Onitsha Port: Usoro ị ga-eji esi osimiri Onitsha ebubata ibu
Dịka onyeisi ngalaba National Inland Waterways Authority bụ George Moghalu kwuru na Onitsha adịla njikere ibubata ibu site na mmiri Onịcha, ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ kedu ihe ọ ga-ewe ha ibubata ibu site na mmiri Ọnịcha.
N'agbanyeghị na ọ bụ n'afọ 2021 ka ọdọụgbọmmiri a ga-ebido rụwa ọrụ, Moghalu kwuru na ha chọrọ ka o bido ọrụ tupu oge ha kwere na nkwa eruo.
Moghalu kwuru na ha esila ọdọ mmiri Onne dị na Rivas steeti buru ibu bata Onitsha ma burukwa ya laghachị Onne iji tulee ọdọụgbọmmiri Onitsha; ma ihe niile gara nke ọma.
Austin Okwaeze Nwosu bụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke ndị Association of Nigerian Licensed Customs Agent akọwala ihe o nwereike ifu onye chọrọ ibubata ibu site na mmiri Onịcha.
O ji ịtụbata ahụ ụgbọala nke bụ spare parts na bekee were maa atụ, Lee usoro ya ebe a :
1) Onye ahụ ga-aga ụlọakụ ya mepee 'Form M'.
2) Ọ bụ Form M a ka ọ ga-eji zụta ahịa
3) Ọ bụ form M a, Invoice na ihe ndị ọzo o jiri zụo ahịa ka a ga-eji mepee PAR
4) PAR bụ "Pre Assesment Release" bụ akwụkwọ na-egosi ahịa ole ọ zụrụ.
5) Akwụkwọ PAR a, ngalaba ndị gụnyere Customs,Mịnịstrị nke ego, SON, ndị Federal Inland Revenue dgz
6) Ị ga-enye onye ga-agbapụta ibu gị PAR na Bill of Lading nke ndi ebe ịzụru ahịa nyere gị.
7) Onye na-agbapụta ahịa ga-eji Bill of lAding wepụta ya n'aka ụgbọ bu ibu ma were PAR gwụọ ụgwọ nke ndị ngalaba Customs.
8) Mgbe ibu rutere ọdọ ụgbo mmiri dịka nke Onne, ị ga-akwụ Shipping charges, kwụo Terminal Charges.
9) onye ahụ ga-akwụ ụgwọ ụgbo mmiri a na-akpo Barge ga-ebubata ibu ya n'Onicha.
10) Mana onye ahụ nwereike ịkwụ ụgwọ Customs n'Onne maọbụ na nke Ọnịcha
11) O kwukwara na ndị nchekwa nke Customs ga-eso ya bụ ụgbo mmiri barge were gawa Onịcha.
Ego ole ka ọ ga-eri?
Dịka ego eji ebubata ihe dị iche iche, Nwosu kwuru na ego eji ebite ụgbọ mmiri Barge di ndala ọnụ.
Ọ mara tụ na isi na ọdọ mmiri nke dị na Apapa Legos buru kọntena buga ọdo ụgbo mmiri nke dị na kirikiri legọs ruruNaira narị puku abụo na iri ise.
O kwuru na o ga-adị mkpa ka etinye anya n'ụgwọ ndị barge na-ana.

Ebe foto si, Nigerian Ports Authority/Twitter
Kedụ uru ndị mmadụ ga-erite n'ọdọụgbọmmiri Ọnịcha?
Moghalu rụtụrụ aka n'ụfọdụ uru ọdọgbụmmiri a ga-aba nke gụnyere;
- Ibelata ego e ji azụ ahịa na ego a na-eme iji e si Legọs ebulata ngwaahịa n'Ọwụwanyanwụ.
- Ọ ga-ebute mmepe obodo.
- Ọ ga-emepe ọtụtụ ohere maka inwete ọrụ.
- Ọ ga-eme ka azụmaahịa dịrị ndị nọ na mpaghara ọwụwanyanwụ mfe.
Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa n'Ọịcha kọwara etu ọdọụgbọmmiri Ọnịcha a ga-esi baara ha uru.
Silas Odo bụ onye na-azụ ahịa akwa n'Ọnịcha kwuru na ya bụ ọdọụgbọmmiri ga-eme ka ibubata ahịa dịrị ha mfe.
Ọ sị na ka na-anụ ya dịka akụkọ na ọ bu mgbe o bidoro ịrụ ọrụ ka ha ga-ekwete.
Kedụ ebe ọdọụgbọmmiri Ọnịcha a dị kpọmkwem?
Ọdọụgbọmmiri a dị n'ebe a na-akpọ 'Ọgbọ osisi' dị n'Ọnịcha, Anambra Steetị n'akụkụ Akwammiri Naịja,

Onye na-achịkọta Onitsha River Port bụ Baba Spencer kwuru na ihe niile ọdọụgbọmmiri Onitsha ga-eji rụo ọrụ zuru ezu.
O kwuru sị "mgbe ọdọụgbọmmiri a bidoro ọrụ, ọ ga-ebelata ego e ji ebubata ibu na ndị mmadụ site n'Onitsha gawa ebe ndị ọzọ na Naịjirịa".
O kwuru sị "ọ bụ n'afọ 1983 mgbe Shehu Shagari nọ n'ọchịchị ka a rụrụ ọdọụgbomiri a, mana a hapụrụ ya ruo mgbe Goodluck Jonathan kpalitere nruzi ya site n'afọ 2012".
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:














