Kwụsị ihe ndị a na-egbu 'Sperm' gị

- Onye dere ya, Chigozie Ohaka
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service
Igbo sị na ọ bụru na agwọ emeghi ihe o ji bụrụ agwọ, e were ya kee nkụ.
Igbo kwenyere na otu ihe e ji a mara nwoke bụ ị nwe ike ịtụwa nwaanyi ime.
Nke a mere na ọtụtụ na-eme ihe niile iji hụ na ha lụrụ nwanyị ma mụọ nwa.
Kama e nwere ọtụtụ ihe ụmụnwoke na-eme na-ebute spam ha ịgba ọnyụpa n'ime ihe o kwesiri ịme.
Gịnị bụ Uze?

Ebe foto si, Science Library
Uze bụ seelu sị n'ahụ nwoke nke nwereike ịtụwa nwaanyị ime.
Ọ bụ n'akpa amụ ka a ahụ nwoke si emepụta ya. Ọ bụ mkpụrụamụ nke bụ Testes na bekee na-emepụta uze.
Dịka e si gosi n'ihe onyonyio ndị BBC wepụtara, uze na-abanye n'ahụ nwaanyị mgbe ya na nwoke nwere mmekọ na-eru narị nde abụọ na iri ise.
Kama dịka etu aru nwaanyị si arụ ọrụ, ọ bụ nanị ihe dịka iri abụọ na-erute ebe akwa nwaanyị nọ.
Lee ihe ụmụ nwoke na-eme na ebute ọnwụ maọbụ ịgba ọnyụpa spam ha.
BBC Igbo na Dọkịnta bụ okaibe n'ihe gbasara nwoke ịtụwa nwaanyị ime bụ Uche Nwagha ebe ọ gwara anyị ụfọdụ ihe ụmunwoke na-eme na amaghị na ọ na-egbu uze ha.
Ịṅụ sịga ṅụfee ya oke.

Ebe foto si, GettyImages
Dokịnta Uche Nwagha kwuru na ịnụ sịga ṅụfee ya oke na-ebute ka ọnụ ọgụgụ uze ha pee mpe.
Akụkọ a anaghị akọwa na ịnụ sịga na-egbu spam nwoke, kama ịṅụfee sịga oke, nwereike imetụta ọ dịmma uze gị.
N'aka nke ọzọ, nyocha ndị mahadum nke Sheffield na mahadum Manchester mere nnyocha ma nke a ọ bụ eziokwu.
Ha kwuru na o nweghi ihe siri ike gosiri na ịnụ siga na-ebute ogbugbu spam, kama dọkịnta Allan Pacey kwuru sị, "Na-agbanyeghị nyocha anyị, ọ dị mkpa ka ụmụnwoke soro ndụmodụ ndị ọrụ ahụike ma hapu ịṅụfe Sịga oke".
Ọbante nke emepụtara na naịlọn wee dụọ maọbu ọbante jisiri akpa amụ ike

Ebe foto si, Getty Images
Dọkinta Nwagha kọwara na ụmụ nwoke iyi ịba eji nylon mee maọbụ nke kechisiri akpa amụ ike adịghị mma.
O kwuru na akpa amụ bụ ụlọ mkpụru amụ ebe na-emepụta spam ekwesịghị ị dị ọkụ.
Ekpe m ọkụ na spam adịghị na mma ma ncha.
Ịnya ụgbọala maọbụ gwongworo nke ijin ya dị n'okpuru oche ọkwọụgbọala

Ebe foto si, Getty Images
Dkt. Uche Nwagha kọwara na ndị na-anya ụgbọala dịka bọsụ na gwongworo na-enwekarị nsogbu uze (sperm) adịghị ike maọbụ ezughị ezu.
Ọ kọwara na nke a bụ maka na oche ha na anọ karị n'elu ịnjin ụgbọala maọbụ didebe ya nso.
Nwagha kọwara na ọkụ si na ijin ụgbọala a na uze anaghị adị na mma.
Nke a mere na mgbe ha nyara ya bụ ụgbọala gaa oglogo njem, ọ na-ebute nwoke adịghị ike ịtụwa nwaanyị ime.
Ebe mmadụ na-arụ ọrụ

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịnta Uche Nwagha kwukwara na ndị na-arụ ọrụ na ebe a na-arụputa Aluminim, Asbestos maọbụ ebe a na-ere ikuku gasị na-enwekarị nsogbu uze adịghiike ịtụwa nwaanyị ime.
O kwuru na gbe ihge ndịa banyere ha n'ahụ, ọ na ebute ọnọdụ nke na-emetụta uze nwoke.
Ụfọdụ ọgwụ ụmụnwoke na-aṅụ

Dkt Nwagha kọwara n'ụfọdụ ọgwụ dịka 'anti-fungal' na-ebelata ọnụ ọgụgụ ma ike uze nwoke.
O kwuru na ọ bụ nke a na-aṅụ aṅụ na-ebute nsogbu a.
Nsogbu ụwa

Mmadụ enweghị ezumike zuru oke nke na-ebutere mmadụ ike ọgwụgwọ na ezughị oke nke bụ stress na bekee.
Nwagha kọwara na homonu akpọrọ Luteinising hormone na bekee na-emepụta uze Tetestorone nke na-emepụta uze nwoke.
A na-emepụta homonu Lutenising, homonu a bụ n'ụbụrụisi ka ahụ mmadụ na-emepụta ya.
Nke a mere na streesi na-eme ka hormone ahụ hapụ imepụta tetestorone etu o kwesiri.
Ọrịa mmekọ nwoke na Nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images
Uche Nwagha kwuru na otu ihe ọzọ di ezigbo mkpa na ebute ọdachị uze nwoke bu ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị.
Ọ kọwara na ụfọdụ ọria ndị a anaghị egosi njirimara nke mere na mmadụ ga-enwe ya ma ọ maghị.
O kwuru na ọrịa ndi a na-awakpo mkpụrụ amu na ahụike amụ nke na ebutere uze nwoke mmadu ọdachị.
Kedụ ihe mmadụ ga-eme?

Dọkịnta Nwagha nyere ụfọdụ ndụmọdụ nke gụnyere mmadu iri nri akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi.
O kwukwara ka mmadụ nwee nanị otu onye ya na ya na-eme mmeko ma ọ bụghi ya ka onye ahụ gbochie onwe ya n'ụzo dịka iyi okpu nnabuehi.













