'Igbo niile kwesiri ịpụta katọ ihe e mere ndị Ipob n'Emene' - Ọkaiwu Ipob

Aha onyonyo, 'Igbo niile kwesiri ịpụta katọ ihe e mere ndị Ipob n'Emene'- Ọkaiwu Ipob

Ọkaiwu Indigenous People of Biafra bụ Alloy Ejimako ekwuola hoo haa na o nweghị iwu ndị otu Ipob dara gbasara ọgbaghara dapụtara n'etiti ha na ndị uweojii.

Ọ gara n'ihu kwuo ka ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo manye ọnụ n'okwu a makana oke ogbugbu a na-egbu ndị Ipob akarịala.