Allen Onyema: Onyeisi ụlọọrụ Air Peace kwuru na ọ bụghị eziokwu na Buhari kpọrọ ndị Igbo asị

Allen Onyema na Femi Gbajabiamila

Ebe foto si, Twitter/@Femi Gbaja

Nkọwa foto, Onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa bụ Femi Gbajabiamila kelere Allen Onyema maka aka ọ na-enyere Naịjirịa

"Buharị akpọghị ndị Igbo asị. Ọ chọrọ ka mpaghara Naịjirịa niile dị mma ma mepee emepe."

Nke a bụ okwu Allen Onyema, onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu a ma ama bụ Air Peace.

Onyema kwuru nke a oge ndị ntaakụkọ 'Anambra Broadcasting Service' gbara ya ajụjụ ọnụ n'obodo ya bụ Mbosi, n'okpuru ọchịchị Ihiala.

Ọ kọwara na ya bụ onye Igbo mana onyeisiala Muhammadu Buhari enyela ya na ụlọọrụ ya nkwado pụrụ nnukwu iche.

Onyema gara n'ihu kwuo na Buhari nyere ụlọọrụ ya ikike ịga ọtụtụ mba ofesi dị icheiche.

O kwuru sị: "A na m ekele Chukwu maka onyeisiala anyị bụ Muhammadu Buhari"

"Ọ bụghị eziokwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị."

Aha onyonyo, Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu

"Esoghi m n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla mana eritela m ọtụtụ uru na nkwado nke ọ na-enye ụlọọrụ ndị Naịjirịa nwe."

"Mana ọtụtụ mmadụ amaghị nke a. Ndị mmadụ na-ekweta ihe ọbụla ha gụtara n'akwụkwọ ntaakụkọ."

"Gọọmentị etiti nyere m ikike ifega mba ofesi dị icheiche nke ha na-enyetụbeghị onye ọzọ. Mana abụ m onye Igbo, onye Anambra.

"Amaghị m onye ọbụla, enweghi m nnaukwu (godfather) ọbụla."

Aha onyonyo, Ihe mere m ji kpọlata ndị Naịjirịa nọ Saụt Afrịka

"Site n'aka Mịnịsta njem ụgbọelu, onyeisiala Buhari nyere m ikike ifega mba Chaịna, London, Portugal, US, India na Europe niile."

"Abụghị m onye alakụba, mana onyeisiala nyere m ikike ịga obodo Jedda (dị na Saudi Arabia)."

"Gọọmentị enyela ụlọọrụ m ikike ịga ihe karịrị mba iri abụọ, mana abụ m onye Igbo. Kedụzi ihe ndị mmadụ ji ekwu na ọ kpọrọ ndị Igbo asị?"

Onyema kwuru na obi siri ya ike na Buhari ga-akwado ọdọụgbọelu ọhụrụ nke gọọmentị Anambra steeti na-arụ.

Allen Onyema, Femi Gbajabiamila, na Ndudi Elumelu

Ebe foto si, Twitter/FemiGbaja

Nkọwa foto, Allen Onyema, Onyeisi ụlọ omeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila, na onyeisi ndị pati PDP n'ụlọ omeiwu nta bụ Ndudi Elumelu

Cheta na ụlọọrụ Air Peace bụbu naanị na Naịjirịa ka ha na-efe, mana ugbu a ha na-efegazi ọtụtụ mba dị icheiche, nke Allen Onyema kwuru na ọ bụ site na nkwado onyeisiala Buhari

Oge ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ na mba South Africa n'ihi ọgbaaghara 'xenophobia', Onyema bupụtara ụgbọelu ya ka o bulata ha na-akwụghị ụgwọ ọbụla.

N'oge coronavirus a, ụgbọelu Air Peace ebulatakwala ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tọrọ atọ na mba ofesi dị icheiche.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Okwesilieze Nwodo: Ọ bụrụ na-enyeghi onye Igbo ọkwa onyeisi Naịjirịa, ihe ga-emebi