Erectile dysfunction treatment: Nwoke kwesịrị idina nwaanyị ugboro 21 kwa ọnwa

Utu nkuda

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dike ọ wụrụ onwe ya ala n'akwa?
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Editor, BBC Igbo

Ọtụtụ ụmụnwoke na-ebugharị nsogbu ọrịa nkụda utu (erectile dysfunction) nke mere na ọ naghị ekeli etu na mgbe o kwesiri.

Mana nsogbu kacha nke bụ na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị ekwupụta nsogbu ha n'ihi ihere.

Ụfọdụ ihe mere ụmụ nwoke anaghị achọ ịkpọ ya bụ okwu aha bụ maka na ha hụrụ utu (penis) ha ka njirimara ugwu nwoke maọbụ ihe nwoke jiri bụrụ nwoke.

Nke a mere ha jhi ahụ ọrịa utu dịka ihe na-egosi na ha etozughị etozu dịka nwoke.

Ọtụtụ ụmụnwoke chere na ikwupụta maka ọrịa utu nkụda ga-ewetara ha ihere na nleda ha anya, maọbụ bụrụ ihe e ji akọ ha ọnụ.

Ihe ọzọ bụkwa na ha na-eche na ugwu ha akpụọla n'ala, nke mere na ha anahịzị achọ ka ha na ndị ọdịnaobi ha nwee mmekọ.

Mgbe ụmụnwoke na ndị ọdịnaobi ha enweghị mmekọrịta ka ha kwesịrị, nke ahụ na-ebutekwa nsogbu dị icheiche n'etiti di na nwunye maọbụ ụmụnwoke na ụmụ nwaanyị na-eme enyi.

Nwoke na-agaghị atụwa nwaanyị ime

Gịnị bụ utu nkụda (erectile dysfunction)?

Nkụda utu

Ebe foto si, Getty Images

Ọrịa nkụda utu bụ amụ nwoke enweghị ike ịkụli ọtọ ruo ihe dịka nkeji iri na ise.

Ọrịa utu nkụda na-egosi onwe ya mgbe utu (penis) nwoke azaghị oku dike mgbe oge ruru. N'ihi na Igbo sị na mberede ka e ji ama dike.

Nnyocha gosiri na pasentị iri na ise (%15) n'ime ụmụ nwoke dị n'etiti afọ 18 na 35 nwere ọnọdụ nkụda utu; ebe ndị karịrị afọ 40 na-arịa ya bụ ọrịa karịrị pasentị 40.

Kedụ ka e si ama onye na-arịa utu nkụda?

Utu nkuda

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dike ọ wụrụ onwe ya ala n'akwa?

Ihe mbụ na-egosipụta na nwoke nwere ọrịa utu nkụda bụ mgbe utu ya ekelighị n'isi ụtụtụ, maọbụ mgbe utu ya anaghị akwụli ọtọ iji zuoro nwaanyị mgbe a na-enwe mmekọ.

Utu nkụda abụrụla ọtụtụ ụmụnwoke mmekpa ahụ, nwereike igbu mmụọ nwoke. Ajụjụ gị na-agụ edemede a ga-ajụ bụ kedụ ihe nwereike ibute ya bụ ọrịa utu nkụda a?

Kedụ ihe nwereike ibute ya bụ ọrịa utu nkụda a (erectile dysfunction)?

Dọkịnta Rasheed Abassi

Ebe foto si, Dọkịnta Rasheed Abassi

Nkọwa foto, Dkt Abaasi bụ nnukwu ọkachamara n'ihe gbasara ahụike ụmụ nwoke

Dọkịnta Rasheed Abassi, bụ dọkịnta ihe gbasara mmekọrịta doro anya na mba Amerịka.

O kwuru na ihe na-akpata ọrịa utu nkụda dị ọtụtụ. Ha gụnyere:

1. Testosterone

Amụ nwereike igbaji ka ọkpụkpụ

Ebe foto si, EPA

Nke a bụ akụrụngwa na-adị n'ahụ nwoke nke o ji enwe ike ịtụwa nwaanyị ime.

N'aka nke ọzọ, akụrụngwa na-adị n'ahụ nwaanyị na-enyere ya aka ịtụrụ ime ka a na-akpọ 'estrogen'.

Ọ bụrụ na akụrụngwa 'Testosterone' ezughị oke n'ahụ nwoke, ọ ga na-ewne utu nkụda.

Ise sịga nwere ike ibutere nwoke nkụda utu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ise sịga nwere ike ibutere nwoke ọrịa nkụda utu

Dịka nwaanyị na-agbagote n'afọ, mmepụta 'estrogen' n'ahụ ya ga na-ebelata, mana ọ dịghị otu a n'ahụ nwoke.

Naanị ọnọdụ ahụike dị aghaa nwere ike ime ka 'testosterone' gbadaa n'ahụ nwoke. Nka anaghị emetụta ya.

2. Mgbakasị ahụ maọbụ nchekasị (Stress)

Cucumber

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cucumber bụ ou nri na-enyere nwoke aka igbochi utu nkụda

Nke a so n'otu ihe kacha akpata amụ nwoke anaghị ekeli ekeli.

