ka a na-akpọ 'Compersion' na Bekee.
Nwaanyị nwere ụmụ nwoke abụọ ya na ha na-emekọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụghị naanị ụmụ nwoke ka ọ na-amasị inwe karịa otu onye ha na ha na-enwe mmekọ

Marakwa na nnyocha a akwadoghi mmadụ i na-agba n'ịrọ, mana isiokwu ya bụ mmadụ ime ka ndị nke ya mara ihe na-agụ ha ma nata efe n'aka ha tupu ha emee ihe ahụ na-agụ ha.

Udi ime enyi a bụ nke Bekee na-akpọ "Consensual non-monogamy (CNM)".

Na nchịkọta ndị mere nnyocha a kwuru na ọ ka mma mmadụ ịgwa onwe ya eziokwu mara udi ime enyi maọbụ mmekọrịta kaara ya mma ma hapụ iso nke ndị ụwa tụnyere ya aka.

Amy Moors, bụ ọkamụta akparamagwa na mahadum Chapman University, kwuru na ọ bụ ihe ịtụnanya na ndị mmadụ nwere ike inwe ọtụtụ enyi nkiti mana ọ naghị eju ha afọ, mana abịa na mmekọ alụmdịnanwụnye maọbụ mmekọ nwoke na nwaanyị, a chọọ ka otu onye zuoro mmadụ maọbụ ju ya afọ.