'Ọ bụ okwu mmekọ nwoke na nwoke n'etiti ndị ụkọchukwu butere esemokwu n'ụlọụka Anglịkan dị n'Ezinifite'

Aha onyonyo, Ihe mere eji chụọ ụkọchukwu ụlọụka Anglican n'Ezinifite - Aguata Dyosis
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka ọtụtụ mmadụ ka na-ajụ ihe kpatara ndị Ezinifite jiri gbachie ụlọụka Immanuel dị na be ha ụbọchị ụka, ọnụ na-ekwuru Dayosis Anglican nke Aguata agwala BBC ebe mmiri siri banye n'akụ oyibo.

Abụchị Nwozor sị na okwu ahụ malitere kemgbe afọ 2017 oge Dayosis ahụ mechara nnyocha were chụọ ụfọdụ ụkọchụkwu "makana ha na-edina nwoke ibe ha."

"Ihe meziri bụ na Ụkọchukwu na-ahụ maka Ezinifite, bụ Venerable Emma Ekejiuba, gara ebe a na-akwa ozu were kwuo na otu n'ime ndị a achụrụ enweghị ihe o mere were kpụọ ya ka o soro ya kpee ekpere."

Ọ sị na agwa Ụkọchukwu Ekejiuba kpara site ịkpọghachi onye achụrụ n'ọrụ ụkọchukwu ma kwuo na onweghi ih e o mere megidere iwu ndị Anglican na Naịjirịa.

Maazị Nwozor gakwara n'ihu kwuo na aka Bishop Aguata bụ Samuel Ezeofor adịghị n'ihe mere karịcha na ọ bụ ya nyere Ven Ekejiuba ezumike nwagbenta.

Ọ sị, dịka Bishop Ezeofor nụrụ ihe Ven Ekejiuba mere, ọ hibere kọmịtị maka nyocha ka a mata nke bụ eziokwu, mana ọ gọrọ. Ka emechara, a chọpụtara nọ ọ bụ eziokwu makana ihe o kwuru dị na "tape".

Ụlọụka Aglican

Ebe foto si, Fashola Nwa Ezinifite/Facebook

Maazị Nwofor gakwara n'ihu kwuo na ya bụ obodo adaala jii dịka ụfọdụ ndị so mee nsogbu ụbọchị ụka na abịa ịrịọ mgbaghara.

Ihe a Maazị Nwozor kwuru dabanyere n'ihe otu ụkọchukwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC n'ụbọchị Sọnde bụ ihe mere ndị ntoroọbịa Ezinifite ji were igodo gbachie ụlọụka Immanuel dị n'obodo ha.

BBC kpọrọ Ụkọchukwu Ekejiuba ka anụta ọnụ ya o were sị ka akpọghachi ya.

Mana oge eji kpọghachi ya, ekwentị ya anaghịzị aga.

Kedụ ihe mere e ji kwụsị Archdeacon a ọrụ?

Ụkọchukwu a sị na e nwere otu ụkọchukwu bụ nwafọ Ezinifite a chụrụ maka ebubo mmekọrịta nwoke na nwoke n'afọ ole na ole gara aga.

Onye Archdeacon a gara akwamozu ma hụụ ụkọchukwu a, sị ya kpee ekpere gọzịe nri n'akwamozu ahụ.

Mana iwu ndị ụka Anglican megidere onye ụkọchukwu a chụrụ achụ ịrụ ọrụ n'ụdị ọbụla, nke mere mgbe ozi ruru Bishọp ntị na ọ gbarụrụ ihu.

Ndị ụlọụka

Ebe foto si, Fashola Nwa Ezinifite

Bishọp gara n'ihu kwụsịtụ Archdeacon a ọrụ n'ihi agwa ọ kpara ma zigaa onye ọzọ n'Ezinifite ka ọ nọchite anya ya na nchere oge.

Ụfọdụ ndị ntoroọbịa Ezinifite anabataghị ya nke mere ha ji gbachie ụlọụka sị ka a kpọchịrị ha Archdeacon a kwụsịtụrụ ọrụ.

BBC Igbo kpọrọ Bishop Samuel Ezeofor n'ekwentị ka a mata etu eke si anya anwụ maka ọ zabeghi rute ugbua akụkọ na-apụta.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Cheta na ihe onyonyo na-efegharịnụ na soshal midia gosiri ka ndị ụlọụka Emmanuel Anglican Church Ezinifite dị n'Anambra steeti na-eme ngagharịiwe.

O gosiri ebe ọtụtụ mmadụ kwụ n'ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ na-ekwusike na ha achọghị ka archdeaconry ọhụrụ ewetere ha bata n'ụlọụka ha kama ka ewetere ha nke ochie ka pụchara tupu nke ọhụrụ a abata.

Nke a mere ka ha were akwụkwọ e dere "Uzọ anyị mechiri emechi" madocha n'ọnụ ụzọ ụlọụka ahụ ka aghara ịka ụka taa ebe ahụ.

Ndị ụlọụka

Ebe foto si, Fashola Nwa Ezinifite Facebook