Ihe nwere ike ibute nchekasị dị ọtụtụ, dịka ụkọ ego, onye a chụrụ n'ọrụ, nsogbu ezinụlọ, dgz.

Mgbe mmadụ nọ n'ọnọdụ nchekasị, ọbara anaghị aga n'ahụ ya dị ka o kwesịrị, nke a na-emetụta nkeli amụ nwoke.

3. Ọrịa Ọbara mgbalielu na Diabetes

Ọbara Mgbalielu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụrụ na akara nke dị n'elu karịa 120, maọbụ akara nke dị n'ala karịa 90 oge niile, mara na i nwere ọbara mgbalielu.

Dọkịta Abassi kwuru na ọbara mgbalielu bụkwa ihe ọzọ na-ebutere nwoke utu nkụda.

O kwuru sị: "Oge ọ bụla i lere etu ọbara gị ha, ọ bụrụ na akara nke dị n'elu karịa 120, maọbụ akara nke dị n'ala karịa 90 oge niile, mara na i nwere ọbara mgbalielu.

"N'ebe ndị isi ojii nọ, ihe kacha akpata ọbara mgbalielu bụ nnu, maọbụ ihe nwere ọtụtụ akụrụngwa 'sodium' n'ime ha."

"Ọ bụrụ na i gaghị gwọọ ọbara mgbalielu, mara na amụ gị agaghị na-akwụ ọtọ etu o kwesịrị."

Gbasara diabetes, dkt Abassi kwuru na oke shuga n'ọbara mmadụ na-eme ka ọbara ghara ị na-erugharị etu o kwesịrị.

Cheta na ọ bụ ọbara ịbanye n'ime amụ nwoke na-eme ka o kelie.

Ọ bụrụ na ọbara anaghị erugharị nke ọma n'ahụ nwoke, gịnị ga-emezi ka amụ ya bilie?

N'otu okwu, zeere oke shuga na oke nnu.

4. Anaghị emegharị ahụ

Onye na-eme 'exercise'

Ebe foto si, Getty Images

Iji mee ka amụ nwoke na-aza oku oge niile, ọ dị mkpa ka nwoke na-eme 'exercise'.

Nke a ga-enye aka ka ọbara na-agazi agazi n'ahụ nwoke, nke ga-eme ka odogwu ya gbasie ike.

5. Anaghị arahụ ụra etu o kwesịrị

Igbunkọ

Ọ bụrụ na mmadụ anaghị arahụ ụra etu o kwesịrị ọ ga-eme ka ụbụrụ onye ahụ mepụta kemịkalụ a na-akpọ 'steroids'.

'Steroids' a bụ shuga nke nwere ike ime imetụta etu amụ nwoke si ekeli.

Mmadụ kwesịrị ị na-arahụ ụra ihe dịka awa isii ruo awa asatọ na-enweghị nsogbu ọbụla.

6. Aramara dị mma

Uwe Trọụza

Ebe foto si, Getty Images

"'Exercise' nke m na-agwa ndị mmadụ ka ha na-eme oge niile bụ aramara dị mma."

"Nnyocha egosila na ime aramara nke ọma na-ebulite ahụike nwoke," dọkịta Abassị kwuru.

Ọ dị mma ka nwoke na-ewepu 'sperm' n'ahụ ya ihe ruru ugboro 21 kwa ọnwa.

Nke a ga-enyekwara 'prostrate' ya aka gbochie ọrịa 'prostrate cancer' n'ọdịnihu.

7. Anaghị aṅụ ezigbo mmiri

Mmiri tap

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmiri 'tap'

Dkt Abassi kwuru sị: "Tupu afọ 2000, ọtụtụ ndị mmadụ na-aṅụ mmiri si n'aka gọọmentị nke nwere akụrụngwa dị icheiche na-edozi ahụ dịka 'flouride', 'calcium', na 'selenite'.

Akụrụngwa ndị a na-enye aka ewulite 'sperm' nwoke,

Mana ugbua, mmiri gọọmentị anaghị agbazi, ndị mmadụ anaghị enwetazi akụrụngwa ndị ahụ na mmiri.

8. Mmanya na-aba n'anya na ọgwụike

alcohol

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịṅụfe mmanye na-aba n'anya oke nwere ike ibute ọrịa utu nkụda

Ọtụtụ ụmụ nwoke na-ekwu na ọ bụ naanị oge ha ṅụrụ mmanya maọbụ ṅụọ ogwụ ike ka ha na-akpa ike n'elu nwaanyị.

Mana Dkt Abaasi kọwara na nke ahụ anaghị adịgide, kama ọ na-emebi ọtụtụ ihe n'ime ahụ.

9. Ịṅụ ọgwụ 'gbagagba' maọbụ 'ike agwụ nwa mkpi'

Ọgwụ mgbọrọgwụ
Nkọwa foto, Ọtụtụ na-ekwu na ọgwụ mgbọrọgwụ na-enye ha ike idina nwaanyị

Dkt Abaasi kwuru na ịṅụfe ọgwụ mgbọrọgwụ oke na-akpata ọtụtụ ọrịa dịka ọrịa akịrị, ọrịa umeji, na ndị ọzọ.

Nke a bụ maka na onweghị onye ma ole mmadụ nwere ike ịṅụ ka ọ ghara ịṅụfe oke.